1 |
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, |
2 |
“Dị ka unu maara nke ọma, mmemme ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nꞌoge ahụ a ga-ararakwa m nye ka a kpọgide m nꞌobe.” |
3 |
Nꞌoge ahụ, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu, na ndị okenye ndị Juu zukọtara nꞌime ụlọ Kaịfas onyeisi nchụaja. |
4 |
Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya. |
5 |
Ha kwekọrịta sị, “Anyị agaghị egbu ya tutuu mmemme ngabiga agafechaa, ka ọ hapụ iweta ọgba aghara nꞌetiti ndị bịara maka mmemme ahụ.” |
6 |
Jisọs jere Betanị, banye nꞌụlọ nwoke a na-akpọ Saịmọn, onye ekpenta. |
7 |
Mgbe ọ nọ na-eri nri nꞌebe ahụ, otu nwanyị batara nꞌime ụlọ ahụ. O ji karama mmanụ otite dị oke ọnụ ahịa nꞌaka ya. O meghere mmanụ ahụ wụọ ha nile nꞌisi Jisọs. |
8 |
Ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe nwanyị a mere wee iwe nke ukwuu nꞌihi ya. Ha sịrị, “Nke a bụ nnọọ itufu ego! |
9 |
A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara nyere ndị ogbenye aka.” |
10 |
Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nꞌobi ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ata nwanyị ụta? Ọ̀ bụ nꞌihi na ọ na-emere ihe ọma? |
11 |
Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge nile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe nile. |
12 |
Ihe nwanyị a mere, ịwụ m mmanụ a nꞌahụ, bụ idozi ahụ m nꞌihi olili nke a ga-eli ya. |
13 |
Nꞌezie, ana m agwa unu sị, na ebe ọ bụla e zisara ozi ọma a nꞌuwa nile, a ga na-echeta nwanyị a nꞌihi ihe ọma a o meere m.” |
14 |
Mgbe ahụ otu nꞌime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Juda Iskariọt, jekwuuru ndị isi nchụaja. |
15 |
Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ego ole ka unu ga-akwụ m ma ọ bụrụ na m arara Jisọs nye nꞌaka unu?” Ha kwekọrịtara kwụọ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. |
16 |
Site nꞌụbọchị ahụ, Judas chọgidesịrị ohere ike ịrara Jisọs nye nꞌaka ha. |
17 |
Nꞌụbọchị mbụ nke mmemme ngabiga, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị nọrọ dozie ihe nꞌihi oriri anyị?” |
18 |
Jisọs zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nꞌime obodo sị ya, Onye ozizi anyị sịri na oge m abịala. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri mmemme ngabiga anyị nꞌụlọ gị.” |
19 |
Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka ọ gwara ha, doziekwa oriri anyasị ahụ nꞌebe ahu. |
20 |
Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala na-eri oriri ahụ. |
21 |
Mgbe ha na-eri nri, Jisọs kwuru sị, “Ana m agwa unu eziokwu, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m.” |
22 |
Okwu a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu. Ha malitere ịjụ ya nꞌotu nꞌotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m? Ọ bụ m?” |
23 |
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-erikọ nri nꞌotu efere. |
24 |
Lee na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-anwụ dị ka e si buo ya nꞌamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esite nꞌaka ya rara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m. Ọ gaara akara ya onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” |
25 |
Judas, onye ahụ ga-arara ya nye biliri ọtụ jụọ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Jisọs zara sị, “Ee, ọ bụ gị.” |
26 |
Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe beredi gọzie ya. Ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ beredi a rie, nꞌihi na nke a bụ anụ ahụ m.” |
27 |
Mgbe ahụ kwa, ọ naara iko mmanya vaịnị nye Chineke ekele nꞌihi ya, nyekwa ha ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu nile ṅụọnụ site nꞌiko a. |
28 |
Nꞌihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya nꞌihi mgbaghara mmehie ọtụtụ mmadụ. |
