1 |
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs banyere ụgbọ mmiri gafee nꞌakụkụ nke ọzọ nke osimiri Galili. Aha ọzọ a na-akpọ osimiri Galili bụ osimiri Taịberias. |
2 |
Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya, nꞌihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ hụkwa otu o si agwọ ndị ọrịa. |
3 |
Nꞌihi nke a Jisọs rigoro nꞌelu ugwu nọdụ ala. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwara nọrọ ya gburugburu. |
4 |
Nꞌoge ihe ndị a na-eme mmemme oriri Ngabiga ndị Juu dị nso. |
5 |
Mgbe Jisọs leliri anya ya elu hụ igwe mmadụ dị ukwuu na-abịakwute ya ọ jụrụ Filip ajụjụ sị, “Ebee ka anyị ga-azụta nri ga-ezu ndị a?” |
6 |
Jisọs chọrọ ịmata ihe Filip ga-ekwu, nꞌihi na ọ maara ihe ọ na-ezube ime. |
7 |
Filip zara ya sị, “Olee otu nke a ga-esi mee? Ọ ga-efu ego dị ukwuu ịzụta nri nke onye ọ bụla nꞌime ha ga-eritụ nanị nri ntakịrị.” |
8 |
Anduru nwanne Saịmọn Pita tinyere ọnụ ya gwa Jisọs okwu sị, |
9 |
“Otu nwantakịrị nwoke nọ nꞌebe a. O nwere ogbe beredi ise na azụ abụọ. Ma gịnị ka a ga-eji nke a mee nꞌebe igwe mmadụ ha otu a dị?” |
10 |
Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu sị, “Gwanụ onye ọ bụla ka ọ nọdụ ala.” Ahịhịa juru nꞌebe ahụ. Ndị a nile nọdụrụ ala. Ha dị puku mmadụ ise! |
11 |
Jisọs weere beredi ndị a kelee Chineke ekele nꞌihi ha. O nyere ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ. Jisọs natakwara azụ abụọ ahụ nyekwa Chineke ekele nꞌihi ha. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara igwe mmadụ ndị a azụ ahụ. |
12 |
Onye ọ bụla riri nri tutuu afọ eju ya. Emesịa, Jisọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya iwu sị, “Tụtụkọtaanụ ibiribe beredi na azụ fọdụrụ, ka ihe ọ bụla ghara ịla nꞌiyi.” |
13 |
Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara ihe fọdụrụ. O juru nkata iri na abụọ. |
14 |
Mgbe ndị mmadụ a hụrụ ihe ebube a Jisọs mere, ha sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ onye amụma ahụ anyị naele anya ya!” |
15 |
Ma Jisọs matara ihe ha chọrọ ime. Ọ maara na ha chọrọ ijide ya mee ya eze ha nꞌike. Ọ hapụrụ ha gamie nꞌelu ugwu ahụ nanị ya. |
16 |
Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌebe ahụ pụọ gaa nꞌọnụ mmiri, |
17 |
ebe ha banyere nꞌụgbọ mmiri malite ịga nꞌọbodo Kapanọm, nke dị nꞌofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Nꞌoge a ọchịchịrị ebidola ịgba, ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha. |
18 |
Ọ dịghị anya mgbe ha banyesịrị nꞌụgbọ, oke ifufe bidoro ife. |
19 |
