1 |
Ka ịhụ mmadụ ibe unu nꞌanya bụrụ ihe na-agụsi unu agụụ ike. Rịọkwanụ Chineke ka o nye unu onyinye nke Mmụọ Nsọ ya na-enye, nke ka nke, onyinye ibu amụma, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke. |
2 |
Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị. |
3 |
Ma onye ahụ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ okwu na-enyere ha aka ito eto nꞌime Onyenwe anyị. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu. |
4 |
Ya mere, nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma na-enyere chọọchị nile aka ito eto nꞌime mmụọ, ma nwoke ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere nanị onwe ya aka. |
5 |
Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu nile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu nile enwee onyinye izisa ozi ọma. Nke a bụ nꞌihi na nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma bara uru karịa nwoke na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, onye nwekwara ike ikọwara chọọchị ihe o kwuru. |
6 |
Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ nke unu na-adịghị anụ, olee uru m baara unu? Ọ baghị uru ọ bụla! Kama ọ bụrụ na m ekwuo okwu nꞌụzọ doro anya, banyere ihe Chineke kpughere gosi m, ma ọ bụ ihe nile m maara, ma ọ bụ ihe gaje ime, ma ọ bụ ozizi nke eziokwu Chineke, nke a ọ̀ gaghị abara unu uru? |
7 |
Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nꞌetiti ihe nile na-enweghị ndụ, ma ha bụ ihe na-eme ụzụ dị ka opi, ma ọ bụ ụbọ akwara. O nweghị onye ga-aghọta ihe onye na-afụ opi na-egbu ma ọ bụ ihe onye na-akpọ ụbọ akwara na-akpọ ma ọ bụrụ na ọ maliteghị ya nke ọma. |
8 |
Ọ bụrụkwa na nwoke na-egbu opi ike egbuzighị ya dị ka o si kwesị, olee otu ndị agha ga-esi mata na agha dị? |
9 |
Nꞌotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nꞌasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Ịgwa mmadụ okwu otu ahụ dị ka mmadụ ichenye ọnụ nꞌezi na-ekwuru ifufe okwu. |
10 |
Asụsụ a na-asụ nꞌụwa a dị ukwuu, ma ha nile bara uru nye ndị na-anụ ha. |
11 |
Ọ bụrụ na mmadụ e jiri otu nꞌime asụsụ ndị a gwa m okwu, aga m abụ ọbịa nꞌebe onye na-asụrụ m asụsụ ahụ m na-adịghị anụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nꞌebe m nọ. |
12 |
Ebe unu na-achọsi ike inwe onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ Chineke elu. |
13 |
Ọ bụrụ na Chineke nyere onye ọ bụla onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ya rịọ Chineke ka o nyekwa ya ike ịkọwa ihe ọ na-ekwu. |
14 |
Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe. |
15 |
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị jirikwa uche kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m ghọtara. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị, jirikwa uche m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m ghọtara, ka m nwee ike ịmata ihe m na-ekwu na ihe m na-abụ nꞌabụ. |
16 |
Nꞌihi na mgbe i ji asụsụ nke ndị ọzọ na-amaghị na-ekpere Chineke ekpere, olee otu ndị nile nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amin? |
17 |
Ọ bụ ezie na ekpere gị ga-ama mma, ma o nyereghị onye ahụ na-anụghị ya aka. |
18 |
Ana m ekele Chineke nꞌihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu nile. |
19 |
Ma mgbe ọ bụla ndị Kraịst zukọrọ nꞌofufe, ọ na-akara m mma ikwu nanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ nile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nꞌasụsụ dị iche nke onye ọ bụla na-apụghị ịghọta. |
20 |
Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nꞌechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nꞌihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nꞌihe gbasara ụdị okwu a. |
21 |
E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na Chineke ga-eji asụsụ ndị mba ọzọ gwa ndị ya bụ ụmụ Izirel okwu, ma ha agaghị ege ntị. |
22 |
