1 |
Ụmụnna m, ka anyị hapụ ichefu ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nꞌime ọzara. Chineke ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nꞌetiti osimiri uhie gafee. |
2 |
A pụrụ ịsị na ọ bụ nꞌime igwe ojii ahụ na mmiri ahụ ha gafere ka e mere ha baptizim, nke mere ha ndị na-eso ụzọ Mosisi. |
3 |
Ha nile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ Chineke zitere. |
4 |
Ha ṅụkwara mmiri nke mmụọ ahụ, mmiri sitere nꞌoke nkume nke mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nꞌonwe ya. |
5 |
Ma mgbe Chineke mechaara ha ihe ndị a nile, ha nupụrụ isi nꞌebe Chineke nọ. Ọ bụ nnupụ isi a mere Chineke ji laa ha nꞌiyi nꞌime ọzara ahụ. |
6 |
Ihe dakwasịrị ha bụ ihe ịma atụ dịịrị anyị. Ọ bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dị ka ha. |
7 |
Ka anyị hapụkwa ịbụ ndị na-ekpere arụsị dị ka ụfọdụ ha mere. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụmụ Izirel nọdụrụ ala na-eri na-aṅụ, ha bilikwara ọtọ ite egwu nꞌihu ehi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.” |
8 |
Ihe mmụta ọzọ dịrị anyị bụ ihe dakwasịrị ha mgbe ụfọdụ nꞌime ha mere mmehie ịkwa iko. Ọ bụ iri puku mmadụ abụọ na atọ nꞌime ha nwụrụ nꞌotu ụbọchị ahụ. |
9 |
Ka anyị hapụ ịnwa Chineke ọnwụnwa dị ka ụfọdụ nꞌime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha. Ka anyị hapụkwa ịtamụ dị ka ụfọdụ ha tamụrụ megide Chineke. Chineke zitere mmụọ ozi ya ka o gbuo ha. |
10 |
*** |
11 |
Ihe ndị a nile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị, ka ọ bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị. Ka anyị hapụ ime ihe ndị a ha mere. E dekwara ihe dakwasịrị ha nꞌakwụkwọ ka anyị bụ ndị bi nꞌoge a ọgwụgwụ ụwa dị nso, site na ha mụta ihe. |
12 |
Ọ bụrụ na ị na-eche nꞌobi gị na ị nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, nꞌihi na ị pụrụ ịdabakwa na mmehie. |
13 |
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị. |
14 |
Bikonụ ụmụnna m, gbaaranụ ife arụsị ọ bụla ọsọ. |
15 |
Dị ka ndị nwere uche nke unu bụ, leenụ ihe ndị a anya matakwanụ ma ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu. |
16 |
Nꞌoge oriri nsọ, mgbe anyị na-arịọ Chineke ka ọ gọzie iko mmanya ahụ tupuu anyị aṅụọ ya, o gosighị na anyị ndị na-aṅụ ihe dị nꞌiko a kwere na ọ bụ ngọzi si nꞌọbara Kraịst ka anyị na-eketa? Mgbe anyị na-ata beredi anyị nyawara, ọ bụkwaghị uru nke ahụ Kraịst na-eweta ka anyị na-eketa? |
17 |
Ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu ogbe beredi ahụ ka anyị na-ata. Nke a na-egosi na anyị nile bụ akụkụ ahụ nke otu anụ ahụ Kraịst, onye bụ beredi ahụ. |
18 |
Otu a kwa ka ọ dị nꞌetiti ndị Juu. Ndị nile soro rie ihe e ji chụọ aja, bụ ndị e jikọtara nꞌotu site nꞌoriri ahụ. |
19 |
Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Ọ̀ bụ na arụsị ahụ ndị na-ekpere arụsị na-achụrụ aja bụ Chineke nꞌezie? Ka m na-ekwu na aja ha chụrụ bara uru ọ bụla? Tụfịakwa, nke a abụghị ihe m na-ekwu. |
20 |
Ihe m na-ekwu bụ na ndị nile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nꞌotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ, ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu mgbe unu so ha rie nri ahụ ha ji chụọra arụsị ha aja. |
21 |
Nꞌihi na mmadụ enweghị ike isoro rie oriri nsọ, sorokwa rie nri ekwensu. |
