1 |
Akụkọ m chọrọ ịkọrọ unu ugbu a bụ akụkọ banyere Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. |
2 |
Amụma ahụ Aịzaya onye amụma buru emezuola. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya gbaa ama sị na mgbe ọbịbịa Jisọs ruru, ọ ga-ezite otu onye ga-ekwusara mmadụ nile na oge ọbịbịa ya eruola. |
3 |
Nwoke a, dị ka Aịzaya siri kwuo ga-esite nꞌọzara ebe ọ ga-ebi kwuo okwu. Isi okwu ya ga-abụkwa: “Dozienu ụzọ maka ọbịbịa Onyenwe anyi, meenụ ka okporo ụzọ ọ ga-agbaso guzozie.” |
4 |
Nwoke ahụ Chineke zitere bụ Jọn omee baptizim. O bi nꞌọzara, sitekwa nꞌebe ahụ jegharịa ebe nile. Ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha site na mmehie ha chegharịa, ka e mee ha baptizim, ka Chineke gbaghara ha. |
5 |
Ọtụtụ mmadụ sitere Judia na obodo nile dị Jerusalem gburugburu bịakwute ya. Ha jekwuuru ya nꞌosimiri Jọdan ebe ọ nọ na-ekwusa nkwusa ya. Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha o mere ha baptizim. |
6 |
Uwe Jọn yi nꞌahụ ya bụ nke e mere site nꞌajị inyinya a na-akpọ kamel. O kekwara belịtị dị warara nꞌukwu ya. Nri ọ na-eri bụ nanị igurube na mmanụ aṅụ a na-azaghị aza. |
7 |
Mgbe ndị mmadụ na-abịakwute ya, Jọn kwusaara ha na-asị, “Ọ dị nwoke dị ukwuu ga-abịa nꞌoge na-adịghị anya. Ọ dị ukwuu karịa m. Ọ dị nnọọ ukwuu na enweghị m ike ịtọpụ eriri e jiri kechie akpụkpọ ụkwụ ya. |
8 |
Ugbu a ana m eji mmiri efu na-eme unu baptizim, ma mgbe nwoke ahụ dị ukwuu bịara, ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” |
9 |
Otu ụbọchị, Jisọs sitere Nazaret obodo dị nꞌime Galili bịa nꞌosimiri Jọdan. Ọ bịara ka Jọn mee ya baptizim. Jọn mekwara ya baptizim. |
10 |
Mgbe Jisọs si nꞌime mmiri ahụ na-apụta, oge Jọn mechara ya baptizim, ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka Mmụọ Nsọ si nꞌeluigwe rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. |
11 |
Nꞌotu oge ahụ kwa, olu dị ukwuu sitere nꞌeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-enye m obi ụtọ.” |
12 |
Ọ dịghị anya mgbe ihe ndị a mesịrị, Mmụọ Nsọ kwaliri Jisọs ka ọ gaa nꞌime ọzara. |
13 |
Ebe ahụ ka ọ ga-anọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Nanị ya nọ nꞌebe ahụ, mmadụ ọ bụla anọkwaghị ya, kariakwa ụmụ anụ ọhịa. Ma ndị mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka. |
14 |
Emesịa, mgbe e jidere Jọn tụnye ya nꞌụlọ mkpọrọ, Jisọs gara Galili. Ebe ahụ ka ọ nọ na-ekwusa ozi ọma Chineke. |
15 |
Nke a bụ isi okwu ya, “Oge ahụ eruola. Oge Chineke ga-ebido ọchịchị ya nꞌụwa. Chegharịanụ, nabatakwaranụ onwe unu ozi ọma a!” |
16 |
Mgbe ọ na-aga ije nꞌakụkụ ọnụ mmiri osimiri Galili ọ hụrụ Saịmọn na Anduru nwanne ya. Ha bụ ndị ọkụ azụ. Jisọs hụrụ ha mgbe ha na-awụnye ụgbụ ha ji egbu azụ nꞌime mmiri. |
17 |
Jisọs kpọrọ ha sị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme ka unu ghọọ ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” |
18 |
Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha soro Jisọs. |
19 |
Mgbe Jisọs hapụrụ ebe ahụ gatụ nꞌihu nke nta, ọ hụrụ Jemes na Jọn nwanne ya. Ha abụọ bụ ụmụ Zebedi. Ha bụkwa ndị ọkụ azụ. Nꞌoge Jisọs hụrụ ha ha nọ na-adụchi ụgbụ ha dọkara adọka. |
20 |
Otu ihe ahụ Jisọs gwara Saịmọn na Anduru ka ọ gwakwara Jemes na Jọn. Na-atụfughị oge Jemes na Jọn hapụrụ nna ha nꞌime ụgbọ mmiri ha ji egbu azụ soro Jisọs. Nna Jemes na Jọn nwere ndị o goro ọrụ so ya na-arụ ọrụ nꞌoge a. |
21 |
Mgbe oge nta gasịrị, Jisọs na ndị so ya bịaruru Kapanọm. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, nke bụ ụbọchị Satọde, bụrụkwa ụbọchị ịga nꞌụlọ ekpere, Jisọs na ndị na-eso ya jere nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ. Nꞌebe ahụ, Jisọs ziri ndị bịara okwu Chineke. |
22 |
O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya otu Jisọs si kwuo okwu Chineke. Nꞌihi na o zighị ha dị ka ndị ozizi ndị Juu si ezi. Kama o ziri ha dị ka onye maara ihe nile. |
23 |
Ma nꞌụlọ ekpere ahụ e nwere otu nwoke nọ nꞌime ya nke mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe nwoke a nụrụ ihe Jisọs na-ezi, o tiri mkpu akwa sị, |
24 |
“Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Jisọs onye Nazaret? Ị̀ bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌiyi? Amaara m gị, ị bụ Ọkpara Chineke dị ndụ!” |
25 |
Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ si nꞌime nwoke a pụta!” |
26 |
Nꞌotu oge ahụ mmụọ ọjọọ ahụ mere ka akwụkwụ dọọ nwoke ahụ. Emesịa ọ kwara akwa nꞌoke olu hapụ nwoke ahụ. |
27 |
O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Anyị ga-esi aṅaa kọwaa ihe anya anyị hụrụ taa? Nꞌezie, nke a bụ nnọọ ozizi ọhụrụ! Lee, okwu ọnụ efu ka o ji nye iwu ka mmụọ ọjọọ site nꞌahụ mmadụ pụọ, ha pụkwara!” |
28 |
Ọ dịghị anya akụkọ ọrụ a Jisọs rụrụ gbasara ruo ebe nile. Ndị mmadụ bi nꞌakụkụ Galili nile nụrụ ihe banyere ya. |
29 |
Mgbe ha si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, Jisọs gara nꞌụlọ Saịmọn na Anduru. Jemes na Jọn sokwa ya gaa. |
30 |
Mgbe ha jeruru nꞌụlọ ahụ, ha hụrụ nne nwụnye Saịmọn ka o dina nꞌihe ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha gwara Jisọs banyere nke a. |
31 |
Jisọs gara nso ebe nwanyị a dina, jide ya nꞌaka, selie ya elu inyere ya aka ịnọdụ ala. Otu mgbe ahụ, ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị. Nwanyị ahụ bilikwara gaa siere ha nri anyasị. |
32 |
Nꞌoge anyasị, mgbe anwụ dara, ndị mmadụ butere ndị ha ahụ na-esighị ike, dote ha nꞌihu ụlọ ebe ahụ Jisọs nọ. Ha butekwara ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. |
33 |
Nꞌanyasị ahụ kwa, a pụrụ ịsị na ndị nile bi na Kapanọm zukọrọ nꞌihu ụlọ ahụ ịhụ Jisọs na ịnụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta. |
34 |
