1 |
Ya mere, ikpe ọmụma ọ bụla adịkwaghị ugbu a nye ndị nile nọ nꞌime Jisọs Kraịst. |
2 |
Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị. |
3 |
A zọpụtaghị anyị nꞌihi na anyị debere iwu, nꞌihi na ọ dịghị mgbe anyị na-edebe ya, anyị enwekwaghị ike idebe ya. Ma Chineke sitere nꞌụzọ dị iche zọpụta anyị. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nꞌụdị anyị bụ mmadụ ka ọ laa ike nke mmehie nꞌiyi, site nꞌiji onwe ya chụọ aja nꞌihi mmehie anyị. |
4 |
Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ. |
5 |
Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ. |
6 |
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo. |
7 |
Nꞌihi na ọdịdị ochie dị nꞌime anyị na-ebu agha imegide Chineke. Ọ naghị erubere Chineke isi, ọ nakwaghị eme ihe Chineke na-achọ. |
8 |
Ya mere, ndị nile ọdịdị ochie ha na-achị, ndị na-eme ihe ọ chọrọ, enweghị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. |
9 |
Ma lee! Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke bi nꞌime unu na-achị ndụ ọhụrụ unu, unu agaghị emekwa uche ọdịdị ochie unu. Chetakwa na ọ bụrụ na Mmụọ Kraịst ebighị nꞌime gị, ị bụghị onye nke Kraịst. |
10 |
Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nꞌime gị, anụ ahụ gị ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma Mmụọ Nsọ bi nꞌime gị ga-enye gị ndụ, nꞌihi na o burularị ụzọ mee ka ị bụrụ onye ezi omume. |
11 |
Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke, onye mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie, bi nꞌime gị, ọ ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ ọzọ, mgbe ị nwụchara, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nꞌime gị. |
12 |
Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ. Ma ọ bụghị ọdịdị ochie anyị ka anyị ji ụgwọ ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee. |
13 |
Nꞌihi na ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe ọdịdị ochie anyị chọrọ, anyị ga-ala nꞌiyi. Kama ọ bụrụ na anyị esite nꞌike Mmụọ Chineke gwepịa, ma wezuga ọrụ ọjọọ nke anụ ahụ, anyị ga-adịkwa ndụ. |
14 |
Nꞌihi na ndị nile Mmụọ Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. |
15 |
Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị. |
16 |
Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie. |
17 |
Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya. |
18 |
Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị. |
19 |
Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya. |
20 |
Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na, |
21 |
otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha. |
22 |
Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ. |
23 |
Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ. |
24 |
A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a. |
25 |
Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ. |
26 |
Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ. |
27 |
Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ. |
28 |
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị. |
29 |
Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna. |
30 |
Ọ bụkwa ndị ahụ nile Chineke họpụtara, ka ọ kpọrọ ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, Chineke mere ka ha bụrụ ndị ya na ha dị na mma. Ọ gụrụ ha dị ka ndị na-emeghị mmehie ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ ndị gaeketa oke nꞌebube ahụ o kwere na nkwa. |
31 |
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ọma ndị a nile Chineke meere anyị. Ọ bụrụ na Chineke dịnyeere anyị, onye pụrụ iguzo megide anyị? |
32 |
Tulee ya nꞌonwe gị: Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, nke weere ya nye nꞌihi mmehie anyị, ọ̀ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị? |
33 |
Ònye pụrụ ịpụta nꞌihu Chineke boo anyị bụ ndị ya ọ họpụtara ebubo mmehie? Ònye ka ọ bụ? Chineke nꞌonwe ya ọ ga-ebo anyị ebubo nꞌihi mmehie anyị? Mba! Nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya gbaghaara anyị mmehie anyị, mee ka anyị na ya dị na mma. |
34 |
Mgbe ahụ, olee onye ọzọ nwere ike ịma anyị ikpe ọnwụ? Ọ̀ bụ Kraịst? Mba! Nꞌihi na Kraịst bụ onye ahụ nwụrụ nꞌihi anyị, ọ bụkwa onye ahụ e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, mee ka ọ nọọ nꞌaka nri Chineke, ebe ọ nọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. |
35 |
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba! |
36 |
Nꞌihi na akwụwkọ nsọ na-agwa anyị sị, “Ọ bụ nꞌihi gị, Chineke, ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị nile. A na-ele anyị anya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.” |
37 |
Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị. |
38 |
Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke. |
39 |
Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ROM 8:1 |
ROM 8:2 |
ROM 8:3 |
ROM 8:4 |
ROM 8:5 |
ROM 8:6 |
ROM 8:7 |
ROM 8:8 |
ROM 8:9 |
ROM 8:10 |
ROM 8:11 |
ROM 8:12 |
ROM 8:13 |
ROM 8:14 |
ROM 8:15 |
ROM 8:16 |
ROM 8:17 |
ROM 8:18 |
ROM 8:19 |
ROM 8:20 |
ROM 8:21 |
ROM 8:22 |
ROM 8:23 |
ROM 8:24 |
ROM 8:25 |
ROM 8:26 |
ROM 8:27 |
ROM 8:28 |
ROM 8:29 |
ROM 8:30 |
ROM 8:31 |
ROM 8:32 |
ROM 8:33 |
ROM 8:34 |
ROM 8:35 |
ROM 8:36 |
ROM 8:37 |
ROM 8:38 |
ROM 8:39 |
|
|
|
|
|
|
ROM 1 / ROM 1 |
ROM 2 / ROM 2 |
ROM 3 / ROM 3 |
ROM 4 / ROM 4 |
ROM 5 / ROM 5 |
ROM 6 / ROM 6 |
ROM 7 / ROM 7 |
ROM 8 / ROM 8 |
ROM 9 / ROM 9 |
ROM 10 / ROM 10 |
ROM 11 / ROM 11 |
ROM 12 / ROM 12 |
ROM 13 / ROM 13 |
ROM 14 / ROM 14 |
ROM 15 / ROM 15 |
ROM 16 / ROM 16 |