1 |
“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. |
2 |
Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị. |
3 |
Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya? |
4 |
Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ? |
5 |
Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya. |
6 |
“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụ ahịa. Ha ga-azọ ha ụkwụ ma lusịkwa gị ọgụ. |
7 |
“Rịọọ, ị ga-arịọta, chọọ, ị ga-achọta. Kụọọ aka, a ga-emeghere gị ụzọ. |
8 |
Onye ọ bụla na-arịọ na-arịọta. Onye na-achọ na-achọtakwa. Onye na-akụ aka ka a ga-emeghere ụzọ. |
9 |
Ọ bụrụ na nwantakịrị arịọọ nna ya beredi, ọ ga-enye ya nkume? |
10 |
Ọ bụrụkwa na ọ rịọọ ya azụ, ọ ga-enye ya agwọ? |
11 |
Ebe unu ndị mmehie pụrụ inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nꞌeluigwe ga-enyekwa unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya. |
12 |
“Meere ndị ọzọ dị ka i si chọọ ka ha meere gị. Nke a bụ ihe Mosisi na ndị amụma ziri. |
13 |
“Ụzọ dị warara na-eduba nꞌeluigwe. Site na ya baa. Ụzọ dị obosara na-eduba nꞌọkụ. Ọtụtụ mmadụ na-esoro ya nꞌihi na ọ dị mfe. |
14 |
Ole na ole na-achọta ụzọ na-eduba na ndụ, nꞌihi na ọ dị warara. |
15 |
“Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu. |
16 |
Unu ga-amata ha site nꞌụdị ndụ ha na-ebi. A na amara osisi ọ bụla site na mkpụrụ ya. Ị gaghị ahụ mkpụrụ ose kpọọ ya mkpụrụ aṅara. |
17 |
A na-esite na mkpụrụ nke osisi mịpụtara mata ụdị osisi ọ bụ. |
18 |
Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma. |
19 |
Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ. |
20 |
Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya. |
21 |
“Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee. |
22 |
Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’ |
23 |
Ma aga m asị ha, sitenụ nꞌihu m pụọ, amaghị m unu, nꞌihi na ọrụ unu dị njọ. |
24 |
“Onye ọ bụla ṅara ntị nꞌokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nꞌelu nkume sịrị ike. |
25 |
Mmiri zosikwara ike nꞌelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara gburugburu ụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nꞌihi na e wuru ya nꞌelu nkume. |
26 |
“Ma ndị nile nụrụ okwu ndị a, ma lefuo ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu aja. |
27 |
Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike, ma ụlọ ahụ dara daruo ala.” |
28 |
Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru ndị mmadụ ahụ nile anya. |
29 |
Nꞌihi na Jisọs ziri ha ihe dị ka onye ike nile dị nꞌaka. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi ndị Juu.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 7:1 |
MATIU 7:2 |
MATIU 7:3 |
MATIU 7:4 |
MATIU 7:5 |
MATIU 7:6 |
MATIU 7:7 |
MATIU 7:8 |
MATIU 7:9 |
MATIU 7:10 |
MATIU 7:11 |
MATIU 7:12 |
MATIU 7:13 |
MATIU 7:14 |
MATIU 7:15 |
MATIU 7:16 |
MATIU 7:17 |
MATIU 7:18 |
MATIU 7:19 |
MATIU 7:20 |
MATIU 7:21 |
MATIU 7:22 |
MATIU 7:23 |
MATIU 7:24 |
MATIU 7:25 |
MATIU 7:26 |
MATIU 7:27 |
MATIU 7:28 |
MATIU 7:29 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / MAT 1 |
MATIU 2 / MAT 2 |
MATIU 3 / MAT 3 |
MATIU 4 / MAT 4 |
MATIU 5 / MAT 5 |
MATIU 6 / MAT 6 |
MATIU 7 / MAT 7 |
MATIU 8 / MAT 8 |
MATIU 9 / MAT 9 |
MATIU 10 / MAT 10 |
MATIU 11 / MAT 11 |
MATIU 12 / MAT 12 |
MATIU 13 / MAT 13 |
MATIU 14 / MAT 14 |
MATIU 15 / MAT 15 |
MATIU 16 / MAT 16 |
MATIU 17 / MAT 17 |
MATIU 18 / MAT 18 |
MATIU 19 / MAT 19 |
MATIU 20 / MAT 20 |
MATIU 21 / MAT 21 |
MATIU 22 / MAT 22 |
MATIU 23 / MAT 23 |
MATIU 24 / MAT 24 |
MATIU 25 / MAT 25 |
MATIU 26 / MAT 26 |
MATIU 27 / MAT 27 |
MATIU 28 / MAT 28 |