A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

LUK 1



1
Tiofilọs onyenwe m, ọtụtụ agbalịala otu ha nwere ike idetu nꞌakwụkwọ, akụkọ banyere ihe nile Chineke sitere nꞌaka Jisọs mezuo nꞌetiti anyị.
2
Ndị ahụ dere ihe a, dere gwa anyị ihe ha hụrụ na nke ha nụrụ site nꞌọnụ ndị ji anya ha hụ ihe ndị a mgbe ha mezuru. Ha dekwara ihe ha nụrụ site nꞌọnụ ndị ozi Jisọs ndị kwusara ozi ọma ahụ.
3
Ebe ọ bụkwa na mụ onwe m eleziela anya nke ọma nyochaa akụkọ ndị a nile, site na mgbe ihe nile bidoro ruo nꞌọgwụgwụ ya, ekpebiela m idere gị akụkọ ahụ nile nꞌusoro dị ka ihe nile siri mee.
4
Ana m eme nke a nꞌihi na achọrọ m ka i nwee afọ ojuju na ihe nile e ziri gị banyere ozi ọma ahụ bụ eziokwu.
5
Akụkọ a bidoro nꞌoge eze Herọd na-achị ala Judia nile. Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu onye nchụaja ndị Juu a na-akpọ Zakaraya. O so nꞌotu ndị nchụaja a na-akpọ Abaija. Otu a na-ejekwa ozi nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem. Zakaraya nwere nwụnye aha ya bụ Elizabet, onye a mụkwara nꞌezinụlọ ndị nchụaja.
6
Zakaraya na nwụnye ya biri ezi ndụ nꞌihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụru nile Chineke nyere na-enweghị ntụpọ ọ bụla.
7
Kama ha amụtaghị nwa, nꞌihi na Elizabet enweghị ike ịtụrụ ime. Nꞌoge akụkọ a bidoro, Zakaraya na Elizabet emeela nnọọ agadi.
8
Otu ụbọchị, mgbe òtu Abaija ketara ịrụ ọrụ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, Zakaraya sokwara na-arụ ọrụ nke o ketara ịrụ dị ka onye nchụaja nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Nꞌoge ahụ kwa a họpụtara Zakaraya ka ọ bụrụ onye ga-abanye nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.
9
***
10
Mgbe Zakaraya banyere ịchụ aja ahụ, igwe ndị mmadụ bịara ife Chineke nꞌụbọchị ahụ nọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nꞌihi na ọ bụ omenala na mgbe ọ bụla onye nchụaja banyere ịchụ ụdị aja a, ndị mmadụ ga-anọ nꞌezi na-ekpe ekpere.
11
Mgbe Zakaraya nọ nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ na-achụ aja ya, mmụọ ozi Chineke mere ka Zakaraya hụ ya anya. Mmụọ ozi a bịara guzo nꞌakụkụ aka nri ebe nchụaja ahụ Zakaraya nọ na-achụ aja nsure ọkụ ya. Mgbe Zakaraya hụrụ mmụọ ozi a, obi fepụrụ ya. Ọ tụkwara oke egwu.
12
***
13
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu sị, “Zakaraya, atụla egwu! Nꞌihi na abịara m ịgwa gị na Chineke anụla ekpere gị. Ọ ga-emekwa ka Elizabet nwụnye gị tụrụ ime, mụtara gị nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jọn.
14
Ọmụmụ nwanta a ga-ewetara unu oke ọṅụ na obi ụtọ. Ọtụtụ mmadụ ga-esorokwa unu ṅụrịa ọṅụ.
15
Nꞌihi na nwanta ahụ ga-abụ onye dị ukwuu nꞌanya Chineke. Ọ gaghị emetụ mmanya ọ bụla aka, ọ gaghị aṅụkwa mmanya na-egbu egbu, nꞌihi na site nꞌafọ nne ya, Chineke ga-emejupụta ya na Mmụọ Nsọ.
16
Ọrụ ya ga-abụ ịkpọghachite ọtụtụ ụmụ Izirel nꞌebe Onyenwe ha na Chineke ha nọ.
17
Dị ka Ịlaija siri bụrụ nwoke dị ike, na onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, otu a ka Jọn ga-adị. Ọ bụ ya ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ na-abịa, kwadoo ndị mmadụ ịnabata Onyenwe anyị. Jọn ga-emekwa ka udo dịrị nꞌetiti ndị nna na ụmụ ha, ọ ga-akpọghachitekwa ndị na-enupụ isi mee ka ha bụrụ ndị ga-eche uche dị ka ndị ezi omume.”
