1 |
Ugbu a, achọrọ m ịsa ajụjụ ndị ahụ unu jụrụ nꞌakwụkwọ unu deteere m. Ndị a bụ ọsịsa m banyere ajụjụ ịlụ nwanyị. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na nwoke emetụghị nwanyị aka. |
2 |
Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie. |
3 |
Ka nwoke ọ bụla nwere nwụnye nye nwụnye ya ihe nile ruuru ya dị ka nwanyị nwere di. Nwanyị ọ bụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. |
4 |
Nꞌihi na nwanyị ọ bụla lụrụ di adịkwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwụnye ya na-achị ya. |
5 |
Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka. |
6 |
Anaghị m ekwu nke a ịkwagide unu ịlụ di na nwụnye, kama onye chọrọ ịlụ nwere ike lụọ. |
7 |
Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ nile nọrọ dị ka m ṅa-alụghị nwụnye. Ma onye ọ bụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ di ma ọ bụ nwụnye, ndị ọzọ ka o nyere onyinye ịnọrọ onwe ha na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye. |
8 |
Ya mere geenụ ntị, unu ụmụ nwanyị nile na-alụbeghị di, na unu nile di ha nwụrụ anwụ, ọ ga-akara unu mma ịnọrọ nke onwe unu dị ka m. |
9 |
Ma ọ bụrụ na ị pụghị ijide onwe gị, igbaso nwoke ma ọ bụ nwanyị, gaa chọrọ di ma ọ bụ nwụnye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, karịa ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye na-anwụ nꞌihi agụụ inwe mmekọrịta nke nwoke na nwanyị. |
10 |
Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwụnye nile, enwere m iwu m na-enye unu. Iwu a esighị nꞌaka m, kama o si nꞌaka Onyenwe anyị. O kwesịghị ka nwanyị ọ bụla hapụ di ya. |
11 |
A sịkwa na nwanyị ọ bụla ahapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, ma ọ bụ ya laghachikwuru di ya. Nwoke ọ bụla ekwesịkwaghị ịchụpụ nwụnye ya. |
12 |
Ka m tụnyetụ aro nke m. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke kwuru ha, kama ha ziri ezi nꞌanya m. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dị ka nwụnye ya. |
13 |
Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya achọkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ka nwanyị ahụ nọgide dị ka nwụnye ya. |
14 |
Nꞌihi na a na-eme ka nwoke ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na nwụnye ya, otu a kwa a na-emekwa ka nwụnye ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na di ya. Nꞌihi na, ọ bụrụ na ha agbaara onwe ha achọkwaghị m, a ga-agụ ụmụ ha dị ka ndị na-amaghị Chineke. Ma ọ bụrụ na ha ebiri, a ga-agụ ha dị ka ndị dị nsọ. |
15 |
Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha. |
16 |
Nꞌihi na gị nwanyị na-adọ ka di gị nọgide, gịnị nyere gị olileanya iche na di gị ga-emesịa kwere na Kraịst? Otu a kwa gị nwoke na-adọ ka nwụnye gị nọgide, olee otu i si mara na ị pụrụ ime ka nwụnye gị bụrụ onye Kraịst? |
17 |
Bikonụ mgbe unu na-enwe mkpebi unu nꞌihe ndị a, ka onye ọ bụla na-ebi ndụ ya dị ka Chineke chọrọ ka o bie ya. Onye na-alụ di ma ọ bụ nwụnye, ya mee ya dị ka otu Chineke si duzie. Onye nke na-adịghị alụkwa, ya meekwa dị ka Chineke siri duzie ya. Nke a bụ iwu m na-enye nꞌụlọ chọọchị nile m gara. |
18 |
Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye e biri ugwu tupuu ya anabata Onyenwe anyị, ka nke a hapụ iwute ya. Ka onye a na-ebighị ugwu hapụ inye onwe ya nsogbu, ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu. |
19 |
Nꞌihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ọ dịghị ihe ndị a pụtara nꞌihu Chineke. Ihe dị mkpa bụ irube isi nꞌiwu Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ. |
20 |
Ka onye ọ bụla nọgide dị ka ọ dị mgbe a kpọrọ ya. |
21 |
Ọ bụrụ na ị bụ ohu echegbula onwe gị nꞌihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, mee ya. |
22 |
Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu, cheta na Kraịst emeela ka ị bụrụ onye nweere onwe ya site nꞌike mmehie. Ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe i nweere onwe gị, cheta na ị bụ ohu Kraịst ugbu a. |
23 |
Kraịst akwụọla ụgwọ isi unu, unu bụ nke ya ugbu a. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nwe onwe ha, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ. |
24 |
