1 |
Mgbe ahụ Jisọs onye jupụtara nꞌike Mmụọ nsọ si nꞌosimiri Jọdan obe a nọ mee ya baptizim pụọ. Mmụọ Nsọ duuru ya baa nꞌime ọzara. |
2 |
Ebe ahụ ka ọ nọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Iri ụbọchị anọ ndị a nile o righị nri ọ bụla. Nꞌikpeazụ, agụụ gụrụ ya. |
3 |
Mgbe ahụ ekwensu bịara gwa ya sị, “Ọ̀ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a okwu ka ha ghọọrọ gị nri.” |
4 |
Ma Jisọs zara ya sị, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ̀ bụghị nanị site nꞌiri nri ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ” |
5 |
Nꞌotu mgbe ahụ ekwensu duuru ya gaa nꞌebe dị elu, ebe ọ nọ mee ka Jisọs hụ alaeze nile dị nꞌụwa nꞌotu ntabi anya. |
6 |
Ọ gwara Jisọs sị, “Alaeze ndị a nile bụ nke m, ma ejikeere m inye gị alaeze ọma ndị a nile ya na akụ na ụba nile dị nꞌime ha, ma ọ bụrụ na ị ga-akpọ isi ala nye m.” |
7 |
*** |
8 |
Ma Jisọs zara sị, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụ nanị Chineke ka anyị ga-akpọ isi ala nye, ọ bụkwa nanị ya ka anyị ga-efe.’ ” |
9 |
Mgbe ahụ ekwensu duuru Jisọs gaa Jerusalem, mee ka o guzo nꞌebe kachasị elu nke elu ụlọ nsọ ukwu ahụ. Ọ gwara Jisọs sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke, si nꞌebe a tụda onwe gị nꞌala. |
10 |
Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha chebe gị. |
11 |
Ha ga-aghọtakwa gị nꞌaka ha ka ị ghara ịdaru ala merụọ ahụ.’ ” |
12 |
Jisọs zara sị ya, “Akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘I kwesịghị ịnwa Onyenwe gị Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ” |
13 |
Mgbe ike gwụrụ ekwensu ịnwa Jisọs ọnwụnwa, ọ hapụrụ ya laa tutuu ruo mgbe ọ ga-enweta ohere ọzọ. |
14 |
Mgbe ahụ Jisọs lọghachiri na Galili. Nꞌoge a, o jupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ Galili nile. |
15 |
Ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu na-ezi ndị mmadụ ihe. Mmadụ nile tokwara ya. |
16 |
Mgbe ahụ Jisọs gara ije rute Nazaret, obodo nke aka ya, ebe ọ nọ too. Nꞌụbọchị izuike, ọ gara nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ, dị ka ọ dị mbụ eme. Nꞌebe ahụ, o guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. |
17 |
Ndị isi ụlọ ekpere ahụ nyere ya akwụkwọ nsọ nke Aịzaya onye amụma dere. Jisọs meghere ya, bido ịgụ ebe Aịzaya dere ihe ndị a, |
18 |
“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nꞌahụ m, nꞌihi na ọ họpụtala m ikwusa ozi ọma nye ndị ogbenye, Ọ họpụtala m ikwusa na ndị e kere agbụ ga-enwere onwe ha, na ndị kpuru ìsì ga-ahụkwa ụzọ ọzọ, na ndị a na-emegbu ga-esite nꞌaka ndị na-emegbu ha nwere onwe ha, |
19 |
ikwusa na Chineke kwadoro ugbu a ịgọzi ndị nile ga-abịakwute ya.” |
20 |
Jisọs mechiri akwụkwọ ahụ nyekwa ya onyeisi ụlọ ekpere ahụ, nọdụ ala. Ndị mmadụ nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ legidere ya nnọọ anya. |
21 |
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịgwa ha okwu sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nꞌakwụkwọ nsọ, nke m gụpụtara, mezuru.” |
22 |
Ndị ahụ nile bịara nꞌụlọ ekpere ahụ kwuru okwu ọma banyere ya. O juru ha anya na okwu ọma dị otu a si ya nꞌọnụ pụta. Ha sịrị, “Onye a ò bụghị nwa Josef?” |
23 |
Ma Jisọs gwara ha sị, “Amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a nke sịrị, ‘Dibịa gwọọnụ onwe gị. Gosinụ anyị ihe ị bụ. Gosinụ anyị nꞌobodo nke aka gị, ihe ahụ nile anyị nụrụ na ị na-eme na Kapanọm.’ |
24 |
Ma ka m gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọ bụla a na-anara nke ọma nꞌobodo nke aka ya. Chetakwanụ ihe mere nꞌoge Ịlaịja onye amụma. E nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị e kwesịrị inyere aka nꞌoge ụnwụ ahụ, mgbe mmiri na-ezoghị nꞌala Izirel afọ atọ na mkpirisi. |
25 |
Ma Chineke ezigaghị Ịlaịja inyere onye ọ bụla nꞌime ha aka. Kama Chineke zigara Ịlaịja ka ọ gaa nꞌala Saidọn nyere otu nwanyị onye mba ọzọ di ya nwụrụ anwụ aka. |
26 |
*** |
27 |