18
Zakaraya jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị ya, “Olee otu m ga-esi mata na ihe ị gwara m bụ eziokwu? Ị hụlanụ na abụrụla m agadi nwụnye m bụkwa agadi.”
19
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Aha m bụ Geburel. Ọ bụ nꞌihu Chineke, onye zitere m iwetara gị akụkọ ọma a ka m na-anọ ụbọchị nile.
20
Geekwa ntị ka m gwa gị! Ebe ị jụrụ ikwenye nꞌihe m gwara gị, a ga-anapụ gị ike ikwu okwu. Ị gaghị ekwukwa okwu ọ bụla, tutuu ruo mgbe okwu a m gwara gị mezuru. Nꞌihi na okwu a m gwara gị ga-emezu mgbe oge ya ruru.”
21
Mgbe ihe ndị a nile na-eme, ndị mmadụ ahụ gbakọrọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nọkwa na-eche Zakaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nꞌime ime ụlọ nsọ ukwu ahụ.
22
Mgbe Zakaraya mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Nꞌihi na ọ bụ aka ya ka o ji gwa ha okwu. Ha ghọtara na ọ ga-abụ na Zakaraya ahụla ọhụ nꞌime ụlọ nsọ ahụ.
23
Mgbe oge ịrụ ọrụ ya nꞌụlọ nsọ ahụ gwụsịrị, Zakaraya laghachiri azụ nꞌụlọ ya.
24
Ọ dịkwaghị anya site nꞌoge Zakaraya lara, Elizabet nwụnye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nꞌime ụlọ ha ọnwa ise.
25
Mgbe ihe si otu a mee, mkpu ọṅụ si nꞌọnụ Elizabet pụta. O kwuru sị, “Lee ka Onyenwe anyị siri meere m ebere! O wepụla ihe ihere gaara abụ nke m nꞌihi amụtaghị nwa.”
26
Mgbe ime Elizabet ruru ọnwa isii, Chineke zikwara mmụọ ozi ya Geburel, ka ọ gaa nꞌobodo Nazaret nke dị nꞌime Galili.
27
Chineke ziri ya ka o jekwuru otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ndị mụrụ ya kwere nkwa ịkpọnye Josef nwa nwa Devidi, ka ọ bụrụ nwụnye ya.
28
Mmụọ ozi ahụ bịakwutere nwagbọghọ ahụ sị ya, “Nwagbọghọ, ekele! Gị onye ihuọma Onyenwe anyị dịkwasịrị. Chineke nọnyekwaara gị!”
29
Meri enweghị udo nꞌobi ya mgbe ọ nụrụ okwu a mmụọ ozi kwuru. O bidokwara ịtụgharị nꞌuche ya ihe ekele a pụtara.
30
Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, nꞌihi na Chineke ekpebiela imere gị ihe ọma!
31
Lee anya, ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, onye aha ị ga-agụ ya bụ Jisọs.
32
Nwa nwoke a ga-abụ onye ukwu, onye a ga-akpọkwa Ọkpara Chineke kachasị elu. Chineke ga-eme ya ka ọ bụrụ eze. Ọ ga-enyekwa ya ocheeze Devidi nna nna ya.
33
Ọ ga-abụ onye ga-achị ndị Izirel ruo mgbe ebighị ebi. Ọchịchị ya agakwaghị agwụ agwụ.”
34
Meri jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị, “Ebe m na-enweghị di, aga m esikwanụ aṅaa mụta nwa?”
35
Mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke ga-abịakwasị gị, ike Chineke ga-ekpuchikwa gị. Mgbe ahụ nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.
36
I chetara Elizabet onye ikwu gị? Agadi ahụ? Ndị mmadụ sị na ọ gaghị amụlitekwa nwa, ma gịnị mere ugbu a? Ọ dị ime ọnwa isii ugbu a o merela agadi.
37
O si otu a mee nꞌihi na ọ dịghi ihe nyịrị Chineke ime.”
38
Meri zara sị, “Ahụ m na mkpụrụ obi m bụ nke Onyenwe anyị. Ejikeere m ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka m mee. Ka ihe nile mezuokwa dị ka i si kwuo!”
39
Na-atụfughị oge, Meri jikeere jiri ọsọ gaa nꞌotu obodo nta dị nꞌugwu Judia.
