A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

LUK 22



1
Nꞌoge a, mmemme a na-akpọ Ngabiga eruola nso. Nke a bụ oge ndị Juu na-ata beredi a na-ejighị ihe na-eko achịcha eme.
2
Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo Jisọs, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ.
3
Mgbe ahụ ekwensu banyere nꞌime obi Judas Iskarịọt, otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso Jisọs.
4
Ekwensu mere ka o jekwuru ndị isi nchụaja, na ndị isi agha na-elekọta ụlọ nsọ ukwu ahụ, ka ya na ha gbaa izu otu ọ ga-esi nyefee Jisọs nꞌaka ha.
5
Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha nụrụ ihe Judas ji bịa. Ha kwere nkwa inye ya ego.
6
Ya mere, site nꞌụbọchị ahụ, Judas bidoro ịchọ ụzọ kachasị mma ọ ga-esi rara Jisọs nye. Nzube ya bụ ime nke a mgbe Jisọs na ndị mmadụ na-anọkọtaghị.
7
Emesịa, nꞌụbọchị mmemme Ngabiga ahụ, mgbe a na-egbu atụrụ ahụ e ji eri oriri ngabiga,
8
Jisọs kpọrọ Pita na Jọn sị ha, “Gaanụ kwadoo nri Ngabiga nke anyị onwe anyị ga-eri.”
9
Ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Ebeekwanụ ka ị chọrọ ka anyị nọdụ kwadoo ya?”
10
Jisọs zara ha sị, “Gaanụ nꞌime obodo. Mgbe unu na-abanye unu ga-ezute otu nwoke bu ite mmiri. Soronụ ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Sorokwanụ ya baa nꞌụlọ ọ banyere. Nꞌebe ahụ leenụ ihe unu ga-agwa onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi anyị sị anyị jụọ gị ọnụ ụlọ ị kwadoro ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ rie oriri Ngabiga nke ha.’
11
***
12
Nwoke ahụ ga-egosi unu otu ọnụ ụlọ buru ibu dị nꞌelu ụlọ ebe e dozichara ihe nile. Nọdụnụ nꞌebe ahụ kwadoo nri anyị.”
13
Pita na Jọn gara nꞌebe ahụ, chọpụta ihe nile dị ka Jisọs kwuru. Ha nọkwa nꞌebe ahụ kwadoo nri ha ga-eri.
14
Mgbe oge ruru, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌụlọ ahụ nọdụ ala iri ihe.
15
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ na mụ na unu ga-eri nri ngabiga a tupuu m hụọ ahụhụ.
16
Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m kwuru mgbe m sị na agaghị m erikwa nri a ọzọ tutuu e mezuo ihe nri a nọchịrị anya ya nꞌalaeze Chineke.”
17
Mgbe ahụ o buuru iko mmanya nye Chineke ekele nꞌihi ya. O bunyere ndị na-eso ụzọ ya iko ahụ sị ha, “Burunụ iko mmanya a ṅụọ unu nile,
18
nꞌihi na eziokwu ka m na-ekwu na site nꞌụbọchị taa gaa nꞌihu, agaghị m aṅụkwa ụdị mmanya a ọzọ tutuu ruo mgbe alaeze Chineke bịara.”
19
O wekwaara beredi dị nꞌebe ahụ kelee Chineke ekele nꞌihi ya, nyawaa ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nke a bụ anụ ahụ m nke a na-enye nꞌihi unu. Meenụ nke a mgbe nile icheta m.”
20
Nꞌụzọ dị otu ahụ kwa, o buliri iko mmanya mgbe ha risiri nri anyasị kwuo okwu sị, “Mmanya a nọchiri anya ọbara m nke a na-awụsị nꞌihi unu, ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ Chineke guzosie ike.
21
Ma, achọrọ m ka unu mata na ebe a anyị nile nọkọrọ, onye ga-arara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m, so m ugbu a, na-eri nri.
22
Mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ na-aga ịnwụ dị ka Chineke kpebiri. Ma ahụhụ dịrị onye ahụ e sitere nꞌaka ya rara m nye.”
23
Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịjụrịta onwe ha ajụjụ ịchọpụta onye ọ bụ nꞌime ha nke ga-arara ya nye.
24
Mgbe ahụ kwa ha bidoro ịrụ ụka nꞌetiti onwe ha ịchọpụta onye ka ibe ya ukwuu.
25
Jisọs gwara ha okwu sị, “Ndị eze mba dị nꞌụwa na-eji aka ike na-achị ndị nọ nꞌokpuru ha. Otu aka ahụ kwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.
26
Ma nꞌebe unu nọ ọ gaghị esi otu a dịrị. Kama ka onye kachasị ibe ya ukwuu nꞌime unu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyendu dịrịkwa ka onye na-eje ozi.
27
Ònye ka ibe ya ukwuu? Ọ̀ bụ onye batara nꞌụlọ nọdụ nꞌelu tebulu rie nri, ka ọ bụ onye ahụ na-esi nri, dozie ya nꞌelu tebulu? Unu maara na ọ bụ onye ahụ batara nọdụ rie nri dị ukwuu karịa onye na-esi nri esi. Ma nꞌebe unu nọ, adị m ka onye na-ejere unu ozi.
