A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

2 KỌRINT 6



1
Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ nꞌotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nꞌefu, nꞌihi na Chineke egosila unu oke obi ebere o nwere nꞌebe unu nọ.
2
Ma geenụ ntị nꞌihe Chineke na-ekwu, “Nꞌoge a na-anara mmadụ nke ọma ka akwa unu rutere m ntị. Ọ bụkwa nꞌụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Ya mere, ugbu a bụ oge Chineke chọrọ inyere gị aka. Taa ka Chineke jikeere ịzọpụta gị.
3
Anyị na-ebi ndụ anyị nꞌụzọ mmadụ ọ bụla na-agaghị achọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌọrụ anyị si otu a taa Chineke ụta. Anyị achọkwaghị ka onye chọrọ ikwere nꞌOnyenwe anyị sụọ ngọngọ nꞌihi ụdị ndụ anyị na-ebi.
4
Kama nꞌime ihe nile, anyị na-agbalịsi ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị ji eziokwu na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachi obi na-edi nsogbu nile na mkpagbu nile na ahụhụ nile naadakwasị anyị.
5
A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nꞌime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nꞌọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nꞌime ịmụ anya. Anyị nọkwara ọtụtụ mgbe naerighị nri.
6
Anyị emeekwala ka unu mata na anyị bụ ndị sitere na ndụ dị ọcha anyị na-ebi, na ezi nghọta anyị ghọtara ozi ọma ahụ, na ogologo ntachi obi na-ejere Chineke ozi. Anyị egosikwala unu na anyị bụ ndị nwere obi ọma, ndị hụrụ unu nꞌanya, na ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ Chineke.
7
Anyị bụ ndị eziokwu na ndị ike Chineke dịnyeere. Ngwa agha anyị bụ ezi omume nke anyị ji alụso onye iro ọgụ, ya kwa ka anyị ji echedo onwe anyị.
8
Ụfọdụ mmadụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu.
9
Ụwa amaghị anyị, ma Chineke maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe nile, ma lee anyị ka anyị dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee Chineke na-echebe anyị ka a hapụ igbu anyị.
10
Anyị na-anọ nꞌihe mwute mgbe nile, ma lee ọṅụ Onyenwe anyị na-enye juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọ bụla, ma lee anyị nwere ihe nile.
11
Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe nile dị anyị nꞌobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu.
12
Anyị ji obi anyị nile hụ unu nꞌanya, ma ọ bụ unu mechiri obi unu nꞌebe anyị nọ.
13
Ana m ekwuru unu okwu ugbu a dị ka a ga-asị na ọ bụ ụmụ nke aka m ka m na-agwa okwu. Anyị chọrọ ka unu gosi na unu hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ unu nꞌanya. Megheenụ obi unu nꞌebe anyị nọ.
14
Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọ bụla. Nꞌihi na gịnị ka ezi omume na ihe ọjọọ nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?
15
Ọ̀ bụ nnwekọ dị aṅaa dị na-agbata onye Kraịst na ekwensu? Gịnị kwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?
16
Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọ nsọ Chineke na arụsị? Nꞌihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kwuru sị, “M ga-ebi nꞌime ha, jegharịakwa nꞌime ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”
17
Ọ bụ nke a mere Chineke ji kwuo sị, “Sinụ nꞌetiti ha pụta, wezuganụ onwe unu nꞌebe ha nọ. Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka, mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.
18
Mụ onwe m ga-abụ Nna unu, unu onwe unu ga-abụkwa ụmụ m ndị nwoke na ndị nwanyị.”











2 KỌRINT 6:1
2 KỌRINT 6:2
2 KỌRINT 6:3
2 KỌRINT 6:4
2 KỌRINT 6:5
2 KỌRINT 6:6
2 KỌRINT 6:7
2 KỌRINT 6:8
2 KỌRINT 6:9
2 KỌRINT 6:10
2 KỌRINT 6:11
2 KỌRINT 6:12
2 KỌRINT 6:13
2 KỌRINT 6:14
2 KỌRINT 6:15
2 KỌRINT 6:16
2 KỌRINT 6:17
2 KỌRINT 6:18






2 KỌRINT 1 / 2KỌR 1
2 KỌRINT 2 / 2KỌR 2
2 KỌRINT 3 / 2KỌR 3
2 KỌRINT 4 / 2KỌR 4
2 KỌRINT 5 / 2KỌR 5
2 KỌRINT 6 / 2KỌR 6
2 KỌRINT 7 / 2KỌR 7
2 KỌRINT 8 / 2KỌR 8
2 KỌRINT 9 / 2KỌR 9
2 KỌRINT 10 / 2KỌR 10
2 KỌRINT 11 / 2KỌR 11
2 KỌRINT 12 / 2KỌR 12
2 KỌRINT 13 / 2KỌR 13