1 |
Nꞌihi na anyị matara na mgbe anyị nwụrụ, pụọ site nꞌanụ ahụ anyị ndị a pụrụ ire ure, Chineke ga-enye anyị anụ ahụ ọzọ nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nꞌeluigwe. Anụ ahụ ọ ga-enye anyị abụghị nke e ji aka mee, kama ọ bụ nke Chineke nꞌonwe ya kpụrụ. |
2 |
Nꞌezie, anyị nọ ugbu a naasụ ude nꞌime anụ ahụ a anyị nwere. Ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike ka e yikwasị anyị anụ ahụ eluigwe ahụ, nke anyị ga-eyikwasị dị ka uwe. |
3 |
Nꞌihi na mgbe e yikwasịrị anyị ụdị anụ ahụ nke eluigwe, anyị agaghị abụkwa nanị mmadụ efu. |
4 |
Mgbe ahụ nile anyị nọ nꞌime anụ ahụ nke ụwa a, anyị naanọgide nꞌịsụ ude. Ọ bụghị nꞌihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị naenweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ ahụ pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi. |
5 |
Nke a bụ ihe Chineke kwadebeere anyị. O nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ya ka ọ bụrụ ihe ga-egosi anyị na ọ ga-emezuru anyị nkwa ahụ. |
6 |
Nꞌihi nke a anyị nwere obi ike na ntụkwasị obi mgbe nile, nꞌihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nꞌihu naadị ndụ nꞌụwa a, anyị anọghị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe. |
7 |
Nꞌihi na ọ bụ okwukwe ka anyị ji mata na ihe ndị a bụ eziokwu site nꞌịtụkwasị Onyenwe anyị obi. Ọ bụghị nꞌihi na anyị ahụla ha. |
8 |
Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe. |
9 |
Ya mere, ma anyị nọ nꞌeluigwe, anyị na Onyenwe anyị, ma anyị nọ nꞌebe a, nꞌụwa a, uche anyị mgbe nile bụ ime ihe ga-adị ya ezi ụtọ. |
10 |
Nꞌihi na anyị nile ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Kraịst, ka o kpee anyị ikpe. Mgbe ahụ onye ọ bụla nꞌime anyị, nꞌotu nꞌotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dị ka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nꞌime ụwa si dị. |
11 |
Ọ bụ nꞌihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Kraịst. Chineke makwaara obi anyị na ha dị ọcha. Enwekwara m olileanya na unu maara m nke ọma nꞌime obi unu. |
12 |
Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ụdị ezi agwa ha nwere. |
13 |
Ara ọ̀ dị anyị ikwu ihe dị otu a banyere onwe anyị? Ọ bụrụ na anyị dị ka ndị akọnuche ha na-ezughị oke, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ iwetara Chineke otuto. Ọ bụrụkwa na ihe anyị na-ekwu na-egosi na anyị bụ ndị isi zuru oke, ọ bụkwa nꞌihi ọdịmma unu. |
14 |
Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nꞌihi na ọ bụrụ na anyị kwenyere na Kraịst nwụrụ nꞌọnọdụ mmadụ nile, anyị na-ekwerekwa na mmadụ nile nwụrụ nye ndụ ochie ha mgbe Kraịst nwụrụ. |
15 |
Kraịst nwụrụ nꞌihi mmadụ nile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị ndụ ga-atọ Jisọs, onye ahụ nwụrụ nꞌọnọdụ ha ụtọ. Ee, Kraịst ahụ e mekwara ka o si nꞌọnwụ bilie ọzọ. |
16 |
Anyị onwe anyị adịghị elekwa onye ọ bụla anya site nꞌihe ndị mmadụ na-eche banyere ha. Nꞌihi na anyị sitere nꞌụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a anyị amakwaghị ya nꞌụzọ dị otu a. |
17 |
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela. |
18 |
Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nꞌaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo. Ma ugbu a o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nꞌudo. |
19 |
Ozi ọma Chineke ziri anyị ikwusa bụ na ọ chọrọ ka ya na mmadụ nile dị nꞌudo site na Kraịst. Chineke agụkwaghị mmehie nile mmadụ mere megide ya, kama o jirila ọbara Kraịst sachapụ ha. |
20 |
Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nꞌụwa. Chineke ji anyị naagwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dị ka ọ bụ Kraịst nꞌonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke bụrụ enyi. |
21 |
Kraịst emehieghị mgbe ọ bụla, kama, nꞌihi anyị, Chineke mere ka o kere oke nꞌime mmehie anyị, ka o si otu a mee ka e jikọtaa anyị na ya, ka anyị nwee oke nꞌime ezi omume Chineke na-enye.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
2 KỌRINT 5:1 |
2 KỌRINT 5:2 |
2 KỌRINT 5:3 |
2 KỌRINT 5:4 |
2 KỌRINT 5:5 |
2 KỌRINT 5:6 |
2 KỌRINT 5:7 |
2 KỌRINT 5:8 |
2 KỌRINT 5:9 |
2 KỌRINT 5:10 |
2 KỌRINT 5:11 |
2 KỌRINT 5:12 |
2 KỌRINT 5:13 |
2 KỌRINT 5:14 |
2 KỌRINT 5:15 |
2 KỌRINT 5:16 |
2 KỌRINT 5:17 |
2 KỌRINT 5:18 |
2 KỌRINT 5:19 |
2 KỌRINT 5:20 |
2 KỌRINT 5:21 |
|
|
|
|
|
|
2 KỌRINT 1 / 2KỌR 1 |
2 KỌRINT 2 / 2KỌR 2 |
2 KỌRINT 3 / 2KỌR 3 |
2 KỌRINT 4 / 2KỌR 4 |
2 KỌRINT 5 / 2KỌR 5 |
2 KỌRINT 6 / 2KỌR 6 |
2 KỌRINT 7 / 2KỌR 7 |
2 KỌRINT 8 / 2KỌR 8 |
2 KỌRINT 9 / 2KỌR 9 |
2 KỌRINT 10 / 2KỌR 10 |
2 KỌRINT 11 / 2KỌR 11 |
2 KỌRINT 12 / 2KỌR 12 |
2 KỌRINT 13 / 2KỌR 13 |