1 |
Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nꞌihu Chineke na nꞌihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe otu ụbọchị, mgbe ọ ga-abịa idozi alaeze ya, na-asị gị, |
2 |
kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ. |
3 |
Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ. |
4 |
Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi. |
5 |
Ma guzosie ike nọọ na nche mgbe nile. Atụla ụjọ ịhụ ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Rụzie ọrụ gị dị ka onye na-akpọtara Kraịst ndị mmadụ. Ahapụkwala ime ihe ọ bụla i kwesịrị ime. |
6 |
Ana m ekwu okwu ndị a nꞌihi na site na mgbe na-adịghị anya ugbu a agaghị m anọkwa gị nso inyere gị aka. Oge ụla m eruola. Na mgbe na-adịghị anya site nꞌugbu a, aga m anọ nꞌụzọ ịla nꞌeluigwe. |
7 |
Alụọla m ọgụ ukwu na nke nta nꞌihi Onyenwe m. Nꞌime ha nile kwa, edebeziela m onwe m nye ya dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ugbu a oge ahụ ezuola mgbe m gaakwụsị ịlụ ọgụ ma zuru ike. |
8 |
Nꞌeluigwe, okpueze nke ezi omume dị na-eche m, nke Onyenwe anyị, onye naekpe ikpe ziri ezi ga-enye m nꞌụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi. Kama ọ bụghị nanị mụ onwe m ka ọ ga-enye okpueze ahụ, ọ ga-enyekwa ya ndị nile ga-eji ịhụnanya na-eche ọbịbịa ya. |
9 |
Mee ọsịịsọ bịakwute m, |
10 |
nꞌihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nꞌanya ahapụla m gaa Tesalonaika. Kresens agaala Galetia, Taitọs kwa agaala Dalmetia. |
11 |
Ọ bụ nanị Luuku nọnyeere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nꞌihi na achọrọ m ya ka ọ nọọ m nso. |
12 |
Ezipụla m Tikikọs ka ọ gaa Efesọs. |
13 |
Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ na Troas nꞌaka Kapọs, wetakwara m akwụkwọ nile ahụ dị nꞌebe ahụ, nke ka nke akwụkwọ akpụkpọ anụ ahụ. |
14 |
Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-ata ya ahụhụ. |
15 |
Kpachara anya nꞌebe ọ nọ, nꞌihi na o kwuru okwu megide ihe nile anyị kwuru. |
16 |
Na mbụ mgbe a kpọtara m nꞌihu onye ikpe, ọ dịghị onye ọ bụla bịara nyere m aka, mmadụ nile gbara ọsọ hapụ m. Ekpere m bụ ka Chineke hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. |
17 |
Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ohere iguzosi ike na-atụghị egwu ikwusa ozi ọma ka ụwa nile nụrụ. Ọ zọpụtara m, mee ka a hapụ ịtụnye m nꞌolulu ọdụm. |
18 |
Nꞌezie, Onyenwe anyị ga-agakwa nꞌihu ịnapụta m site nꞌihe ọjọọ nile. Ọ gaakpọbatakwa m nꞌime alaeze ya nke eluigwe. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. |
19 |
Biko, keleere m Prisila na Akwila na ndị nile bi nꞌụlọ Onisiforọs. |
20 |
Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Militọs nꞌọnọdụ ahụ esighị ike. |
21 |
Biko, jisie ike bịarute nꞌebe a tupuu oge oyi eruo. Yubutọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainus na Kodia na ụmụnna anyị nile. |
22 |
Ka onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọnyere mmụọ gị. Ka amara Chineke dinyere gị. Nọọ nke ọma.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
2 TIMỌTI 4:1 |
2 TIMỌTI 4:2 |
2 TIMỌTI 4:3 |
2 TIMỌTI 4:4 |
2 TIMỌTI 4:5 |
2 TIMỌTI 4:6 |
2 TIMỌTI 4:7 |
2 TIMỌTI 4:8 |
2 TIMỌTI 4:9 |
2 TIMỌTI 4:10 |
2 TIMỌTI 4:11 |
2 TIMỌTI 4:12 |
2 TIMỌTI 4:13 |
2 TIMỌTI 4:14 |
2 TIMỌTI 4:15 |
2 TIMỌTI 4:16 |
2 TIMỌTI 4:17 |
2 TIMỌTI 4:18 |
2 TIMỌTI 4:19 |
2 TIMỌTI 4:20 |
2 TIMỌTI 4:21 |
2 TIMỌTI 4:22 |
|
|
|
|
|
|
2 TIMỌTI 1 / 2TI 1 |
2 TIMỌTI 2 / 2TI 2 |
2 TIMỌTI 3 / 2TI 3 |
2 TIMỌTI 4 / 2TI 4 |