Mgbe ha nyaara ụgbọ mmiri ahụ na-aga, nꞌihe dị ka kilomita anọ ma ọ bụ ise site nꞌọnụ mmiri, ha lepụrụ anya hụ Jisọs ka ọ na-aga ije nꞌelu mmiri na-abịakwute ụgbọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Oke egwu tụrụ ha! |
20 |
Ma Jisọs kpọrọ ha sị, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m!” |
21 |
Ngwangwa ha kpọbatara ya nꞌime ụgbọ ahụ. Ọ dịkwaghị anya ha eruo ebe ha na-aga. |
22 |
Nꞌụtụtụ echi ya, igwe mmadụ zukọtara nꞌakụkụ mmiri ahụ Jisọs nọ nye ha nri. Ha chere na ha ga-ahụ Jisọs, nꞌihi na o soghị ndị na-eso ụzọ ya baa nꞌụgbọ mgbe ha bara nꞌụgbọ mmiri ụnyaahụ. |
23 |
Ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị ọzọ si Taịberias bịaruo ebe ahụ Onyenwe anyị nọ nye igwe mmadụ ahụ nri. |
24 |
Ma mgbe ndị a na-ahụghị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, ha banyere ụgbọ mmiri ọzọ kwọfee osimiri ahụ na-aga Kapanọm ịchọ Jisọs. |
25 |
Mgbe ha bịaruru Kapanọm, ha hụrụ Jisọs sị ya, “Nna anyị ukwu, olee ụzọ i si bịa nꞌebe a?” |
26 |
Jisọs zara sị ha, “Unu na-achọ m nꞌihi na m nyere unu nri, ọ bụghị nꞌihi na unu kweere na m. |
27 |
Unu atụkwasịla obi unu nꞌihe na-ala nꞌiyi dị ka nri, kama chọọnụ ndụ ebighị nke Nwa nke mmadụ na-enye. Nꞌihi na Chineke Nna zitere ya ime nke a.” |
28 |
Ha zara ya sị, “Gịnị ka anyị ga-eme nke ga-egosi na anyị na-arụ ọrụ Chineke?” |
29 |
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ otu ihe nanị, nke a bụkwa uche Chineke. Kwerenụ nꞌọnye ahụ Chineke zitere.” |
30 |
Ha zara sị ya, “Olee ihe ịrịba ama ị ga-egosi anyị nke ga-eme ka anyị kwere na gị? Gịnị ka ị ga-eme? |
31 |
Nna anyị ha riri mana mgbe ha jegharịrị nꞌọzara. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘O si nꞌeluigwe nye ha achịcha ha riri.’ ” |
32 |
Jisọs sịrị ha, “Ọ bụghị Mosisi nyere ha nri ahụ. Ọ bụ Nna m. Ugbu a Nna m na-enye unu ezi nri ahụ si nꞌelu bịa. |
33 |
Ezi nri a bụ Onye ahụ Chineke si nꞌelu zite. Ọ na-enye ụwa ndụ.” |
34 |
Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye anyị nri a ụbọchị nile.” |
35 |
Jisọs zaghachiri ha sị, “Abụ m nri na-enye ndụ. Onye ọ bụla na-abịakwute m agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ndị nile kweere na m nkụ. |
36 |
Dị ka m gwara unu, unu ahụla m ma unu ekweghị. |
37 |
Ma ụfọdụ ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa ndị nile Nna m nyere m ma ha bịakwute m. |
38 |
Nꞌihi na esi m nꞌelu bịa nꞌụwa. Abịara m ime uche Chineke onye zitere m, ọ bụghị ime uche nke aka m. |
39 |
Nke a bụ uche Chineke, ọ dịghị onye ọ bụla o nyere m ga-efu efu. Kama aga m eme ka onye ahụ si nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ. |
40 |
