1 |
Ya mere, bụrụnụ ndị na-eṅomi m, na ndị na-eso nzọ ụkwụ m, dị ka m si eṅomi Kraịst, ma na-esokwa nzọ ụkwụ ya. |
2 |
Ọṅụ juru m obi nꞌihi na unu na-echeta m na nꞌihi na unu na-eme ihe m ziri unu. |
3 |
Ma ọ dị otu ihe dị mkpa m chọrọ ichetara unu. Achọrọ m ka unu mata na dị ka Kraịst si bụrụ isi nwoke nile, otu a ka nwoke ọ bụla si bụrụ isi nwụnye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst. |
4 |
Nwoke ọ bụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi ihe na-eme Kraịst onye bụ isi ya ihe ihere. |
5 |
Ma nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi okwu Chineke, ma o kpuchighị isi ya, na-eme di ya ihe ihere, nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌebe nwanyị a na nwanyị kpụchara isi ya nọ. |
6 |
Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya. |
7 |
Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke. |
8 |
E si na nwoke kee nwanyị mbụ, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. |
9 |
E keghị nwoke mbụ maka nwanyị, ma e kere nwanyị mbụ maka nwoke. |
10 |
Nꞌihi nke a, nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nꞌokpuru di ya, ime ka ndị mmụọ ozi hụ ụdị omume a, site nꞌihi ya ṅụrịa ọṅụ. |
11 |
Ma dị ka nzube Chineke si dị, mkpa nwanyị na-akpa nwoke, mkpa nwoke na-akpa nwanyị. |
12 |
Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwanyị mbụ si na nwoke pụta, ma ọ bụ ụmụ nwanyị na-amụ ụmụ nwoke nile, nwoke na nwanyị nile sitekwara nꞌebe Chineke onye kere ha nọ na-abịa. |
13 |
Achọrọ m ka unu tulee ihe a nꞌonwe unu, ọ̀ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihu ọha mmadụ? |
14 |
Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka Chineke siri mee ya. |
15 |
Nwanyị nwere agịrị isi dị ogologo na-aṅụrị ọṅụ na-anyakwa isi. Akọnuche anyị na-agwakwa anyị na o kwesịrị ka nwanyị na-ekechi isi ya. |
16 |
Ọ bụrụ na ọ dị onye jụrụ ịnabata ozizi a, ọ bụrụkwa na onye ahụ achọọ ịrụ ụka, nanị ihe m maara bụ na anyị, na chọọchị nile, adịghị ezi ihe ọ bụla karịa na nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ nke na-ekwusa ozi ọma nꞌebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ikechi isi ya. |
17 |
Ihe ndị ọzọ m chọrọ ikwu ugbu a bụ ihe gbasara ihe unu na-eme nke m na-ekwesịghị inye unu otuto nꞌihi ha. Nꞌihi na omume unu na-eme mgbe unu zukọtara nꞌime chọọchị unu bụ omume jọgburu onwe ya na njọ. |
18 |
Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe nile unu zukọrọ, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nꞌetiti unu. Ọ na-adịkwa m ka ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu. |
19 |
Ana m echekwa na ụdị nkewa a na-atọ unu bụ ndị na-eme ezi ihe mgbe nile ụtọ nꞌihi na unu chọrọ ka e site nꞌụzọ dị otu a mata unu. |
20 |
Mgbe unu zukọtara iri nri, ọ bụghị oriri nsọ ka unu na-eri. |
21 |
Nꞌihi na anụrụ m na onye ọ bụla na-eri nri nke aka ya. Anụkwara m na ndị nile bu nri ha bịa na-ericha ya ngwangwa. Ha anaghị echere ka ndị na-enweghị nri ha ji bịa soro ha keta oke na nri ha ji bịa. Nꞌihi nke a ụfọdụ na-eribiga nri oke mgbe ndị ọzọ na-anọ agụụ. Ụfọdụ kwa na-aṅụbiga mmanya oke bụrụ ndị mmanya na-egbu. |
22 |
A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iri nri na ịnụ mmanya nꞌụlọ unu tupuu unu abịa nꞌụlọ chọọchị? Karịa na unu ga-ebu ihe ndị a bịa nꞌime chọọchị ime ndị ogbenye na ndị na-enweghị ike iweta nri nke ha ihe ihere. Gịnị ọzọ ka unu chọrọ ka m kwuo banyere ihe ndị a? Ùnu chọrọ ka m too unu? Mbaa! |
