1 |
Ma mata nke a, Timoti, na nꞌoge ikpeazụ ahụ, ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịbụ ndị nke Kraịst. |
2 |
Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha. |
3 |
Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. |
4 |
Ndị na-arara ibe ha nye nꞌaka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nꞌanya, kama ịhụ Chineke nꞌanya. |
5 |
Ha ga-abụ ndị na-aga chọọchị, ma ha agaghị ekwenye nꞌihe ọ bụla ha nụrụ. Wezuga onwe gị nꞌebe ndị dị otu a nọ. |
6 |
Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha. |
7 |
Ụmụ nwanyị ndị a bụ ndị na-agbaso ozizi ọhụrụ nile, ma ha anaghị enwe ike aghọta eziokwu ahụ. |
8 |
Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosisi ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ila bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nꞌebe okwukwe anyị dị. |
9 |
Ma ha agaghị aga nꞌihu na-eme ihe ndị a ruo mgbe ebighị ebi. Otu ụbọchị mmadụ nile ga-amata aghụghọ ha, dị ka ndị mmadụ si mata mmehie Jenas na Jambaras mgbe ọ pụtara ìhè. |
10 |
Ma gị onwe gị amatala omume m, matakwa na adịghị m ka ha. Ị maara ihe m kweere, na ụzọ m si ebi ndụ m, na ihe m chọrọ. Ị maara ụdị okwukwe m nwere nꞌime Kraịst na ahụhụ m nile. Ị maara ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, na ntachi obi m. |
11 |
Ị makwaara banyere nsogbu m nile na ahụhụ m nile, nꞌihi ikwusa ozi ọma ahụ. Ị maara nsogbu nile dakwasịrị m nꞌAntiọk, na nꞌime Aikoniọm, na Listira. Ma Onyenwe anyị dọpụtakwara m nꞌime ha nile. |
12 |
Nꞌezie, ndị nile chọrọ ime ihe ga-atọ Kraịst Jisọs ụtọ, site nꞌibi ndụ ịsọpụrụ Chineke, ga-ahụ ahụhụ site nꞌaka ndị iro Kraịst. |
13 |
Nꞌeziokwu, ndị ajọ omume nile na ndị ozizi ụgha nile ga-ajọ njọ karịa ka ha dị ugbu a. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ, nꞌihi na ekwensu eduhiela ha. |
14 |
Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nꞌime eziokwu ahụ e ziri gị. Nọgidesie ike nꞌime ha, nꞌihi na gị onwe gị maara na ha bụ eziokwu. Ndị ziri gị eziokwu a bụkwa ndị i kwesịrị ịtụkwasị obi. |
15 |
Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs. |
16 |
Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma. |
17 |
Ọ bụ ụzọ Chineke họpụtara ime ka anyị bụrụ ndị a kwadobere nke ọma nꞌụzọ nile, na ndị e mere ka ha bụrụ ndị jikeere ịrụ ọrụ ọma nye onye ọ bụla.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
2 TIMỌTI 3:1 |
2 TIMỌTI 3:2 |
2 TIMỌTI 3:3 |
2 TIMỌTI 3:4 |
2 TIMỌTI 3:5 |
2 TIMỌTI 3:6 |
2 TIMỌTI 3:7 |
2 TIMỌTI 3:8 |
2 TIMỌTI 3:9 |
2 TIMỌTI 3:10 |
2 TIMỌTI 3:11 |
2 TIMỌTI 3:12 |
2 TIMỌTI 3:13 |
2 TIMỌTI 3:14 |
2 TIMỌTI 3:15 |
2 TIMỌTI 3:16 |
2 TIMỌTI 3:17 |
|
|
|
|
|
|
2 TIMỌTI 1 / 2TI 1 |
2 TIMỌTI 2 / 2TI 2 |
2 TIMỌTI 3 / 2TI 3 |
2 TIMỌTI 4 / 2TI 4 |