Chetakwanụ ihe mere nꞌoge Ịlaisha onye amụma. Nꞌoge ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nꞌala Izirel, ma o nweghi onye a gwọrọ nꞌetiti hạ kariakwa Neeman onye Siria.” |
28 |
Mgbe ndị mmadụ nụrụ okwu ndị a, iwe were ha nke ukwuu. |
29 |
Ha nile biliri ọtọ otu mgbe ahụ, jide Jisọs, dọkpụrụ ya pụọ nꞌobodo, gaa nꞌelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ, ka ha site nꞌebe ahụ tụpụ ya. |
30 |
Ma Jisọs sitere nꞌetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, hapụ ha nꞌebe ahụ. |
31 |
O sitere nꞌebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyekwara nꞌụlọ ekpere ha bido izi ndị mmadụ ihe. |
32 |
Ihe o ziri ha juru ndị mmadụ anya. Nꞌihi na o ziri ha ihe dị ka onye maara ihe bụ eziokwu, dị ka ọpụtaobie, ọ bụghị dị ka onye na-ekwu site nꞌihe ọ nụrụ nꞌọnụ ndị ọzọ. |
33 |
Otu ụbọchị mgbe ọ nọ na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu, otu nwoke nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya bịara nso ebe ọ nọ bido na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, |
34 |
“Chei! Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌịyi? Amaara m onye ị bụ. Ị bụ Ọkpara Chineke dị nsọ.” |
35 |
Ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ gị si nꞌime ya pụta!” Mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke a nꞌala nꞌihu ndị nọ nꞌebe ahụ, site nꞌime nwoke ahụ pụta, ma o merụghị ya ahụ. |
36 |
Nke a juru mmadụ nile anya mee ka ha sịrịta onwe ha, “Gịnị dị nꞌokwu ọnụ nwoke a, lee na o ji ike na-enye mmụọ ọjọọ ndị a iwu, ha na-apụkwa!” |
37 |
Akụkọ ọrụ a Jisọs rụrụ gbasara jeruo obodo nile dị ebe ahụ gburugburu. |
38 |
Mgbe Jisọs si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, ọ gara nꞌụlọ Saimọn. Nꞌebe ahụ ọ chọpụtara na nne nwụnye Saimọn nwere ahụ ọkụ. |
39 |
Jisọs gara guzo nꞌakụkụ ihe ndina nwanyị ahụ baara ahụ ọkụ ahụ mba. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ nwanyị ahụ. O biliri kwadooro ha ihe oriri. |
40 |
Nꞌụbọchị ahụ kwa, nꞌoge anyasị, ndị nile nwere enyi nke ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, buteere ha Jisọs ka ọ gwọọ ha. O bikwasịrị ha aka gwọọ ha. |
41 |
Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nꞌime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” Ma Jisọs baara ha mba, kwụsị ha ikwu okwu, nꞌihi na ha maara na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ. |
42 |
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, Jisọs si nꞌụlọ Saimọn pụọ gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya. Mgbe chi bọrọ ndị mmadụ bidoro ịchọgharị ya. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka ọ ghara ịhapụ ha kama ka o soro ha nọdụ na Kapanọm. |
43 |
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ dị mkpa na m ga-aga gwa ndị nọ nꞌobodo ọzọ akụkọ banyere alaeze Chineke nꞌihi na ọ bụ ime nke a ka m ji bịa.” |
44 |
Site nꞌebe ahụ, o bidoro na-agagharị ebe nile na-ekwusa okwu Chineke nꞌụlọ nzukọ nile dị na Galili.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
LUK 4:1 |
LUK 4:2 |
LUK 4:3 |
LUK 4:4 |
LUK 4:5 |
LUK 4:6 |
LUK 4:7 |
LUK 4:8 |
LUK 4:9 |
LUK 4:10 |
LUK 4:11 |
LUK 4:12 |
LUK 4:13 |
LUK 4:14 |
LUK 4:15 |
LUK 4:16 |
LUK 4:17 |
LUK 4:18 |
LUK 4:19 |
LUK 4:20 |
LUK 4:21 |
LUK 4:22 |
LUK 4:23 |
LUK 4:24 |
LUK 4:25 |
LUK 4:26 |
LUK 4:27 |
LUK 4:28 |
LUK 4:29 |
LUK 4:30 |
LUK 4:31 |
LUK 4:32 |
LUK 4:33 |
LUK 4:34 |
LUK 4:35 |
LUK 4:36 |
LUK 4:37 |
LUK 4:38 |
LUK 4:39 |
LUK 4:40 |
LUK 4:41 |
LUK 4:42 |
LUK 4:43 |
LUK 4:44 |
|
|
|
|
|
|
LUK 1 / LUK 1 |
LUK 2 / LUK 2 |
LUK 3 / LUK 3 |
LUK 4 / LUK 4 |
LUK 5 / LUK 5 |
LUK 6 / LUK 6 |
LUK 7 / LUK 7 |
LUK 8 / LUK 8 |
LUK 9 / LUK 9 |
LUK 10 / LUK 10 |
LUK 11 / LUK 11 |
LUK 12 / LUK 12 |
LUK 13 / LUK 13 |
LUK 14 / LUK 14 |
LUK 15 / LUK 15 |
LUK 16 / LUK 16 |
LUK 17 / LUK 17 |
LUK 18 / LUK 18 |
LUK 19 / LUK 19 |
LUK 20 / LUK 20 |
LUK 21 / LUK 21 |
LUK 22 / LUK 22 |
LUK 23 / LUK 23 |
LUK 24 / LUK 24 |