Nꞌihi na nke a bụ uche Chineke. Onye ọ bụla hụrụ Ọkpara ya, kwerekwa na ya, ga-enwe ndụ ebighị ebi. Aga m eme ka o site nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ!” |
41 |
Ndị Juu bidoro ịtamụ ntamụ megide ya nꞌihi na ọ sịrị na ya bụ nri ahụ si nꞌelu bịa. |
42 |
Ha sịrịtara onwe ha, “Ònye a ọ bụghị Jisọs nwa Josef? Ọ̀ bụ na anyị amaghị nne ya na nna ya? Gịnị ka ọ na-ekwu, na o si nꞌelu bịa?” |
43 |
Jisọs sịrị ha, “Unu atamụla nꞌime onwe unu. Nꞌihi na mmadụ ọ bụla enweghị ike ịbịakwute m karịakwa ma Nna m onye zitere m, mere ka ọ bịakwute m. Nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ, aga m emekwa ka ndị ọ bụla bịakwutere m si nꞌọnwụ bilie. |
44 |
*** |
45 |
E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘A ga-akụziri mmadụ nile ihe banyere Chineke.’ Onye ọ bụla Chineke gwara okwu, nke mụtakwara eziokwu ahụ site nꞌaka Chineke ga-abịakwute m. |
46 |
Nke a apụtaghị na onye ọ bụla ahụla Nna m anya. Ọ bụ nanị m hụrụ ya, nꞌihi na ọ bụ site nꞌebe ọ nọ ka m si bịa. |
47 |
“Nꞌezie asị m unu, onye ọ bụla kweere na m nwere ndụ ebighị ebi. |
48 |
Nꞌezie abụ m nri na-enye ndụ. |
49 |
Nna nna unu ha riri mana, nri ahụ pụrụ iche Chineke nyere ha nꞌime ọzara, ma ha mesịrị nwụọ. |
50 |
Ma nri a, nke si nꞌelu bịa, na-enye onye ọ bụla na-eri ya ndụ ebighị ebi. |
51 |
Abụ m nri na-enye ndụ nke si nꞌelu bịa. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nri nke m na-enye bụ anụ ahụ m, nke e nyere maka ịgbapụta ụwa nile.” |
52 |
Ndị Juu rụrịtara ụka nꞌetiti onwe ha na-asị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị taa?” |
53 |
Ma Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie asị m unu, ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ, ṅụọkwa ọbara m, unu agaghị enwe ndụ ebighị ebi. |
54 |
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ. |
55 |
Anụ ahụ m bụ ezi nri ahụ. Ọbara m bụkwa ezi ihe ọṅụṅụ. |
56 |
Onye ọ bụla na-eri anụ ahụ, ma na-aṅụkwa ọbara m ga-anọgide nꞌime m. Mụ onwe m gaanọkwa nꞌime ya. |
57 |
Ana m adị ndụ site nꞌike Nna dị ndụ, onye zitere m. Otu aka ahụ, ndị nile na-eri anụ ahụ m ga-adịkwa ndụ site nꞌike nke m gaenye ha. |
58 |
Abụ m ezi nri ahụ si nꞌelu bịa. Nri a abụghị ụdị nke nna nna unu ha riri nwụọ. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” |
59 |
Na Kapanọm ka Jisọs nọ kwuo ihe ndị a. Ebe ahụ ka ọ nọkwa kuziere ndị mmadụ okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere ndị Juu. |
60 |
Ọtụtụ ndị na-eso ya bụ ndị gere ntị nꞌokwu ndị a kwuru sị, “Okwu ndị a siri ike ịghọta. Ònye nwere ike ịkọwa ihe ha pụtara?” |
61 |
