1 |
“Mụ onwe m bụ ezi osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye nlekọta ọrụ ubi. |
2 |
Ọ na-egbuda alaka ọ bụla dị nꞌime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-ewewpụ ihe nile naeme ka ọ hapụ ịmi mkpụrụ nke ọma, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. |
3 |
Ugbu a e meela ka unu dịrị ọcha site nꞌokwu nile m gwara unu. |
4 |
Ọ bụrụ na unu anọgide nꞌime m, mụ onwe m kwa ga-anọgide nꞌime unu. Alaka ọ bụla apụghị ịmị mkpụrụ nꞌọnwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nꞌosisi vaịnị ahụ. Otu a, unu apụkwaghị ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na mụ onwe m anọghị nꞌime unu. |
5 |
“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ nꞌezie. Unu onwe unu bụkwa alaka nke m. Onye ọ bụla na-anọgide nꞌime m, ma mụ onwe m kwa nꞌime ya, na-amị mkpụrụ nke ukwuu. Nꞌihi na e wezụga m, unu enweghị ike ime ihe ọ bụla. |
6 |
Onye ọ bụla na-adịghị anọgide nꞌime m abaghị uru ọ bụla nye m. A na-atụpụkwa ya nꞌezi ka ọ kpọnwụọ, dị ka alaka osisi e gbuturu egbutu. Ọ bakwaghị uru ọzọ ma ọ bụghị ka e tinye ya nꞌọkụ, ka o ree ọkụ. |
7 |
Ma ọ bụrụ na unu na-anọgide nꞌime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide nꞌime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ nꞌaha m, a ga-emekwara unu ya. |
8 |
Ọ bụrụ na unu amịa mkpụrụ, a ga-esite na mkpụrụ ahụ nye Nna m otuto. Nꞌụzọ dị otu a ka unu ga-eji bụrụ ndị na-eso ụzọ m. |
9 |
“Dị ka Nna m si hụ m nꞌanya otu a ka m si hụkwa unu nꞌanya. Ya mere nọgidenụ nꞌime ịhụnanya m. |
10 |
Unu ga-anọgide nꞌịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Mụ onwe m na-anọgidekwa nꞌịhụnanya nke Nna m nꞌihi na m naedebe ihe nile o nyere nꞌiwu. |
11 |
Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m zuo oke nꞌime unu, ka ọṅụ unu zuokwa oke. |
12 |
Nke a bụkwa iwu m na-enye unu: hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya. |
13 |
Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya. |
14 |
Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. |
15 |
Malite ugbu a, agaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nꞌihi na ohu adịghị amazu ihe nile onyenwe ya na-achọ ime. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nꞌihi na ihe nile Nna m naezube ka m gwara unu. |
16 |
“Ọ bụkwaghị unu onwe unu họpụtara m. Ọ bụ m họpụtara unu ka unu baa nꞌime ụwa mịa mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgide. Ya mere, ọ bụrụ na unu arịọọ Nna m ihe ọ bụla site nꞌaha m, Nna m ga-enye unu ihe nile unu rịọrọ. |
17 |
Ma nke a bụ iwu m nyere unu. Hụnụ onwe unu nꞌanya. |
18 |
Unu echegbula onwe unu ma ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị. Chetanụ na ụwa buru ụzọ kpọọ m asị tupuu ọ kpọọ unu asị. |
19 |
A sịkwarị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nꞌanya. Ma ugbu a unu abụghị nke ụwa. Nꞌihi na mụ onwe m si nꞌime ụwa kpọpụta unu. Ọ bụkwa nꞌihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. |
20 |
Unu chetakwa ihe m gwara unu malite na mbụ, na ohu adịghị ukwuu karịa onyenwe ya. Nꞌihi nke a ebe ụwa kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ha agaghị erube isi nꞌokwu unu, nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌihe m ziri ha. |
21 |
Ee, ha ga-eme unu ihe nile ndị a nꞌihi na unu bụ ndị nke m, na nꞌihi na ha amaghị Onye ahụ zitere m. |
22 |
“Ọ bụrụ na abịaghị m nꞌụwa, ikpe agaraghị ama ha. Ma ugbu a abịala m gwa ha okwu ndị a nile. Ya mere, ha enweghị agụgọ ọ bụla. |
23 |
Onye ọ bụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. |
24 |
A sị na ọrụ nile m rụrụ nꞌetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọ bụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu ha ahụzuola ọrụ ịrịba ama ndị a nile, ma ha nọgidekwara naakpọ mụ na Nna m asị. |
25 |
Ma mmeso ndị a nile emeela ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ha akpọọla m asị, ma emeghị m ha ihe ọjọọ ọ bụla.’ |
26 |
“Ma Onye ndụmọdụ ahụ ga-abịa, Onye ahụ bụ Mmụọ eziokwu ahụ, Onye ga-esite nꞌebe Nna m nọ bịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwara unu ihe nile banyere m. |
27 |
Ma unu onwe unu aghaghị ịgwakwa mmadụ nile ihe banyere m, nꞌihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JỌN 15:1 |
JỌN 15:2 |
JỌN 15:3 |
JỌN 15:4 |
JỌN 15:5 |
JỌN 15:6 |
JỌN 15:7 |
JỌN 15:8 |
JỌN 15:9 |
JỌN 15:10 |
JỌN 15:11 |
JỌN 15:12 |
JỌN 15:13 |
JỌN 15:14 |
JỌN 15:15 |
JỌN 15:16 |
JỌN 15:17 |
JỌN 15:18 |
JỌN 15:19 |
JỌN 15:20 |
JỌN 15:21 |
JỌN 15:22 |
JỌN 15:23 |
JỌN 15:24 |
JỌN 15:25 |
JỌN 15:26 |
JỌN 15:27 |
|
|
|
|
|
|
JỌN 1 / JỌN 1 |
JỌN 2 / JỌN 2 |
JỌN 3 / JỌN 3 |
JỌN 4 / JỌN 4 |
JỌN 5 / JỌN 5 |
JỌN 6 / JỌN 6 |
JỌN 7 / JỌN 7 |
JỌN 8 / JỌN 8 |
JỌN 9 / JỌN 9 |
JỌN 10 / JỌN 10 |
JỌN 11 / JỌN 11 |
JỌN 12 / JỌN 12 |
JỌN 13 / JỌN 13 |
JỌN 14 / JỌN 14 |
JỌN 15 / JỌN 15 |
JỌN 16 / JỌN 16 |
JỌN 17 / JỌN 17 |
JỌN 18 / JỌN 18 |
JỌN 19 / JỌN 19 |
JỌN 20 / JỌN 20 |
JỌN 21 / JỌN 21 |