28
Mụ na unu anọọla nꞌoge ọnwụnwa m nile.
29
Ya mere, dị ka Nna m siri nye m ike ịchị achị, otu a ka m si enyekwa unu ike.
30
Ka unu nwee ike isoro m rie ihe, sorokwa m ṅụọ ihe ọṅụṅụ nꞌalaeze m. Sorokwa m nọdụ nꞌelu ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izirel ikpe.
31
“Saimọn, Saimọn, ekwensu arịọla ka e nye ya ohere ịnwa unu ọnwụnwa na ịyọcha unu dị ka nwanyị si ayọcha ọka,
32
ma ekpeelara m gị ekpere, rịọ Chineke, ka o mee ka okwukwe gị sie ike, ka ị hapụ ịda. Mgbe ị tụgharịrị bụrụ onye na-eso m nꞌezie, gbaakwa ụmụnna gị ndị a ume.”
33
Mgbe ahụ ha gwara ya sị, “Onyenwe anyị, lee, anyị nwere mma agha abụọ.” Jisọs zara ha sị, “Nke ahụ ezuole.”
34
Ma Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m, si na ị maghị onye m bụ, ugbo atọ.”
35
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego ma ọ bụ akpa, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, ọ̀ dị ihe kọrọ unu?” Ha zara ya sị, “Ihe ọ bụla akọghị anyị.”
36
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ugbu a, ka onye ọ bụla nwere ego were ya, ka onye nwere akpa sere ya. Ọ bụrụkwa na ọ dị onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya, nweta ego zụrụ otu.
37
Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị na ihe ahụ akwụkwọ nsọ kwuru banyere m sị, ‘A gụkọrọ ya na ndị mmehie’, ga-emezu.”
38
Mgbe ahụ ha gwara ya sị, “Onyenwe anyị, lee, anyị nwere mma agha abụọ.” Jisọs zara ha sị, “Nke ahụ ezuole.”
39
Jisọs si nꞌụlọ ahụ pụta, bido ịga nꞌugwu olivu, ebe ọ na-anọ mgbe nile. Ndị na-eso ụzọ ya sokwaara ya.
40
Nꞌebe ahụ ọ gwara okwu sị, “Kpeenụ ekpere rịọọ Chineke, ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”
41
Ọ hapụrụ ha gaa nꞌihu nke nta, ebe dị anya ntakịrị site nꞌebe ha nọ, gbuo ikpere nꞌala kpeere Chineke ekpere.
42
Nꞌekpere ya, ọ rịọrọ Chineke sị, “Nna, ọ bụrụ na ị chọrọ, napụ m iko a. Otu ọ dị, ọ bụghị ihe m chọrọ ka a ga-eme, kama ka ihe ọ bụla ị chọrọ mezuo.”
43
Nꞌoge ahụ Chineke sitere nꞌeluigwe zite ndị mmụọ ozi bịara gbaa ya ume.
44
Nꞌime obi nke jupụtara nꞌihe mgbu, Jisọs kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nꞌahụ na-adapụ nꞌala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
45
Mgbe o kpechara ekpere, o biliri ọtọ, bịakwute ndị na-eso ụzọ ya, hụ na ha na-arahụ ụra, nꞌihi na obi adịghị ha mma.
46
Jisọs kpọtere ha sị, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”
47
Mgbe ọ kpụ okwu a nꞌọnụ, o leliri anya hụ igwe mmadụ ka ha na-abịa nꞌebe ọ nọ. Ọ bụ nwoke a na-akpọ Judas otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya du ha. Mgbe ha bịarutere Jisọs nso, Judas pụtara bakụọ Jisọs sutu ya ọnụ.
48
Ma Jisọs jụrụ Judas ajụjụ sị, “Judas, ọ̀ bụ site nꞌisutu m ọnụ ka i ji arara m nye?”
49
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ na ọ bụ Jisọs ka igwe mmadụ ahụ bịara ijide, ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onyenwe anyị, mma agha dị nꞌebe a. Anyị ga-eji ya lụso ha ọgụ?”
50
Otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya jiri mma agha gbupụ ntị otu onye na-ejere onyeisi nchụaja ozi.
51
Ma Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “O zuola! Unu egbukwala onye ọ bụla mma ọzọ!”
52
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị gwa ndị isi nchụaja ahụ, na ndị isi agha ahụ na-eche ụlọ nsọ ukwu ahụ, na ndị okenye ahụ bịara ijide ya okwu sị, “Ùnu chịịrị mma agha na osisi bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike?
53
Ụbọchị nile ka mụ na unu na-anọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma nke a bụ oge unu, mgbe Chineke kpebiri inye ekwensu ohere igosi ike ya.”
54
Mgbe ahụ ha jidere Jisọs duru ya pụọ. Ha duuru ya gaa nꞌụlọ onyeisi nchụaja. Pita so ha nꞌazụ. Kama ọ nọ nꞌazụ azụ, nꞌebe dị anya.
