1 |
“Ana m agwa unu ihe ndị a nile ka unu ghara ịda mba nꞌokwukwe unu. |
2 |
Ha ga-esite nꞌụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ha ga-egbu unu. Ha gaechekwa na ha na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a. |
3 |
Ha ga-eme ihe ndị a nꞌihi na ha amaghị Nna m, na mụ onwe m. |
4 |
Ma agwara m unu ihe ndị a ka unu hapụ ichefu okwu ndị a mgbe ihe ndị a ga-eme. Agwaghị m unu na mmalite nꞌihi na mụ na unu nọ nꞌoge ahụ. |
5 |
“Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ana m ala ebe m siri bịa. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nꞌetiti unu jụrụ m sị, ‘Olee ebe ị naaga?’ |
6 |
Ma nꞌihi na m gwara unu okwu ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. |
7 |
Nꞌezie, ọ dị mkpa ka m hapụ unu laa. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye nkasịobi ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. |
8 |
“Mgbe ọ bịara ọ ga-ama ụwa ikpe mmehie. Ọ ga-akọwara ha ezi omume nke Chineke. Ọ ga-agwakwa ha ihe banyere ikpe nke Chineke. |
9 |
Ọ ga-ama ha ikpe mmehie nꞌihi na ha ekwenyeghị na m. |
10 |
Ọ ga-akọwara ha ihe banyere ezi omume Chineke nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Ma unu agaghị ahụkwa m ọzọ. |
11 |
Ọ ga-akọwara ha banyere ikpe Chineke, nꞌihi na e kpeela onye na-achị ụwa a bụ ekwensu ikpe. |
12 |
“Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a o siiri unu ike ịnabata ha. |
13 |
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime. |
14 |
Ọ ga-enye m otuto, nꞌihi na ọ ga-anata ihe nile site nꞌaka m. Ihe ndị a nile ka ọ ga-ezikwa unu. |
15 |
Ihe nile Nna m nwe bụ nke m. Nke a mere m ji sị na ọ ga-ezi unu ihe nile m ga-agwa ya. |
16 |
Ọ fọdụrụ nwa oge ugbu a unu agaghị ahụkwa m anya ọzọ. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ. Nke a bụ nꞌihi na ana m alakwuru Nna m.” |
17 |
Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị ka okwu dị otu a pụtara? Gịnị ka o bu nꞌobi mgbe ọ na-asị, ‘Ana m alakwuru Nna m?’ Nke a edoghị anyị anya.” |
18 |
Ndị ọzọ sịkwara, “Gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ọ̀ fọdụrụ nwantịị unu agaghị ahụ m anya ọzọ ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, unu ga-ahụkwa m anya?’ ” |
19 |
Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru? |
20 |
Nꞌezie, unu ga-akwa akwa tie aka nꞌobi na mwute. Ma ndị ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma mgbe iru uju unu gafesịrị unu ga-aṅụrị ọṅụ. |
21 |
Mgbe nwanyị dị ime na-achọ ịmụ nwa, ọ naanọ nꞌọnọdụ mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nꞌihi na ọ mụpụtala nwa nwoke ya. |
22 |
Unu nọ nꞌọnọdụ iru uju ugbu a. Ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, aga m ahụ unu anya ọzọ. Mgbe ahụ unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mmadụ ọ bụla apụkwaghị ịnapụ unu ọṅụ unu mgbe ahụ. |
23 |
Mgbe ụbọchị ahụ ga-erukwa, ọ dịghị ihe ga-adị unu mkpa. Ọ dịkwaghị ihe unu ga-arịọ nꞌaka m. Unu ga-ajụ Nna m ihe nile. Ọ ga-enyekwa unu nꞌihi na unu na-arịọ ha nꞌaha m. |
24 |
Ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nꞌaha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka ọṅụ unu zuokwa oke. |
25 |
“Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m naagaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu nile ihe banyere Nna m nꞌụzọ unu gaaghọta ya. |
26 |
Nꞌụbọchị ahụ, unu ga-esite nꞌaka m rịọ Nna m ihe nile. Ọ gaghị adịkwa mkpa na m ga-agwa Nna m ka o meere unu ihe unu chọrọ. |
27 |
Nꞌihi na Nna m nꞌonwe ya hụrụ unu nꞌanya. Ọ hụrụ unu nꞌanya nꞌihi na unu hụrụ m nꞌanya kwerekwa na m si nꞌebe Chineke nọ bịa. |
28 |
Esi m nꞌebe Nna m nọ pụta, bịa nꞌime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna m.” |
29 |
Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Lee! Ugbu a ka okwu gị doro anya! Ọ bụkwaghị ilu ka i ji ekwu okwu. |
30 |
Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe nile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọ bụla gwa gị ihe ọ bụla. Nꞌihi nke a anyị kweere na i si nꞌebe Chineke nọ bịa.” |
31 |
Jisọs jụrụ ha sị, “Unu ekwerela ugbu a? |
32 |
Lee! Oge na-abịa, nꞌezie oge ahụ eruola mgbe a ga-eme ka unu gbasasịa. Onye ọ bụla nꞌụzọ nke aka ya. Mgbe ahụ unu ga-ahapụ nanị m. Ma ọ bụghị nanị m ga-anọ nꞌihi na mụ na Nna m ga-anọ. |
33 |
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JỌN 16:1 |
JỌN 16:2 |
JỌN 16:3 |
JỌN 16:4 |
JỌN 16:5 |
JỌN 16:6 |
JỌN 16:7 |
JỌN 16:8 |
JỌN 16:9 |
JỌN 16:10 |
JỌN 16:11 |
JỌN 16:12 |
JỌN 16:13 |
JỌN 16:14 |
JỌN 16:15 |
JỌN 16:16 |
JỌN 16:17 |
JỌN 16:18 |
JỌN 16:19 |
JỌN 16:20 |
JỌN 16:21 |
JỌN 16:22 |
JỌN 16:23 |
JỌN 16:24 |
JỌN 16:25 |
JỌN 16:26 |
JỌN 16:27 |
JỌN 16:28 |
JỌN 16:29 |
JỌN 16:30 |
JỌN 16:31 |
JỌN 16:32 |
JỌN 16:33 |
|
|
|
|
|
|
JỌN 1 / JỌN 1 |
JỌN 2 / JỌN 2 |
JỌN 3 / JỌN 3 |
JỌN 4 / JỌN 4 |
JỌN 5 / JỌN 5 |
JỌN 6 / JỌN 6 |
JỌN 7 / JỌN 7 |
JỌN 8 / JỌN 8 |
JỌN 9 / JỌN 9 |
JỌN 10 / JỌN 10 |
JỌN 11 / JỌN 11 |
JỌN 12 / JỌN 12 |
JỌN 13 / JỌN 13 |
JỌN 14 / JỌN 14 |
JỌN 15 / JỌN 15 |
JỌN 16 / JỌN 16 |
JỌN 17 / JỌN 17 |
JỌN 18 / JỌN 18 |
JỌN 19 / JỌN 19 |
JỌN 20 / JỌN 20 |
JỌN 21 / JỌN 21 |