Jisọs pụtara nꞌezi gwọọ ndị nile ọrịa dị iche iche na-arịa. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ site nꞌahụ ndị ọ na-enye nsogbu. Ebe ọ bụ na mmụọ ọjọọ ndị a maara onye Jisọs bụ, o kweghị ka ha kwuo okwu ọ bụla mgbe ọ na-achụpụ ha. |
35 |
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, mgbe mmadụ nile nọ na-arahụ ụra, mgbe ìhè ọ bụla na-adịghị, Jisọs sitere nꞌụra teta. O sitere nꞌụlọ ahụ ọ nọ pụta, pụọ, gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, nanị ya. Nꞌebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. |
36 |
Mgbe chi bọziri Saịmọn na ndị ọzọ nọ nꞌụlọ ahụ chọgharịrị ya, ma ha ahụghị ya. Ha pụrụ jegharịa ịchọ ya. |
37 |
Mgbe oge nta gasịrị, ha hụrụ ya, gwa ya okwu sị, “Lee na ndị mmadụ jupụtara nꞌihu ụlọ ahụ na-eche gị!” |
38 |
Ma Jisọs gwara ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, ka anyị gaanụ nꞌobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m kwusaakwara ha ozi ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji bịa.” |
39 |
Ya mere, ha pụrụ jegharịa nꞌebe dị iche iche na Galili. Ebe ọ bụla ha jeruru, Jisọs kwusara ozi ọma nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ. |
40 |
Otu ụbọchị, otu onye ekpenta bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” |
41 |
Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ya. O setipụrụ aka ya metụ onye ekpenta ahụ aka sị ya, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịkwa ọcha.” |
42 |
Nꞌotu oge ahụ, ọrịa ekpenta ahụ lara. Ahụ dịkwara nwoke ahụ mma! |
43 |
Mgbe ahụ kwa, Jisọs dọrọ nwoke ahụ ọ gwọrọ aka na ntị sị ya, |
44 |
“Lee, agwakwala onye ọ bụla banyere ọgwụgwọ m gwọrọ gị. Kama laa ugbu a, gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Imekwa ka ndị ọzọ mata na a gwọọla gị gaa nye onyinye dị ka Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye.” |
45 |
Ma nwoke ahụ lara kọsaa akụkọ ọgwụgwọ ya ebe nile. Nꞌihi nke a ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Nke a mere ka o siere Jisọs ike ịbanye nꞌobodo ọ bụla mgbe ìhè dị. Ya mere, ọ nọdụrụ nꞌebe ndị mmadụ na-ebighị. Ma ọtụtụ igwe mmadụ sitekwara ebe nile bịakwute ya nꞌebe ahụ.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MAK 1:1 |
MAK 1:2 |
MAK 1:3 |
MAK 1:4 |
MAK 1:5 |
MAK 1:6 |
MAK 1:7 |
MAK 1:8 |
MAK 1:9 |
MAK 1:10 |
MAK 1:11 |
MAK 1:12 |
MAK 1:13 |
MAK 1:14 |
MAK 1:15 |
MAK 1:16 |
MAK 1:17 |
MAK 1:18 |
MAK 1:19 |
MAK 1:20 |
MAK 1:21 |
MAK 1:22 |
MAK 1:23 |
MAK 1:24 |
MAK 1:25 |
MAK 1:26 |
MAK 1:27 |
MAK 1:28 |
MAK 1:29 |
MAK 1:30 |
MAK 1:31 |
MAK 1:32 |
MAK 1:33 |
MAK 1:34 |
MAK 1:35 |
MAK 1:36 |
MAK 1:37 |
MAK 1:38 |
MAK 1:39 |
MAK 1:40 |
MAK 1:41 |
MAK 1:42 |
MAK 1:43 |
MAK 1:44 |
MAK 1:45 |
|
|
|
|
|
|
MAK 1 / MAK 1 |
MAK 2 / MAK 2 |
MAK 3 / MAK 3 |
MAK 4 / MAK 4 |
MAK 5 / MAK 5 |
MAK 6 / MAK 6 |
MAK 7 / MAK 7 |
MAK 8 / MAK 8 |
MAK 9 / MAK 9 |
MAK 10 / MAK 10 |
MAK 11 / MAK 11 |
MAK 12 / MAK 12 |
MAK 13 / MAK 13 |
MAK 14 / MAK 14 |
MAK 15 / MAK 15 |
MAK 16 / MAK 16 |