55
Ndị agha kwanyere ọkụ nꞌetiti ezi nke ụlọ onyeisi nchụaja ahụ, nọdụ ya gburugburu na-anya ọkụ. Pita batara soro ha nọdụ.
56
Otu nwagbọghọ na-eje ozi nꞌebe ahụ pụtara hụ Pita ebe ọ nọdụrụ na-anya ọkụ. O legidere Pita anya sị, “Onye a bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs.”
57
Ma Pita gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.”
58
Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ pụtakwara hụ Pita sị ya, “Ị bụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs.” Ma Pita kwuru sị, “Enyi m, abụghị m otu nꞌime ha.”
59
Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike sị, “Nꞌezie, nwoke a bụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs. Lee, ọ bụkwa onye Galili.”
60
Ma Pita zara ya sị, “Enyi, amaghị m ihe ị na-ekwu okwu banyere ya.” Otu mgbe ahụ, mgbe Pita kpụ okwu ya nꞌọnụ, oke ọkụkọ kwara akwa.
61
Jisọs tụgharịrị lee Pita anya. Mgbe ahụ kwa Pita chetara okwu ahụ Jisọs gwara ya. Nꞌihi na ọ gwara Pita sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa taa, ugbo atọ ka ị ga-agọnarị m.”
62
Pita sitere nꞌebe ahụ pụọ, gaa kwaa nnọọ akwa.
63
Ndị ahụ jidere Jisọs bidoro iji ya ime ihe ọchị na iti ya ihe.
64
Ha jiri akwa kechie anya ya abụọ bido na-ajụ ya ajụjụ mgbe ha na-eti ya ihe sị, “Gwa anyị, ọ bụ onye tiri gị ihe?”
65
Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ megide ya, na-akparịkwa ya.
66
Mgbe chi bọrọ, ndị okenye ndị Juu na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu zukọrọ. A kpọtara Jisọs nꞌihu ha.
67
Mgbe ahụ ha bidoro ịjụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwa anyị.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwenye.
68
Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ unu agaghị aza m.
69
Ma ka m gwa unu nke a, site taa gaa nꞌihu, Mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ, ga-anọdụ nꞌocheeze ahụ dị nꞌaka nri Chineke.”
70
Mgbe ahụ ha bidoro ịjụ ya ajụjụ sị, “Ihe ị na-ekwu ọ bụ na ị bụ Ọkpara Chineke?” Jisọs zara sị ha, “Ee, ọ bụ dị ka unu si kwuo ya.”
71
Ha nile tiri mkpu nꞌiwe sị, “Ọ̀ dị mkpa ịchọ ndị akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ okwu si ya nꞌọnụ pụta!”











LUK 22:1
LUK 22:2
LUK 22:3
LUK 22:4
LUK 22:5
LUK 22:6
LUK 22:7
LUK 22:8
LUK 22:9
LUK 22:10
LUK 22:11
LUK 22:12
LUK 22:13
LUK 22:14
LUK 22:15
LUK 22:16
LUK 22:17
LUK 22:18
LUK 22:19
LUK 22:20
LUK 22:21
LUK 22:22
LUK 22:23
LUK 22:24
LUK 22:25
LUK 22:26
LUK 22:27
LUK 22:28
LUK 22:29
LUK 22:30
LUK 22:31
LUK 22:32
LUK 22:33
LUK 22:34
LUK 22:35
LUK 22:36
LUK 22:37
LUK 22:38
LUK 22:39
LUK 22:40
LUK 22:41
LUK 22:42
LUK 22:43
LUK 22:44
LUK 22:45
LUK 22:46
LUK 22:47
LUK 22:48
LUK 22:49
LUK 22:50
LUK 22:51
LUK 22:52
LUK 22:53
LUK 22:54
LUK 22:55
LUK 22:56
LUK 22:57
LUK 22:58
LUK 22:59
LUK 22:60
LUK 22:61
LUK 22:62
LUK 22:63
LUK 22:64
LUK 22:65
LUK 22:66
LUK 22:67
LUK 22:68
LUK 22:69
LUK 22:70
LUK 22:71






LUK 1 / LUK 1
LUK 2 / LUK 2
LUK 3 / LUK 3
LUK 4 / LUK 4
LUK 5 / LUK 5
LUK 6 / LUK 6
LUK 7 / LUK 7
LUK 8 / LUK 8
LUK 9 / LUK 9
LUK 10 / LUK 10
LUK 11 / LUK 11
LUK 12 / LUK 12
LUK 13 / LUK 13
LUK 14 / LUK 14
LUK 15 / LUK 15
LUK 16 / LUK 16
LUK 17 / LUK 17
LUK 18 / LUK 18
LUK 19 / LUK 19
LUK 20 / LUK 20
LUK 21 / LUK 21
LUK 22 / LUK 22
LUK 23 / LUK 23
LUK 24 / LUK 24