A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

1 KỌRINT 6



1
Gịnị mere o ji bụrụ na unu na nwanne unu nwoke nꞌime Kraịst nwee esemokwu, unu eburu okwu ahụ gaa nꞌụlọ ikpe ka ndị na-ekweghị ekwe kpeere unu ikpe? Gịnị gbochiri unu iji okwu ahụ gaa nꞌọgbakọ Kraịst, ka ndị kwere ekwe nọkọọ doziere unu okwu ahụ?
2
Ọ̀ bụ na unu amabeghị na ọ bụ anyị ụmụ Chineke gaje ikpe ụwa a ikpe? Ebe unu gaje ịchị ụwa nile, gịnị mere unu enweghị ike dozie ihe ntakịrị pụtara nꞌetiti unu?
3
Ọ̀ bụ na unu amatakwaghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi nsogbu nile dapụtara nꞌetiti anyị nꞌụwa a?
4
Ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nꞌetiti gị na nwanne gị, gịnị mere ị ga-eji were okwu ahụ jekwuru ndị na-enweghị ọnọdụ nꞌime Kraịst ka ha kpee ya?
5
Ana m ekwu okwu ndị a ime ka ihere mee unu. Ọ̀ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nꞌetiti unu onye ga na-ekpe ikpe dịrị ụmụnna nꞌime Kraịst?
6
Leenụ! nwanne ji nwanne ya aga ụlọ ikpe, na-ebo ya ebubo nꞌihu ndị na-ekweghị ekwe!
7
Ebe unu na-enwe esemokwu nke unu ji aga nꞌụlọ ikpe, ọ pụtara ìhè na unu na-ala azụ nꞌokwukwe unu. Gịnị gbochiri gị idi na ịnagide mmejọ e mejọrọ gị na nghọgbu a ghọgburu gị?
8
Ma kama unu ga-anagide mmejọ, ma die nghọgbu, ọ bụ unu onwe unu na-emegbu ndị ọzọ, ọ bụladị ụmụnna unu nꞌime Kraịst.
9
Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,
10
ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke.
11
Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.
12
Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya.
13
Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ.
14
Dị ka Chineke si site nꞌike ya mee ka Onyenwe anyị site nꞌọnwụ bilie, otu ahụ kwa ka ọ ga-esitekwa nꞌike ya mee ka anyị si nꞌọnwụ bilie.
15
Ọ̀ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ̀ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụla? Tụfiaa! Chineke ekwela.
16
Ọ̀ bụ na unu amataghị na nwoke ọ bụla ya na nwanyị akwụla nwere mmekọrịta esorola nwanyị ahụ bụrụ otu anụ ahụ? Nꞌihi na e kwuru ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
17
Ma ọ bụrụ na e jikọtaa mmadụ ọ bụla na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nꞌime mmụọ.
18
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.
19
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
20
Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.











1 KỌRINT 6:1
1 KỌRINT 6:2
1 KỌRINT 6:3
1 KỌRINT 6:4
1 KỌRINT 6:5
1 KỌRINT 6:6
1 KỌRINT 6:7
1 KỌRINT 6:8
1 KỌRINT 6:9
1 KỌRINT 6:10
1 KỌRINT 6:11
1 KỌRINT 6:12
1 KỌRINT 6:13
1 KỌRINT 6:14
1 KỌRINT 6:15
1 KỌRINT 6:16
1 KỌRINT 6:17
1 KỌRINT 6:18
1 KỌRINT 6:19
1 KỌRINT 6:20






1 KỌRINT 1 / 1KỌR 1
1 KỌRINT 2 / 1KỌR 2
1 KỌRINT 3 / 1KỌR 3
1 KỌRINT 4 / 1KỌR 4
1 KỌRINT 5 / 1KỌR 5
1 KỌRINT 6 / 1KỌR 6
1 KỌRINT 7 / 1KỌR 7
1 KỌRINT 8 / 1KỌR 8
1 KỌRINT 9 / 1KỌR 9
1 KỌRINT 10 / 1KỌR 10
1 KỌRINT 11 / 1KỌR 11
1 KỌRINT 12 / 1KỌR 12
1 KỌRINT 13 / 1KỌR 13
1 KỌRINT 14 / 1KỌR 14
1 KỌRINT 15 / 1KỌR 15
1 KỌRINT 16 / 1KỌR 16