1 |
Ihe mbụ m na-adụsị gị ọdụ ike ka i mee bụ nke a. Na-ekpesịrị ndị ọzọ ekpere ike. Rịọ arịrịọ ka Chineke meere ha ebere. Nꞌime ekpere gị nile na-enyekwa Chineke ekele nꞌihi ihe ọ ga-emere ha. |
2 |
Kpeekwara ndị eze ekpere, ha na ndị nile nọ nꞌọnọdụ dị elu, ma ọ bụ ndị na-achị anyị. Ka anyị nwee ike ibi ndụ udo na nke ịdị nwanyọọ, jiri oge anyị nile na-ebi ndụ ịsọpụrụ Chineke, na nke ime ezi omume. |
3 |
Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. |
4 |
Nꞌihi na Chineke chọrọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha matakwa eziokwu ahụ. |
5 |
Ka ha ghọta na ọ bụ nanị otu Chineke dị, na e nwekara nanị otu onye na-ekpe udo nꞌetiti Chineke na mmadụ, onye ahụ bụ Kraịst Jisọs, onye weere ndụ ya nye nꞌihi ịgbapụta mmadụ nile. |
6 |
Nke a bụ ozi ọma ahụ Chineke nyere ụwa mgbe oge ya ruru. |
7 |
A họpụtakwala m nꞌeziokwu ka m bụrụ onyeozi Chineke, ikwusara na izi ndị mba ọzọ ozi ọma a, na igosi ha ụzọ ahụ Chineke kwadoro isi zọpụta ndị mmadụ site nꞌokwukwe. |
8 |
Nꞌihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom nile nọ nꞌebe nile, ndị aka ha dị ọcha, na ndị aka ha na-ejupụtaghị na mmehie, ndị naebughị iro nꞌobi na ndị na-adịghị arụ ụka, ka ha chilie aka ha elu kpọkuo Chineke nꞌekpere. |
9 |
Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma. |
10 |
*** |
11 |
Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe. |
12 |
Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ. |
13 |
Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv. |
14 |
Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke. |
15 |
Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 TIMỌTI 2:1 |
1 TIMỌTI 2:2 |
1 TIMỌTI 2:3 |
1 TIMỌTI 2:4 |
1 TIMỌTI 2:5 |
1 TIMỌTI 2:6 |
1 TIMỌTI 2:7 |
1 TIMỌTI 2:8 |
1 TIMỌTI 2:9 |
1 TIMỌTI 2:10 |
1 TIMỌTI 2:11 |
1 TIMỌTI 2:12 |
1 TIMỌTI 2:13 |
1 TIMỌTI 2:14 |
1 TIMỌTI 2:15 |
|
|
|
|
|
|
1 TIMỌTI 1 / 1TI 1 |
1 TIMỌTI 2 / 1TI 2 |
1 TIMỌTI 3 / 1TI 3 |
1 TIMỌTI 4 / 1TI 4 |
1 TIMỌTI 5 / 1TI 5 |
1 TIMỌTI 6 / 1TI 6 |