40
Mgbe o ruru nꞌobodo nta ahụ, ọ banyere nꞌụlọ Zakaraya, kelee Elizabet.
41
Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa ahụ ọ dị ime ya megharịrị ahụ. Mgbe ahụ kwa e mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ Nsọ.
42
O tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nꞌetiti ụmụ nwanyị nile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị ga-amụ bụkwa.
43
Onye kwanụ ka m bụ, o ji bụrụ na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?
44
Nꞌihi na mgbe m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nꞌafọ wuliri elu nꞌọṅụ.
45
Ọṅụ dịịrị nwanyị ahụ kwenyere na Chineke ga-emezu ihe o kwere nkwa ime.”
46
Mgbe ahụ Meri bidoro ikwu okwu sị, “Lee ka obi m siri jupụta nꞌekele nye Onyenwe m.
47
Obi ụtọ ejupụtala mkpụrụ obi m nꞌihi Chineke Onye nzọpụta m.
48
Nꞌihi na Chineke eledatala anya ya, lekwasị m, bụ ohu ya, dị ala. Site ugbu a gaa nꞌihu ọgbọ nile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
49
Nꞌihi na Chineke Onye pụrụ ime ihe nile emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.
50
Nꞌezie, nꞌọgbọ nile, Chineke na-emere ndị nile na-atụ egwu ya ebere.
51
“O gosipụtala ike aka ya; ọ chụsasịala ndị mpako, meekwa ka ihe nile ha na-ezube nꞌobi ha bụrụ ihe efu.
52
Ọ na-esite nꞌocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nꞌobi elu.
53
Ọ na-eji ihe dị mma na-enyeju ndị agụụ na-agụ afọ. Ma ndị ọgaranya ka ọ na-ezipụ nꞌaka efu.
54
O nyerela Izirel ohu ya aka. O chefukwaghị nkwa o kwere na ya ga-emere ha ebere.
55
Nꞌihi na o kwere nkwa na ya ga-emere Eberaham na ụmụ ụmụ ya ebere ruo mgbe ebighị ebi.”
56
Meri nọnyeere Elizabet ọnwa atọ. Mgbe oge a gasịrị, ọ laghachiri azụ nꞌobodo nke aka ya.
57
Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
58
Ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ihuọma, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
59
Mgbe nwa ọhụrụ ahụ nọzuru abalị asatọ, ndị ikwu ha nile na ndị enyi ha bịara, nꞌihi na ọ bụ nꞌụbọchị ahụ ka a ga-agụ nwa ọhụrụ ahụ aha. Dị ka omenala si dị, ndị ahụ bịara abịa kpebiri na a ga-agụ ya Zakaraya, nke bụkwa aha nna ya.
60
Ma Elizabet fufere isi sị ha, “É, è! A ga-agụ ya Jọn.”
61
Ndị ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Nke a ọ bụ nꞌihi gịnị? O nwekwanụghị onye ọ bụla nꞌetiti ndị ikwu unu na-aza ụdị aha ahụ.”
62
Ya mere, ha jụrụ Zakaraya nna nwanta ahụ. Ma ebe ọ bụ na ọ naghị anụ ihe ha na-ekwu, ha ji aka ha jụọ ya ajụjụ a.
63
Zakaraya rịọrọ ka ha wetara ya mpempe akwụkwọ. Mgbe ha wetara ya, o depụtara aha nwanta ahụ nꞌakwụkwọ ahụ. Aha ọ sị na a ga-akpọ ya bụ “Jọn”. Nke a juru mmadụ nile anya.
64
Ma nꞌoge ahụ kwa Zakaraya nꞌonwe ya bidokwara ikwu okwu, malite na-eto Chineke.
65
Ibubo nwụrụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Otu a kwa akụkọ ihe ndị a mere gbasara ruo ndị nile bi nꞌobodo dị ebe ahụ gburugburu ntị.
66
Onye ọ bụla nụrụ akụkọ a chere nꞌobi ya sị, “Ụdị nwanta dị aṅaa ka nke a ga-abụ? Gịnị ka ọ ga-abụ? O were anya na Chineke nọnyeere ya nꞌụzọ dị iche.”
67
Mgbe ahụ kwa e mere ka Zakaraya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma kwuo sị,
68
“Ka anyị toonụ Onyenwe anyị Chineke Izirel otuto, nꞌihi na ọ bịala inyere ndị ya aka, na ịgbapụta ha.