Ma Jisọs nꞌọnwe ya matara nꞌime onwe ya na ndị na-eso ụzọ ya naatamụ ntamụ nꞌetiti onwe ha banyere ozizi ya. Ya mere ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Okwu ndị a o mere ka obi jọọ unu njọ?” |
62 |
Ọ gwakwara ha sị, “Gịnị ka unu ga-ekwu mgbe unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-alaghachi nꞌeluigwe? |
63 |
Ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ na-enye ndụ, ike mmadụ abaghị uru ọ bụla. Okwu ndị a nile m gwara unu bụ Mmụọ na ndụ. |
64 |
Ma ụfọdụ nꞌime unu ekwenyeghị.” Nꞌihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ na-ekwereghị. Ọ matakwara onye ahụ ga-arara ya nye. |
65 |
Ya mere ọ gwakwara ha okwu sị, “Ọ bụ nke a mere m ji gwa unu okwu sị, ọ dịghị onye ọ bụla ga-abịakwute m ma ọ bụghị na Nna m mere ka ọ bịakwute m.” |
66 |
Site nꞌoge a ọtụtụ nꞌime ndị na-eso ya kwụsịrị iso ya. Ha esokwaghị ya na-agagharị ebe nile ọ na-aga. |
67 |
Ma Jisọs tụgharịrị jụọ mmadụ iri na abụọ ahụ ọ họpụtara ajụjụ sị ha, “Ùnu chọkwara ịlaghachi azụ dị ka ndị ọzọ mere?” |
68 |
Saịmọn Pita zara sị, “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? Ọ bụ nanị nꞌaka gị ka okwu ahụ na-enye ndụ ebighị ebi dị. |
69 |
Anyị kweere okwu gị, marakwa na ị bụ Onye Nsọ ahụ Chineke zitere.” |
70 |
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu dị ndị ozi iri na abụọ m họpụtara, ma nꞌime unu e nwere otu onye bụ nwa ekwensu!” |
71 |
Jisọs na-ekwu ihe banyere Judas nwa Iskarịọt onye ahụ ga-arara ya nye nꞌaka ndị ga-egbu ya.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JỌN 6:1 |
JỌN 6:2 |
JỌN 6:3 |
JỌN 6:4 |
JỌN 6:5 |
JỌN 6:6 |
JỌN 6:7 |
JỌN 6:8 |
JỌN 6:9 |
JỌN 6:10 |
JỌN 6:11 |
JỌN 6:12 |
JỌN 6:13 |
JỌN 6:14 |
JỌN 6:15 |
JỌN 6:16 |
JỌN 6:17 |
JỌN 6:18 |
JỌN 6:19 |
JỌN 6:20 |
JỌN 6:21 |
JỌN 6:22 |
JỌN 6:23 |
JỌN 6:24 |
JỌN 6:25 |
JỌN 6:26 |
JỌN 6:27 |
JỌN 6:28 |
JỌN 6:29 |
JỌN 6:30 |
JỌN 6:31 |
JỌN 6:32 |
JỌN 6:33 |
JỌN 6:34 |
JỌN 6:35 |
JỌN 6:36 |
JỌN 6:37 |
JỌN 6:38 |
JỌN 6:39 |
JỌN 6:40 |
JỌN 6:41 |
JỌN 6:42 |
JỌN 6:43 |
JỌN 6:44 |
JỌN 6:45 |
JỌN 6:46 |
JỌN 6:47 |
JỌN 6:48 |
JỌN 6:49 |
JỌN 6:50 |
JỌN 6:51 |
JỌN 6:52 |
JỌN 6:53 |
JỌN 6:54 |
JỌN 6:55 |
JỌN 6:56 |
JỌN 6:57 |
JỌN 6:58 |
JỌN 6:59 |
JỌN 6:60 |
JỌN 6:61 |
JỌN 6:62 |
JỌN 6:63 |
JỌN 6:64 |
JỌN 6:65 |
JỌN 6:66 |
JỌN 6:67 |
JỌN 6:68 |
JỌN 6:69 |
JỌN 6:70 |
JỌN 6:71 |
|
|
|
|
|
|
JỌN 1 / JỌN 1 |
JỌN 2 / JỌN 2 |
JỌN 3 / JỌN 3 |
JỌN 4 / JỌN 4 |
JỌN 5 / JỌN 5 |
JỌN 6 / JỌN 6 |
JỌN 7 / JỌN 7 |
JỌN 8 / JỌN 8 |
JỌN 9 / JỌN 9 |
JỌN 10 / JỌN 10 |
JỌN 11 / JỌN 11 |
JỌN 12 / JỌN 12 |
JỌN 13 / JỌN 13 |
JỌN 14 / JỌN 14 |
JỌN 15 / JỌN 15 |
JỌN 16 / JỌN 16 |
JỌN 17 / JỌN 17 |
JỌN 18 / JỌN 18 |
JỌN 19 / JỌN 19 |
JỌN 20 / JỌN 20 |
JỌN 21 / JỌN 21 |