1 |
Nꞌụbọchị Satọde, nke bụ ụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌubi a kụrụ ọka gafee. Mgbe ha na-agafe, ndị na-eso Jisọs ghọọrọ ụfọdụ ọka taa. |
2 |
Ma mgbe ha na-eme nke a, ụfọdụ ndị Farisii hụrụ ha, tie mkpu sị, “Gịnị mere unu ji na-emebi iwu? Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nꞌụbọchị izuike?” |
3 |
Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu agụtaghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru na Devidi mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya? |
4 |
Ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke were beredi e nyere Chineke dị ka onyinye taa, nyekwa ndị so ya ka ha taa. Ma ọ dịghị onye ọzọ kwesịrị iri achịcha ahụ karịakwa ndị nchụaja.” |
5 |
Mgbe ahụ Jisọs gwakwara ha okwu sị ha, “Ọ bụ Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike nꞌihi na ọ bụ ya bụ Onyenwe ụbọchị izuike!” |
6 |
Nꞌụbọchị Satọde ọzọ, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu bido na-ezi okwu Chineke. Nꞌụlọ ahụ, otu nwoke nọ ya, onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. |
7 |
Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ na-ele Jisọs anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma ọ ga-agwọ nwoke ahụ nꞌụbọchị izuike ka ha site na ya nweta ebubo ha ga-ebo ya. |
8 |
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo. |
9 |
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị nọ nꞌebe ahụ okwu sị, “Achọrọ m ịjụ unu otu ajụjụ: o ziri ezi ime ihe ọma nꞌụbọchị izuike ka iwu ọ sị anyị mee ihe ọjọọ nꞌụbọchị izuike? O ziri ezi ịzọpụta mmadụ nꞌụbọchị izuike ka ọ ka mma ịla ndụ mmadụ nꞌiyi nꞌụbọchị ahụ?” |
10 |
Mgbe ahụ Jisọs lere anya gburugburu nꞌiwe sị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Setịpụ aka gị.” Mgbe nwoke ahụ setịpụrụ aka ya, ọ dịkwara ya mma ọzọ. |
11 |
Mgbe ndị iro Jisọs hụrụ ihe Jisọs mere, ọnụma jupụtara ha obi. Ha zukọtara ikwu otu ha ga-esi jide Jisọs, gbuo ya. |
12 |
Mgbe ọzọ kwa, Jisọs gara rigoro nꞌelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọgidere nꞌebe ahụ abalị nile. |
13 |
Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị nile na-eso ụzọ ya, site nꞌime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. |
14 |
Ndị a bụ aha ndị ọ họpụtara, Saimọn, (onye ọ gụgharịrị Pita) na Anduru nwanne ya, Jemes na Jọn, Filip na Batalomiu. |
15 |
Matiu na Tọmọs, Jemes nwa Alfiọs na Saimọn onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom. |
16 |
Na Judas nwanne Jemes, na Judas Isikariọt, nwoke ahụ mesịrị rara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya. |
17 |
Emesịa, Jisọs na ndị ozi iri na abụọ ahụ si nꞌugwu ahụ rịdata. Na ndịda ugwu ebe ha guzo, ọtụtụ ndị na-eso Jisọs gbara ha gburugburu, ha na ndị nile si Judia, Jerusalem, na obodo Taịa na Saidọn bịa ịnụ ihe Jisọs na-ekwu, na ndị bịara ka Jisọs gwọọ ha. |
18 |
Jisọs chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ site nꞌime ndị ha na-esogbu. |
19 |
Ọtụtụ mmadụ nꞌime igwe ndị ahụ gbara ya gburugburu gbalịrị imetụ ya ka, nꞌihi na ike dị ukwuu si Jisọs nꞌahụ na-apụ na-eme ka ahụ dị ndị ọrịa nile metụrụ ya aka mma. |
20 |
Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu. |
21 |
“Lee obi ụtọ dịrị unu, unu ndị agụụ na-agụ nꞌihi na afọ ga-eju unu. Leekwa obi ụtọ dị na-eche unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, na mgbe a na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-asịkwa na unu bụ ajọ mmadụ nꞌihi na unu na-eso m |
22 |
*** |
23 |
Nụrịanụ ọṅụ mgbe ihe ndị a na-adakwasị unu, teekwanụ egwu ọṅụ, nꞌihi na ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Nꞌihi na ọ bụkwa otu a ka nna nna ha siri meso ndị amụma. |
24 |
“Ma lee ka ahụhụ na-eche ndị ọgaranya siri dị ukwuu! Nꞌihi na ha eketala oke ọṅụ ha nꞌụwa a. |
25 |
Oke ahụhụ dịkwa na-eche ndị ọgaranya nꞌihi afọ ojuju nke ha na-enwe ugbu a, agụụ ga-agụkwa ha. Ha na-achị ọchị ugbu a, ma ha ga-akwa akwa, tie aka nꞌobi nꞌiru uju. |
26 |
Lee ka ahụhụ si na-eche ndị ahụ ụmụ mmadụ na-eto, ndị ha na-ekwu okwu ọma banyere. Nꞌihi na site na mgbe ochie ọ bụ ndị amụma ụgha ka a na-eto otuto. |
27 |
“Geenụ ntị nꞌihe m chọrọ ikwu, unu nile nọ nꞌebe a ugbu a. Hụnụ ndị iro unu nꞌanya, meekwaranụ ndị na-akpọ unu asị ihe ọma. |