22 |
Gịnị ka unu na-achọ ime? Ọ̀ bụ ime ka iwe wee Chineke? Unu dị ike karịa ya? |
23 |
Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ime ihe nile, dị ka iri nri e ji chụọra arụsị aja, ma ọ bụghị ihe nile dị mma omume. Anyị nwekwara ike ime ihe nile, ma ọ bụghị ihe nile nwere ike inyere anyị aka. |
24 |
Ka anyị hapụ ịchọ ọdịmma nke anyị nanị, kama anyị ga na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ, ime ihe ga-enyere ha aka. |
25 |
Nke a bụ ihe i kwesịrị ime. Ọ bụrụ na ị gaa ahịa, zụrụ ụdị anụ ọ bụla ị chọrọ nke a na-ere nꞌahịa, ajụla ajụjụ ọ bụla ịmata ma e ji ya chụọra arụsị aja ma ọ dịghị, nꞌihi na ọsịsa ị ga-anata pụrụ iwute mmụọ gị. |
26 |
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụwa nile na ihe ọma nile dị nꞌime ya bụ nke Chineke. Ọ dịkwara anyị iji ha ime onwe anyị obi ụtọ.” |
27 |
Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ gị, sị gị bịa nꞌụlọ ya, gaa, riekwa nri ọ bụla e nyere gị na-ajụghị ajụjụ. Nꞌihi na ọsịsa ya pụrụ imerụ mmụọ gị. |
28 |
Ma ọ bụrụ na e nwee onye gwara gị sị, “E jikwa anụ a chụọra arụsị aja” erila ya, nꞌihi nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọ aja, na nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ ya ma i rie ya. |
29 |
Nꞌoge a ihe dị mkpa abụghị ihe i chere banyere anụ ahụ, kama ihe dị mkpa bụ ime ka mmụọ nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọra arụsị aja hapụ ịda mba. I nwere ike ịjụ ajụjụ sị, “Gịnị mere m ga-eji hapụ ime ihe ọ bụla nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ onye ọzọ? |
30 |
Ọ bụrụ na m nwere ike kelee Chineke ekele nꞌihi ya, were nri m rie, olee otu o si gbasa onye bịara ịjụ m ọnụ?” |
31 |
Ka m gwa gị ihe mere o ji dị mkpa. I kwesịrị ime ihe ọ bụla ị na-eme, ma ọ bụ iri nri ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ, i kwesịrị ime ihe nile nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Chineke otuto. |
32 |
Ya mere, ekwela ka ị bụrụ ihe ịsụ ngọngọ nye onye ọ bụla ma ọ bụ onye Juu, ma ọ bụ onye mba ọzọ, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke. |
33 |
Na-agbalịsinụ ike ime dị ka m si eme. Nꞌihe ọ ọ bụla m na-eme ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọ bụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m nanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 10:1 |
1 KỌRINT 10:2 |
1 KỌRINT 10:3 |
1 KỌRINT 10:4 |
1 KỌRINT 10:5 |
1 KỌRINT 10:6 |
1 KỌRINT 10:7 |
1 KỌRINT 10:8 |
1 KỌRINT 10:9 |
1 KỌRINT 10:10 |
1 KỌRINT 10:11 |
1 KỌRINT 10:12 |
1 KỌRINT 10:13 |
1 KỌRINT 10:14 |
1 KỌRINT 10:15 |
1 KỌRINT 10:16 |
1 KỌRINT 10:17 |
1 KỌRINT 10:18 |
1 KỌRINT 10:19 |
1 KỌRINT 10:20 |
1 KỌRINT 10:21 |
1 KỌRINT 10:22 |
1 KỌRINT 10:23 |
1 KỌRINT 10:24 |
1 KỌRINT 10:25 |
1 KỌRINT 10:26 |
1 KỌRINT 10:27 |
1 KỌRINT 10:28 |
1 KỌRINT 10:29 |
1 KỌRINT 10:30 |
1 KỌRINT 10:31 |
1 KỌRINT 10:32 |
1 KỌRINT 10:33 |
|
|
|
|
|
|
1 KỌRINT 1 / 1KỌR 1 |
1 KỌRINT 2 / 1KỌR 2 |
1 KỌRINT 3 / 1KỌR 3 |
1 KỌRINT 4 / 1KỌR 4 |
1 KỌRINT 5 / 1KỌR 5 |
1 KỌRINT 6 / 1KỌR 6 |
1 KỌRINT 7 / 1KỌR 7 |
1 KỌRINT 8 / 1KỌR 8 |
1 KỌRINT 9 / 1KỌR 9 |
1 KỌRINT 10 / 1KỌR 10 |
1 KỌRINT 11 / 1KỌR 11 |
1 KỌRINT 12 / 1KỌR 12 |
1 KỌRINT 13 / 1KỌR 13 |
1 KỌRINT 14 / 1KỌR 14 |
1 KỌRINT 15 / 1KỌR 15 |
1 KỌRINT 16 / 1KỌR 16 |