23 |
Nꞌihi na ihe m ziri unu banyere oriri nsọ bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nꞌabalị ụbọchị ahụ Judas rara ya nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe beredi. |
24 |
Mgbe o nyechara Chineke ekele nꞌihi ya ọ nyawara ya nye ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ beredi a taa, nꞌihi na nke a bụ anụ ahụ m nke a na-enye nꞌihi unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.” |
25 |
Nꞌụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risịrị nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị nꞌetiti unu na Chineke, nke e ji ọbara m mee ka o guzosie ike. Meekwanụ otu a icheta m.” |
26 |
Nꞌihi na mgbe ọ bụla unu na-eri nri a na-aṅụkwa site nꞌiko a, unu na-akọ akụkọ banyere ọnwụ Jisọs. Na-emekwanụ nke a tutuu ruo mgbe ọ laghachiri ọzọ. |
27 |
Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ataa beredi Onyenwe anyị ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko Onyenwe anyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Kraịst na ọbara ya. |
28 |
Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọ bụla nyochaa onwe ya nke ọma tupuu o rie beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ. |
29 |
Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ ataa beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-echeghị echiche banyere anụ ahụ Kraịst na ihe ọ pụtara, ọ na-eri, na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, nꞌihi na ọ bụ ọnwụ Kraịst ka o ji egwuri egwu. |
30 |
Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nꞌime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nꞌọrịa na ndị dara nꞌụra ọnwụ. |
31 |
Ọ bụrụ na unu enyochaa onwe unu nke ọma tupuu unu erie oriri nsọ unu agaghị adaba nꞌikpe na ahụhụ Chineke. |
32 |
Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekpee anyị ikpe, ma ọ bụ taa anyị ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka a hapụ ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe. |
33 |
Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịara iri oriri nsọ cherenụ ibe unu. |
34 |
Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọ bụla ya rie nri nꞌụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, mgbe unu nile zukọtara. Aga m edozi okwu ndị ọzọ mgbe m bịara.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 11:1 |
1 KỌRINT 11:2 |
1 KỌRINT 11:3 |
1 KỌRINT 11:4 |
1 KỌRINT 11:5 |
1 KỌRINT 11:6 |
1 KỌRINT 11:7 |
1 KỌRINT 11:8 |
1 KỌRINT 11:9 |
1 KỌRINT 11:10 |
1 KỌRINT 11:11 |
1 KỌRINT 11:12 |
1 KỌRINT 11:13 |
1 KỌRINT 11:14 |
1 KỌRINT 11:15 |
1 KỌRINT 11:16 |
1 KỌRINT 11:17 |
1 KỌRINT 11:18 |
1 KỌRINT 11:19 |
1 KỌRINT 11:20 |
1 KỌRINT 11:21 |
1 KỌRINT 11:22 |
1 KỌRINT 11:23 |
1 KỌRINT 11:24 |
1 KỌRINT 11:25 |
1 KỌRINT 11:26 |
1 KỌRINT 11:27 |
1 KỌRINT 11:28 |
1 KỌRINT 11:29 |
1 KỌRINT 11:30 |
1 KỌRINT 11:31 |
1 KỌRINT 11:32 |
1 KỌRINT 11:33 |
1 KỌRINT 11:34 |
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 1 / 1KỌR 1 |
1 KỌRINT 2 / 1KỌR 2 |
1 KỌRINT 3 / 1KỌR 3 |
1 KỌRINT 4 / 1KỌR 4 |
1 KỌRINT 5 / 1KỌR 5 |
1 KỌRINT 6 / 1KỌR 6 |
1 KỌRINT 7 / 1KỌR 7 |
1 KỌRINT 8 / 1KỌR 8 |
1 KỌRINT 9 / 1KỌR 9 |
1 KỌRINT 10 / 1KỌR 10 |
1 KỌRINT 11 / 1KỌR 11 |
1 KỌRINT 12 / 1KỌR 12 |
1 KỌRINT 13 / 1KỌR 13 |
1 KỌRINT 14 / 1KỌR 14 |
1 KỌRINT 15 / 1KỌR 15 |
1 KỌRINT 16 / 1KỌR 16 |