69
O nyela anyị Onye nzọpụta dị ike site nꞌezinụlọ ohu ya nwoke bụ Devidi,
70
dị ka o kwuru na ọ ga-eme site nꞌọnụ ndị amụma ya dị nsọ,
71
na ọ ga-azọpụta anyị site nꞌaka ndị iro anyị na sitekwa nꞌaka ndị nile kpọrọ anyị asị.
72
“O kwekwara nkwa na ya ga-emere nna nna anyị ha ebere, chetakwa ọgbụgba ndụ ya na ha gbara.
73
Ọ ṅụkwara iyi nye Eberaham nna anyị
74
sị, na ya ga-adọpụta anyị site nꞌaka ndị iro anyị mee anyị ka anyị bụrụ ndị ga-efe ya ofufe na-atụghị egwu,
75
nꞌụzọ dị nsọ na nꞌụzọ ezi omume. Ka anyị si otu a bụrụ ndị ga-eguzo nꞌihu ya ụbọchị nile nke ndụ anyị.
76
“Gị nwa m nwoke, a ga-akpọ gị onye amụma nke Chineke kachasị ihe nile elu. Nꞌihi na ị ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ, ikwado ụzọ maka ọbịbịa ya.
77
Ịgwa ndị mmadụ otu ha ga-esi chọta nzọpụta site nꞌinwe mgbaghara nꞌihi mmehie ha.
78
Nꞌihi na site nꞌoke obiọma Chineke, anyị ga-abanye na mgbe na-adịghị anya, nꞌụbọchị ọhụrụ nke na-eweta nzọpụta si nꞌeluigwe bịa.
79
Ụbọchị ọhụrụ nke ga-ewetara ndị nọ nꞌọchịchịrị, na ndị nọ na ndagwurugwu nke ọnwụ ìhè. Ụbọchị ọhụrụ nke ga-edu anyị nꞌụzọ ga-eweta udo.”
80
Nwanta ahụ toro bụrụ onye dị ike nꞌime mmụọ. O biri nanị ya nꞌime ọzara tutuu oge ahụ eruo mgbe ọ ga-ebido ọrụ ya nꞌetiti ụmụ Izirel.











LUK 1:1
LUK 1:2
LUK 1:3
LUK 1:4
LUK 1:5
LUK 1:6
LUK 1:7
LUK 1:8
LUK 1:9
LUK 1:10
LUK 1:11
LUK 1:12
LUK 1:13
LUK 1:14
LUK 1:15
LUK 1:16
LUK 1:17
LUK 1:18
LUK 1:19
LUK 1:20
LUK 1:21
LUK 1:22
LUK 1:23
LUK 1:24
LUK 1:25
LUK 1:26
LUK 1:27
LUK 1:28
LUK 1:29
LUK 1:30
LUK 1:31
LUK 1:32
LUK 1:33
LUK 1:34
LUK 1:35
LUK 1:36
LUK 1:37
LUK 1:38
LUK 1:39
LUK 1:40
LUK 1:41
LUK 1:42
LUK 1:43
LUK 1:44
LUK 1:45
LUK 1:46
LUK 1:47
LUK 1:48
LUK 1:49
LUK 1:50
LUK 1:51
LUK 1:52
LUK 1:53
LUK 1:54
LUK 1:55
LUK 1:56
LUK 1:57
LUK 1:58
LUK 1:59
LUK 1:60
LUK 1:61
LUK 1:62
LUK 1:63
LUK 1:64
LUK 1:65
LUK 1:66
LUK 1:67
LUK 1:68
LUK 1:69
LUK 1:70
LUK 1:71
LUK 1:72
LUK 1:73
LUK 1:74
LUK 1:75
LUK 1:76
LUK 1:77
LUK 1:78
LUK 1:79
LUK 1:80






LUK 1 / LUK 1
LUK 2 / LUK 2
LUK 3 / LUK 3
LUK 4 / LUK 4
LUK 5 / LUK 5
LUK 6 / LUK 6
LUK 7 / LUK 7
LUK 8 / LUK 8
LUK 9 / LUK 9
LUK 10 / LUK 10
LUK 11 / LUK 11
LUK 12 / LUK 12
LUK 13 / LUK 13
LUK 14 / LUK 14
LUK 15 / LUK 15
LUK 16 / LUK 16
LUK 17 / LUK 17
LUK 18 / LUK 18
LUK 19 / LUK 19
LUK 20 / LUK 20
LUK 21 / LUK 21
LUK 22 / LUK 22
LUK 23 / LUK 23
LUK 24 / LUK 24