1 |
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Kraịst Jisọs na site nꞌaka nwanna anyị Timoti. Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Faịlimọn. |
2 |
Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nꞌụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipọs onye anyị na ya so na-alụ agha a. |
3 |
Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara ya na udo ya. |
4 |
Nwanna m Faịlimọn, ana m ekele Chineke ekele mgbe ọ bụ m na-echeta gị nꞌekpere nile m na-ekpe. |
5 |
Nꞌihi na oge nile ka m na-anụ ihe banyere otu i si hụ ụmụ Chineke nile nꞌanya, na ụdị okwukwe i nwere nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. |
6 |
Ekpere m na-ekpe nꞌihi gị bụ ka Chineke mee ka ndị ahụ nile naesite na ndụ gị na nꞌọnụ gị na-anụ ozi ọma ahụ bụrụ ndị ga-ekpebi iso Kraịst nꞌihi ihe ọma ha na-ahụ nꞌime gị nke na-esi nꞌebe Kraịst nọ abịa. |
7 |
Ịhụnanya gị na-enye mụ onwe ọṅụ nke nkasịobi, ezi nwanna m Faịlimọn, nꞌihi na e sitela nꞌobi ọma gị zụọ ọtụtụ ụmụ Chineke. |
8 |
Ugbu a, ọ dị ihe m chọrọ ka i meere m. Enwere m ike ịsị na ihe a bụ ihe ị na-aghaghị ime site nꞌaha Kraịst nꞌihi na ọ bụ ihe dị mma ime eme. Ma nꞌihi ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, achọghị ịkwagide gị ka i mee ya. |
9 |
Kama ọ kaara m mma ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Jisọs Kraịst na-arịọ gị arịrịọ a. |
10 |
Biko, arịrịọ m na-arịọ gị bụ nꞌisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m nꞌime Kraịst, onye m ritere nꞌuru nye Kraịst oge a m nọ nꞌụlọ mkpọrọ. |
11 |
Na mbụ, o nweghị uru ọ bụla Onisimọs baara gị, ma ugbu a, ọ bụ onye ga-abara gị uru na onye gaabakwara m uru. |
12 |
Ana m eme ka ọ laghachikwute gị. Ma mgbe ọ na-alọghachikwute gị achọrọ m ka ị mata na mkpụrụ obi m so ya na-alọta. |
13 |
Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nꞌebe a, ka ọ na-enyere m ụdị aka ị gaara enyere m nꞌime ụlọ mkpọrọ a m nọ nꞌihi ozi ọma. |
14 |
Ma otu ọ dị, ekpebiri m na ebe ọ bụ na ị maghị ihe ọ bụla banyere ya agaghị m ejide ya. Achọghị m ka i nyere m aka nꞌihi na a kwagidere gị, kama ọ dị mma ka o si gị nꞌobi pụta. |
15 |
Ma eleghị anya Onisimọs si nꞌụlọ gị gbapụ maka ịnọ nwa oge nta, ma ugbu a ọ na-alọghachi ka gị na ya nọọ ruo ebighị ebi. |
16 |
Ugbu a, ọ naghị alọghachi nanị dị ka ohu, kama ọ na-alọghachi dị ka onye karịrị ohu. Nꞌihi na ugbu a Onisimọs bụ nwanna anyị nꞌime Kraịst. Nꞌezie, Faịlimọn, Onisimọs dị m nꞌobi nke ukwuu. |
17 |
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ nꞌezie na ị gụrụ m dị ka enyi gị, nabata Onisimọs dị ka ị ga-esi nabata m. |
18 |
Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nꞌụzọ ọ bụla, ọ bụrụkwa na ọ dị ihe ọ bụla o zuru, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị. |
19 |
Aga m akwụghachi gị ya! Ka m jiri aka m dee ya nꞌebe a: mụ onwe m bụ Pọl ga-akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nꞌihi na ụgwọ i ji m bụ mkpụrụ obi gị nꞌonwe ya. |
20 |
Biko nwanna m, nꞌaha Onyenwe anyị, ana m arịọ gị ka i meere m nke a, ka obi m nwee izuike. Meere m ya dị ka nwanna m nꞌime Kraịst. |
21 |
Obi siri m ike na ị ga-emere m ihe m rịọrọ gị nꞌime akwụkwọ a, ọ bụladị mee karịa dị ka m rịọrọ. |
22 |
Were okwukwe kwadooro m ebe m ga-anọ nꞌihi na enwere m olileanya na Chineke ga-aza ekpere unu ime ka m si nꞌebe a pụta bịakwute unu. |
23 |
Epafras, onye mụ na ya nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Kraịst Jisọs na-ekele unu. |
24 |
Mak, na Aristakus, na Dimas, na Luuku, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu. |
25 |
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
FAILIMON 1:1 |
FAILIMON 1:2 |
FAILIMON 1:3 |
FAILIMON 1:4 |
FAILIMON 1:5 |
FAILIMON 1:6 |
FAILIMON 1:7 |
FAILIMON 1:8 |
FAILIMON 1:9 |
FAILIMON 1:10 |
FAILIMON 1:11 |
FAILIMON 1:12 |
FAILIMON 1:13 |
FAILIMON 1:14 |
FAILIMON 1:15 |
FAILIMON 1:16 |
FAILIMON 1:17 |
FAILIMON 1:18 |
FAILIMON 1:19 |
FAILIMON 1:20 |
FAILIMON 1:21 |
FAILIMON 1:22 |
FAILIMON 1:23 |
FAILIMON 1:24 |
FAILIMON 1:25 |
|
|
|
|
|
|
FAILIMON 1 / FAI 1 |