Ụmụnna m, nꞌọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ mgbe ọ nabatara Kraịst, ya nọgidesie ike nꞌime ya, kama nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụkwasị Kraịst obi nꞌihi na Onyenwe anyị nọ nꞌebe ahụ inyere ya aka. |
25 |
Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ banyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di. Unu na-ajụ ma o ziri ezi nꞌezie ka ha lụọ di. Enweghị m iwu ọ bụla site nꞌaka Chineke banyere ajụjụ a, ma o nyere m amamihe nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nꞌihi nke a, leenụ ihe m chere banyere ajụjụ a. |
26 |
Echere m na ọ ka mma ugbu a, nꞌihi nsogbu na-adakwasị ndị Kraịst nꞌoge a, ka nwoke na nwanyị onye Kraịst ọ bụla nọọrọ onwe ya na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye. |
27 |
Ma ọ bụrụ na ị nwere di ma ọ bụ nwụnye, ahapụla ya, a sịkwa na ị bụ okokporo, emela ngwangwa ịchọ nwanyị ị ga-alụ ugbu a. |
28 |
Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a. |
29 |
Ihe unu kwesịrị ịmata bụ na oge anyị nwere nꞌụwa a fọdụrụ nanị ntakịrị, nꞌihi nke a, ka ndị nwere di na nwụnye bụrụ ndị ji oge ha nile na-arụ ọrụ Chineke. |
30 |
Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dị ka ndị na-enweghị obi ọjọọ ọ bụla, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dị ka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọ bụla. |
31 |
Ka ndị na-etinye oge nꞌihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe nile dị nꞌụwa nꞌuru. Nꞌihi na ụwa a, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga. |
32 |
Nꞌime ihe nile unu na-eme, unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya nile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. |
33 |
Ma nwoke nwere nwụnye enwezighị ohere ịrụrụ Onyenwe anyị ọrụ nꞌihi na echiche ya nile na ihe na-agụ ya agụụ bụ igbo mkpa dị nꞌezinụlọ ya, na ime ihe ga-atọ nwụnye ya ụtọ. |
34 |
Nꞌụzọ dị otu a, ọ na-enwekwa obi abụọ nꞌihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nwagbọghọ lụrụ di. Echiche ya nile bụ ime ka ihe dị nꞌezinụlọ ya dị mma, na ime ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma ọchịchọ nwagbọghọ na-enweghị di bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. |
35 |
Ihe m na-eme abụghị ịgbalị igbochi unu ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, kama ọ bụ inyere unu aka. Ya mere, achọrọ m ka unu mee ihe ahụ unu maara ga-enyere unu aka iji otu obi rụọra Chineke ọrụ. |
36 |
Ọ bụrụkwa na nwoke ọ bụla ekpebie ịlụ nwụnye nꞌihi na o siiri ya ike ijide onwe ya nꞌihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya, o meghị mmehie ọ bụla ma ọ lụọ nwụnye. |
37 |
Ma ọ bụrụ na nwoke ekpebie nꞌobi ya na ọ gaghị alụ nwụnye ma nweekwa ike ijide onwe ya aka, ọ bụ ihe dị mma ka o mere. |
38 |
Ya mere, onye ahụ lụrụ di ma ọ bụ nwụnye mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa. |
39 |
Njikọta e jikọtara nwụnye na di ya na-adị ire nanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nanị onye nke Kraịst. |
40 |
Nꞌuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nꞌobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na ndụmọdụ ndị a m nyere unu si na Mmụọ Chineke bịa.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 7:1 |
1 KỌRINT 7:2 |
1 KỌRINT 7:3 |
1 KỌRINT 7:4 |
1 KỌRINT 7:5 |
1 KỌRINT 7:6 |
1 KỌRINT 7:7 |
1 KỌRINT 7:8 |
1 KỌRINT 7:9 |
1 KỌRINT 7:10 |
1 KỌRINT 7:11 |
1 KỌRINT 7:12 |
1 KỌRINT 7:13 |
1 KỌRINT 7:14 |
1 KỌRINT 7:15 |
1 KỌRINT 7:16 |
1 KỌRINT 7:17 |
1 KỌRINT 7:18 |
1 KỌRINT 7:19 |
1 KỌRINT 7:20 |
1 KỌRINT 7:21 |
1 KỌRINT 7:22 |
1 KỌRINT 7:23 |
1 KỌRINT 7:24 |
1 KỌRINT 7:25 |
1 KỌRINT 7:26 |
1 KỌRINT 7:27 |
1 KỌRINT 7:28 |
1 KỌRINT 7:29 |
1 KỌRINT 7:30 |
1 KỌRINT 7:31 |
1 KỌRINT 7:32 |
1 KỌRINT 7:33 |
1 KỌRINT 7:34 |
1 KỌRINT 7:35 |
1 KỌRINT 7:36 |
1 KỌRINT 7:37 |
1 KỌRINT 7:38 |
1 KỌRINT 7:39 |
1 KỌRINT 7:40 |
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 1 / 1KỌR 1 |
1 KỌRINT 2 / 1KỌR 2 |
1 KỌRINT 3 / 1KỌR 3 |
1 KỌRINT 4 / 1KỌR 4 |
1 KỌRINT 5 / 1KỌR 5 |
1 KỌRINT 6 / 1KỌR 6 |
1 KỌRINT 7 / 1KỌR 7 |
1 KỌRINT 8 / 1KỌR 8 |
1 KỌRINT 9 / 1KỌR 9 |
1 KỌRINT 10 / 1KỌR 10 |
1 KỌRINT 11 / 1KỌR 11 |
1 KỌRINT 12 / 1KỌR 12 |
1 KỌRINT 13 / 1KỌR 13 |
1 KỌRINT 14 / 1KỌR 14 |
1 KỌRINT 15 / 1KỌR 15 |
1 KỌRINT 16 / 1KỌR 16 |