1 |
Abarala okenye mba, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorọbịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nꞌanya okwu. |
2 |
Na-emeso ndị bụ agadi nwanyị omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche dị ọcha banyere ha. |
3 |
O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya. |
4 |
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ. |
5 |
Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke. |
6 |
Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nꞌaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụ rịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. |
7 |
Ihe ndị a bụ ihe i kwesịrị inye ndị chọọchị gị dị ka iwu, ka ụmụ Chineke mụta, ma na-emekwa ihe dị mma. |
8 |
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị. |
9 |
Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile. |
10 |
Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma. |
11 |
Ma o kwesịghị ka a kpọbata ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nꞌòtù ụmụ nwanyị na-eje ozi na chọọchị. Nꞌihi na nwa oge nta gafee ha nwere ike lụọ di ọzọ, chefuo nkwa ha kwere na ha gaanọgidesi ike rụọra Kraịst ọrụ. |
12 |
Ụdị omume a pụrụ iwetara ha ikpe ọmụma, nꞌihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. |
13 |
Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ. |
14 |
Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha. |
15 |
Nꞌihi na ekwensu eduhiela ụfọdụ mee ka ha mehie, ma site na chọọchị gbapụ. |
16 |
Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla. |
17 |
O kwesịrị ka akwụọ ndị ụkọchukwu na-arụzi ọrụ ha ụgwọ dị mma, nke kwesịrị ọrụ ha na-arụ. O kwesịkwara ka a na-enye ha nsọpụrụ ruru ha, karịsịa, ndị ahụ na-arụsị ọrụ ike ikwusa na izi okwu Chineke. |
18 |
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ejila ihe kechie ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha ọka, kama hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ!” Akwụkwọ nsọ kwukwara nꞌebe ọzọ sị, “Onye na-arụ ọrụ kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya”. |
19 |
Egela ntị nꞌebubo ọjọọ ọ bụla a naebo onye okenye karịakwa ma ọ bụ na ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ gbara ama megide ya. |
20 |
Ọ bụrụ na ọ mehiere nꞌezie, kpọpụta ya baara ya mba nꞌihu mmadụ nile na chọọchị, ka onye ọzọ gharakwa iso omume ya. |
21 |
Ana m enye gị iwu a nꞌihu Chineke na nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ ka i nye okenye ọ bụla mehiere ntaramahụhụ kwesịrị mmehie ya, ma okenye ahụ ọ bụ enyị gị ma ọ bụghị, elekwala onye ọ bụla anya nꞌihu. |
22 |
Ebikwasịkwala onye ọ bụla aka nꞌisi ọsịịsọ ime ya okenye ma ọ bụ onye na-eje ozi. Nꞌihi na ị pụrụ ilefu mmehie ya anya. Nke a pụkwara ime ka ọ dị ka ị naakwagide mmehie ha. Hụ na gị onwe gị wezugara onwe gị nꞌebe mmehie nile dị. |
23 |
Aṅụkwala nanị mmiri. Kama o kwesịrị ka ị na-aṅụtụ mmanya ntakịrị ntakịrị nꞌihi ọrịa afọ nke ị na-arịa mgbe nile. |
24 |
Cheta na ụfọdụ mmadụ, ọ bụladị ụfọdụ ndị ụkọchukwu, na-ebi ndụ mmehie nke onye ọ bụla maara ihe banyere ya. Nꞌụdị mmehie dị otu a, i nwere ike ikwu okwu banyere ya. Ma e nwere mmehie ndị ọzọ nke anya naadịghị ahụ. Ha ga-apụta ìhè nꞌụbọchị ikpe. |
25 |
Otu a kwa, ndị mmadụ maara ụfọdụ ihe ọma nke ndị ụkọchukwu na-eme, ma o nwere ụfọdụ ihe ọma ha na-eme nke na-agaghị apụta ìhè tutuu ruo oge ikpeazụ.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 TIMỌTI 5:1 |
1 TIMỌTI 5:2 |
1 TIMỌTI 5:3 |
1 TIMỌTI 5:4 |
1 TIMỌTI 5:5 |
1 TIMỌTI 5:6 |
1 TIMỌTI 5:7 |
1 TIMỌTI 5:8 |
1 TIMỌTI 5:9 |
1 TIMỌTI 5:10 |
1 TIMỌTI 5:11 |
1 TIMỌTI 5:12 |
1 TIMỌTI 5:13 |
1 TIMỌTI 5:14 |
1 TIMỌTI 5:15 |
1 TIMỌTI 5:16 |
1 TIMỌTI 5:17 |
1 TIMỌTI 5:18 |
1 TIMỌTI 5:19 |
1 TIMỌTI 5:20 |
1 TIMỌTI 5:21 |
1 TIMỌTI 5:22 |
1 TIMỌTI 5:23 |
1 TIMỌTI 5:24 |
1 TIMỌTI 5:25 |
|
|
|
|
|
|
1 TIMỌTI 1 / 1TI 1 |
1 TIMỌTI 2 / 1TI 2 |
1 TIMỌTI 3 / 1TI 3 |
1 TIMỌTI 4 / 1TI 4 |
1 TIMỌTI 5 / 1TI 5 |
1 TIMỌTI 6 / 1TI 6 |