1 |
O kwesịrị ka ndị Kraịst bụ ohu naarụsiri ndị nwe ha ọrụ ike, ma naenyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Ha emekwala ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ sị na ụmụ Chineke bụ ndị na-adịghị arụsị ọrụ ike. Ekwekwala ka a chịa aha Chineke ọchị, ma ọ bụ ka a chịa ihe a na-ezi banyere ya ọchị nꞌihi nke a. |
2 |
Ọ bụrụ na ndị nwe ha bụ ndị Kraịst, nke a ekwesịghị ime ka ha hapụ ịrụzi ọrụ ha, kama ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike nꞌihi na ọ bụ nwanna nꞌime okwukwe ka ha na-enyere aka. Na-ezi ndị mmadụ eziokwu ndị a. Naagbakwa ha ume ka ha mee ihe ndị a. |
3 |
Ụfọdụ mmadụ nwere ike ịjụ ịnabata okwu ndị a, ma ha bụ ezi ozizi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụrụkwa ntọ ala nke ezi ndụ. |
4 |
Onye ọ bụla naekwu ihe ọzọ dị iche bụ onye na-eweli onwe ya elu na onye nzuzu. Ọ bụkwa onye hụrụ ịrụ ụka na ịjụ oke ajụjụ nꞌanya, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkọcha na ajọ echiche. |
5 |
Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị. |
6 |
Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe. |
7 |
Nꞌihi na anyị ejighị ihe ọ bụla mgbe anyị na-abịa nꞌime ụwa a, otu aka ahụ, anyị agaghị ejikwa ọ bụladị otu kobo si nꞌime ya pụọ mgbe anyị nwụrụ. |
8 |
Nꞌihi nke a o kwesịrị ka afọ ju anyị nꞌihe anyị nwere, ma ọ bụrụ na anyị enwee nanị ihe anyị ga-eri na uwe anyị ga-eyi. |
9 |
Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ. |
10 |
Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju. |
11 |
Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ. |
12 |
Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama. |
13 |
Ana m enye gị iwu nꞌihu Chineke, onye na-enye mmadụ nile ndụ, na nꞌihu Kraịst Jisọs onye gbasiri ama ike nꞌihu Pailet na-atụghị ụjọ. |
14 |
Ka i debezuo ihe nile Chineke nyere gị nꞌiwu idebe. Ka onye ọ bụla ghara ịchọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌime gị, site ugbu a ruo mgbe Kraịst ga-abịaghachi ọzọ. |
15 |
Nꞌihi na mgbe oge ahụ ruru, Chineke onye a gọziri agọzi na onye nanị ya bụ Chineke dị ike, eze kachasị eze nile na onye kachasị ndị nwe mmadụ nile ga-eme ka Kraịst pụta ìhè site nꞌeluigwe. |
16 |
Chineke bụ onye nanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebi nꞌime ìhè, nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọ bụla na-ahụbeghị anya mgbe ọ bụla, onye a na-apụkwaghị ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amin. |
17 |
Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile. |
18 |
Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha. |
19 |
Mgbe ha na-eme ihe ndị a ha na-akpata akụ nke ha naedebe nꞌụlọ akụ nke eluigwe. Nke a bụkwa nanị akụ anyị nwere ike ịkpado nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-abụkwara anyị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ juru afọ nꞌụwa a. |
20 |
Biko, Timoti, ahapụkwala imezu ihe ndị a Chineke tinyere gị nꞌaka ime. Wezuga onwe gị nꞌirụ ụka nzuzu nile nke ndị ahụ na-anya isi banyere amamihe ha nwere, na-achọ ka i soro ha rụọ ụka. Ndị a na-esite nꞌinya isi ha gosi nꞌezie na ha amaghị ihe ọ bụla. |
21 |
Ndị a atụfuola ohere ha nwere ịmata ihe ahụ kachasị mkpa na ndụ ha. Ha amaghị Chineke. Ka amara Chineke dịnyere gị.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 TIMỌTI 6:1 |
1 TIMỌTI 6:2 |
1 TIMỌTI 6:3 |
1 TIMỌTI 6:4 |
1 TIMỌTI 6:5 |
1 TIMỌTI 6:6 |
1 TIMỌTI 6:7 |
1 TIMỌTI 6:8 |
1 TIMỌTI 6:9 |
1 TIMỌTI 6:10 |
1 TIMỌTI 6:11 |
1 TIMỌTI 6:12 |
1 TIMỌTI 6:13 |
1 TIMỌTI 6:14 |
1 TIMỌTI 6:15 |
1 TIMỌTI 6:16 |
1 TIMỌTI 6:17 |
1 TIMỌTI 6:18 |
1 TIMỌTI 6:19 |
1 TIMỌTI 6:20 |
1 TIMỌTI 6:21 |
|
|
|
|
|
|
1 TIMỌTI 1 / 1TI 1 |
1 TIMỌTI 2 / 1TI 2 |
1 TIMỌTI 3 / 1TI 3 |
1 TIMỌTI 4 / 1TI 4 |
1 TIMỌTI 5 / 1TI 5 |
1 TIMỌTI 6 / 1TI 6 |