Nke a na-egosi na ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe dị mkpa nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ịrịba ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma, nke bụ ikwusa eziokwu Chineke, bụ ihe dị ndị kweere na Kraịst mkpa. Ndị na-ekweghị ekwe anaghị ahụ mkpa nke a dị. |
23 |
Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri? |
24 |
Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ. |
25 |
Mgbe ọ ga-anọ na-ege ntị, ihe ọ ga-anụ ga-emekụta echiche nzuzo ya nile, mee ka ndụ ọjọọ ya pụta ìhè. Nke a ga-emekwa ka o gbuo ikpere nꞌala kpọọ isi ala nye Chineke sị, “Nꞌezie, Chineke nọ nꞌetiti unu.” |
26 |
Ugbu a, ụmụnna m, gịnị bụ isi ihe m na-ekwu? Mgbe ọ bụla unu zukọrọ ife Chineke, ụfọdụ kwesịrị ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe, ma ọ bụ gwa unu ozi dị mkpa Chineke gosiri ya, ma ọ bụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọ bụla e mere nꞌime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-abara onye ọ bụla uru. |
27 |
A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu nꞌime chọọchị, ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nꞌotu nꞌotu nꞌusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nꞌebe ahụ. |
28 |
Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịtaa ya. |
29 |
Ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nꞌotu nꞌotu, mgbe mmadụ nile nọrọ nwayọọ na-ege ha ntị. |
30 |
Ọ bụrụ na onye ọzọ anata ozi site nꞌaka Chineke, mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu, ka onye ahụ natara ozi ahụ chere tutuu onye nke na-ekwu ekwuchaa tupuu o kwuo nke ya. |
31 |
Nꞌụzọ dị otu a, ndị nile nwere onyinye ibu amụma nwere ike izisa ozi ọma Chineke. Nꞌụzọ dị otu a kwa, a ga-enyere mmadụ nile aka kasiekwa ha obi. |
32 |
Chetanụ na onye ahụ Chineke chọrọ isite nꞌọnụ ya kwuo okwu nwere ike iji ndidi chere ruo mgbe o ruru oge nke ya ikwu okwu. |
33 |
Nꞌihi na Chineke abụghị onye na-achọ ka ihe nile na-aga aghara aghara. Chineke chọrọ ka ihe nile na-aga nꞌusoro nꞌime chọọchị nile nke ndị ya. |
34 |
Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke. |
35 |
Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị. |
36 |
Ùnu jụrụ ịnabata okwu a? Ùnu chere na okwu Chineke malitere nꞌaka unu? Ùnu chekwara na ọ ga-akwụsị nꞌaka unu? Ụgha! |
37 |
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, ma ọ bụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, nanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nꞌonwe ya nyere m. |
38 |
Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ige ntị nꞌihe m kwuru nꞌakwụkwọ a, unu aṅala ya ntị! |
39 |
Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke nꞌụzọ doro anya. Kama unu akwụsịkwala ndị nwere onyinye ịsụ asụsụ nke ha na-amụghị amụ. |
40 |
Ma meenụ ihe nile nꞌụzọ dị mma, ka ha dịkwa nꞌusoro.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 14:1 |
1 KỌRINT 14:2 |
1 KỌRINT 14:3 |
1 KỌRINT 14:4 |
1 KỌRINT 14:5 |
1 KỌRINT 14:6 |
1 KỌRINT 14:7 |
1 KỌRINT 14:8 |
1 KỌRINT 14:9 |
1 KỌRINT 14:10 |
1 KỌRINT 14:11 |
1 KỌRINT 14:12 |
1 KỌRINT 14:13 |
1 KỌRINT 14:14 |
1 KỌRINT 14:15 |
1 KỌRINT 14:16 |
1 KỌRINT 14:17 |
1 KỌRINT 14:18 |
1 KỌRINT 14:19 |
1 KỌRINT 14:20 |
1 KỌRINT 14:21 |
1 KỌRINT 14:22 |
1 KỌRINT 14:23 |
1 KỌRINT 14:24 |
1 KỌRINT 14:25 |
1 KỌRINT 14:26 |
1 KỌRINT 14:27 |
1 KỌRINT 14:28 |
1 KỌRINT 14:29 |
1 KỌRINT 14:30 |
1 KỌRINT 14:31 |
1 KỌRINT 14:32 |
1 KỌRINT 14:33 |
1 KỌRINT 14:34 |
1 KỌRINT 14:35 |
1 KỌRINT 14:36 |
1 KỌRINT 14:37 |
1 KỌRINT 14:38 |
1 KỌRINT 14:39 |
1 KỌRINT 14:40 |
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 1 / 1KỌR 1 |
1 KỌRINT 2 / 1KỌR 2 |
1 KỌRINT 3 / 1KỌR 3 |
1 KỌRINT 4 / 1KỌR 4 |
1 KỌRINT 5 / 1KỌR 5 |
1 KỌRINT 6 / 1KỌR 6 |
1 KỌRINT 7 / 1KỌR 7 |
1 KỌRINT 8 / 1KỌR 8 |
1 KỌRINT 9 / 1KỌR 9 |
1 KỌRINT 10 / 1KỌR 10 |
1 KỌRINT 11 / 1KỌR 11 |
1 KỌRINT 12 / 1KỌR 12 |
1 KỌRINT 13 / 1KỌR 13 |
1 KỌRINT 14 / 1KỌR 14 |
1 KỌRINT 15 / 1KỌR 15 |
1 KỌRINT 16 / 1KỌR 16 |