1 |
“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m. |
2 |
Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha. |
3 |
Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ. |
4 |
Unu maara nke ọma ebe m na-aga.” |
5 |
Ma Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?” |
6 |
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. |
7 |
Ọ bụrụ na ị maara onye m bụ, ị ga-amatakwa Nna m. Site taa unu amatala ya. Unu ahụkwala ya.” |
8 |
Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị ọ bụrụ na i zi anyị Nna ahụ afọ ga-eju anyị.” |
9 |
Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’ |
10 |
Ọ bụ na i kweghị na m nọ nꞌime Nna m, na Nna m nọkwa nꞌime m? Okwu nile m na-ekwu esitekwaghị nꞌebe m nọ pụta. Ha bụ okwu nke Nna m. Nna m bi nꞌime m na-arụkwa ọrụ ya nꞌọnwe ya. |
11 |
Kwere ihe m gwara gị. Ebi m nꞌime Nna m, Nna m bikwa nꞌime m. Ọ bụrụ na i kwereghị okwu ọnụ m, kwere nꞌihi ọrụ ndị a nile m na-arụ. |
12 |
“Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. |
13 |
Ihe ọ bụla unu gaarịọ site nꞌaha m, aga m enye unu ya. Aga m enye ya ka e site na ya nye Nna m otuto nꞌihi ihe Ọkpara ya na-eme. |
14 |
Ihe ọ bụla unu rịọrọ nꞌaha m, aga m eme ya. |
15 |
“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. |
16 |
Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu. |
17 |
Ndị bi nꞌụwa agaghị anabata ya, nꞌihi na ha apụghị ịhụ ya anya. Ha amakwaghị ya. Ma unu onwe unu maara ya, nꞌihi na unu na ya nọ ugbu a. O bikwa nꞌime unu. |
18 |
Agaghị m ahapụ unu ka unu nọdụ nanị unu. Aga m abịakwutekwa unu. |
19 |
Na mgbe na-adịghị anya site ugbu a, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu onwe unu ga-ahụ m anya. Nꞌihi na m na-adị ndụ unu onwe unu gaadịkwa ndu. |
20 |
Mgbe ụbọchị ahụ bịara, ihe nile ga-edo unu anya. Unu ga-amata na m nọ nꞌime Nna m na unu nọkwa nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime unu. |
21 |
Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.” |
22 |
Judas (ọ bụghị nke raara ya nye) sịrị ya, “Onyenwe ayị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?” |
23 |
Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m nꞌanya, ọ ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nꞌanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nꞌebe onye ahụ nọ soro ya biri. |
24 |
Onye na-ahụghị m nꞌanya agaghị edebe okwu m. Okwu nile unu nụrụ nꞌọnụ m abụghị nke m. Ha bụ okwu Nna m, onye zitere m. |
25 |
Agwala m unu ihe ndị a ugbu a mụ na unu nọ. |
26 |
Ma Onye nkasịobị ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nꞌaha m, ga-ezi unu ihe nile. Ọ gaechetara unu ihe nile m gwara unu. |
27 |
“Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. |
28 |
Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m. |
29 |
Ana m agwa unu ihe ndị a mgbe ihe ọ bụla na-emebeghị, ka ọ bụrụ na mgbe o mere unu ga-enwe okwukwe. |
30 |
“Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nꞌihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. Ọ nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe m nọ. |
31 |
Ọ na-abịa ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nꞌanya. Ka ụwa matakwa na m na-eme ihe Nna m nyere m nꞌiwu ime. Bilienụ ka anyị si nꞌebe a pụọ.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JỌN 14:1 |
JỌN 14:2 |
JỌN 14:3 |
JỌN 14:4 |
JỌN 14:5 |
JỌN 14:6 |
JỌN 14:7 |
JỌN 14:8 |
JỌN 14:9 |
JỌN 14:10 |
JỌN 14:11 |
JỌN 14:12 |
JỌN 14:13 |
JỌN 14:14 |
JỌN 14:15 |
JỌN 14:16 |
JỌN 14:17 |
JỌN 14:18 |
JỌN 14:19 |
JỌN 14:20 |
JỌN 14:21 |
JỌN 14:22 |
JỌN 14:23 |
JỌN 14:24 |
JỌN 14:25 |
JỌN 14:26 |
JỌN 14:27 |
JỌN 14:28 |
JỌN 14:29 |
JỌN 14:30 |
JỌN 14:31 |
|
|
|
|
|
|
JỌN 1 / JỌN 1 |
JỌN 2 / JỌN 2 |
JỌN 3 / JỌN 3 |
JỌN 4 / JỌN 4 |
JỌN 5 / JỌN 5 |
JỌN 6 / JỌN 6 |
JỌN 7 / JỌN 7 |
JỌN 8 / JỌN 8 |
JỌN 9 / JỌN 9 |
JỌN 10 / JỌN 10 |
JỌN 11 / JỌN 11 |
JỌN 12 / JỌN 12 |
JỌN 13 / JỌN 13 |
JỌN 14 / JỌN 14 |
JỌN 15 / JỌN 15 |
JỌN 16 / JỌN 16 |
JỌN 17 / JỌN 17 |
JỌN 18 / JỌN 18 |
JỌN 19 / JỌN 19 |
JỌN 20 / JỌN 20 |
JỌN 21 / JỌN 21 |