28 |
Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere. |
29 |
“Ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị. |
30 |
Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya, hapụrụ ya ihe ahụ. |
31 |
Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu. |
32 |
“Ọ bụrụ nanị ndị na-ahụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, unu atụkwala anya na Chineke ga-asị na unu mere nke ọma, nꞌihi na ndị mmehie na-ahụkwa ndị hụrụ ha nꞌanya nꞌanya. |
33 |
Ọ bụrụkwa nanị ndị na-enyere unu aka ka unu na-enyere aka, obi ò ga-atọ Chineke ụtọ nꞌebe unu nọ? É, è. Nꞌihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka. |
34 |
Ọ bụrụkwa nanị onye nwere ike ịkwụghachi unu ka unu na-agbazinye ihe, ụdị ihe ọma a abụghị nke e kwesịrị ikele unu ekele nꞌihi ya, nꞌihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmadụ ego, ka onye ha gbazinyere kwụghachikwa ha. |
35 |
“Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere. |
36 |
“Ya mere, nweenụ obi ebere dị ka nna unu bi nꞌeluigwe si enwe obi ebere. |
37 |
“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. Amala ndị ozọ ikpe ka a ghara ima unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu. |
38 |
Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.” |
39 |
Mgbe ahụ Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Onye ìsì enweghị ike idu onye ìsì ibe ya, nihi na ha abụọ ga-adaba nꞌime olulu. |
40 |
Nwanta akwụkwọ enweghị oge ọ ga-ama ihe karịa onye na-ezi ya ihe, kama mgbe ọ mụsịrị akwụkwọ ya ọ ga-amata ihe dị ka onye ziri ya ihe. |
41 |
“Gịnị mere i ji legide anya na ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ị na-eme banyere ibe osisi dachiri gị anya? |
42 |
Ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, biko kwere ka m tụpụta gị ahịhịa ntakịrị dị gị nꞌanya mgbe ibe osisi dachiri gị nꞌanya adịghị ekwe gị hụ ụzọ? Buru ụzọ wepụta ibe osisi dachiri gị nꞌanya, mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya. |
43 |
“Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma. |
44 |
Nꞌihi na ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta oroma nꞌosisi ụdara, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta aṅara nꞌahịhịa ogwu. |
45 |
Ezi mmadụ na-esite nꞌakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ihe, otu a kwa ajọ mmadụ na-esite nꞌobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ihe. Nꞌihi na ihe ọ bụla dị mmadụ nꞌobi bụ ihe na-apụta nꞌọnụ ya. |
46 |
“Gịnị mere unu ji na-akpọ m Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ma unu adịghị eme ihe m gwara unu? |
47 |
Achọrọ m igosi unu ihe onye na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ eme ihe, yiri. |
48 |
Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu ntọ ala dị mma, onye gwumiri ala, doo ntọ ala ụlọ ahụ nꞌelu nkume. Mmiri ga-ezo, tojuo iyi nile, meekwa ka ide mmiri sọọ gburugburu ụlọ ahụ, ma ọ gaghị eme ka ụlọ ahụ maa jijiji, nꞌihi na e wukwasịrị ya nꞌelu nkume. |
49 |
“Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nꞌelu aja, nke na-enweghị ntọ ala ọ bụla. Mgbe ide mmiri sọrọ ụlọ ahụ gburugburu, ụlọ ahụ na-ada nnọọ gbirigidim!”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
LUK 6:1 |
LUK 6:2 |
LUK 6:3 |
LUK 6:4 |
LUK 6:5 |
LUK 6:6 |
LUK 6:7 |
LUK 6:8 |
LUK 6:9 |
LUK 6:10 |
LUK 6:11 |
LUK 6:12 |
LUK 6:13 |
LUK 6:14 |
LUK 6:15 |
LUK 6:16 |
LUK 6:17 |
LUK 6:18 |
LUK 6:19 |
LUK 6:20 |
LUK 6:21 |
LUK 6:22 |
LUK 6:23 |
LUK 6:24 |
LUK 6:25 |
LUK 6:26 |
LUK 6:27 |
LUK 6:28 |
LUK 6:29 |
LUK 6:30 |
LUK 6:31 |
LUK 6:32 |
LUK 6:33 |
LUK 6:34 |
LUK 6:35 |
LUK 6:36 |
LUK 6:37 |
LUK 6:38 |
LUK 6:39 |
LUK 6:40 |
LUK 6:41 |
LUK 6:42 |
LUK 6:43 |
LUK 6:44 |
LUK 6:45 |
LUK 6:46 |
LUK 6:47 |
LUK 6:48 |
LUK 6:49 |
|
|
|
|
|
|
LUK 1 / LUK 1 |
LUK 2 / LUK 2 |
LUK 3 / LUK 3 |
LUK 4 / LUK 4 |
LUK 5 / LUK 5 |
LUK 6 / LUK 6 |
LUK 7 / LUK 7 |
LUK 8 / LUK 8 |
LUK 9 / LUK 9 |
LUK 10 / LUK 10 |
LUK 11 / LUK 11 |
LUK 12 / LUK 12 |
LUK 13 / LUK 13 |
LUK 14 / LUK 14 |
LUK 15 / LUK 15 |
LUK 16 / LUK 16 |
LUK 17 / LUK 17 |
LUK 18 / LUK 18 |
LUK 19 / LUK 19 |
LUK 20 / LUK 20 |
LUK 21 / LUK 21 |
LUK 22 / LUK 22 |
LUK 23 / LUK 23 |
LUK 24 / LUK 24 |