29 |
Ana m agwa unu eziokwu mgbe m na-asị na agaghị m aṅụ mmanya a ọzọ tutuu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nꞌụzọ dị iche nꞌalaeze Nna m.” |
30 |
Mgbe ha bụsịrị abụ, ha sitere nꞌebe ahụ pụọ gawa nꞌelu ugwu olivu. |
31 |
Nꞌebe ahụ ka Jisọs nọ gwa ha okwu sị, “Nꞌabalị taa unu ga-agba ọsọ hapụ nanị m. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Aga m egbu onye ọzụzụ atụrụ ahụ, mee ka igwe atụrụ ya gbasasịa.’ |
32 |
Ma mgbe e mere ka m si na ndị nwụrụ anwụ bilie, aga m aga Galili izute unu nꞌebe ahụ.” |
33 |
Pita jiri oke olu kwuo okwu sị, “Ọ bụrụ na mmadụ nile ahapụ gị gbalaa, agaghị m ahapụ gị.” |
34 |
Jisọs gwara ya sị, “Nꞌabalị taa, tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa nꞌisi ụtụtụ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” |
35 |
Ma Pita nọgidesịrị ike nꞌokwu ya sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ agaghị m agọnarị gị.” Ndị na-eso ụzọ ya nile kwuru otu ihe ahụ. |
36 |
Mgbe Jisọs bịara nꞌogige ahụ a na-akpọ Getsamane, ọ gwara ndị na-eso ụzọ okwu sị ha, “Nꞌọdụnụ nꞌebe a ka m gaa nꞌihu nke nta kpee ekpere.” |
37 |
Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ, Jemes na Jọn. Ọ malitere inwe obi mwute nꞌime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. |
38 |
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi ruo nꞌọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nꞌebe a soro m na-eche nche.” |
39 |
Ọ gara nꞌihu nke nta daa nꞌala, kpuo ihu ya nꞌala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mee, kama ka e mee ihe ị na-achọ.” |
40 |
Mgbe ọ lọghachiri nꞌebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ hụrụ ha ka ha nọ na-arahụ ụra. Ọ kpọrọ Pita sị ya, “Gịnị mere unu mmadụ atọ enweghị ike soro m chee nche, ọ bụladị nwa oge nta? |
41 |
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.” |
42 |
Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya ka e mee uche gị.” |
43 |
Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arahụ ụra, nꞌihi na ha enweghị ike ighewe anya ha oghe. |
44 |
Jisọs hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. |
45 |
Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha okwu sị, “Unu nọrịrị na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Mbaa! Lee, oge ahụ abịala! Oge a ga-arara m nye nꞌaka ndị mmehie. |
46 |
Bilienụ ka anyị na-aga nꞌihu! Lee, nwoke ahụ na-arara m nye na-abịa ugbu a!” |
47 |
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndị isi nchuaja na ndị okenye ndị Juu nile zitere ha. |
48 |
Judas agwala ha rị na nzuzo sị, “Nwoke ahụ m ga-esutu ọnụ bụ onye unu na-achọ, jidesienụ ya aka ike!” |
49 |
Ya mere, mgbe Judas bịaruru, ọ bịakwutere Jisọs sị ya, “Ekele, onye ozizi!” O sutukwara ya ọnụ. |
50 |
Jisọs zara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ ndị ahụ ha na Judas so bịara jide Jisọs nꞌike. |
51 |
Otu onye nꞌime ndị ha na Jisọs nọ mịpụtara mma agha ya jiri ya bipụ ntị ohu onyeisi nchụaja. |
52 |
Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nꞌọbọ ya, nꞌihi na mmadụ ọ bụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya, ga-anwụ site na mma. |
53 |
I cheghị na m pụrụ ịkpọ Nna m oku ka o zitere m igwe ndị mmụọ ozi, ka ha bịa napụta m? |
54 |
Ọ bụrụkwanụ na m emee otu a, a ga-esi aṅaa mee ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru mezuo? Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ihe ndị a na-eme ugbu a aghaghị imezu otu a.” |
55 |
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ igwe mmadụ ahụ ajụjụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na osisi bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọ m ziekwa ihe nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m. |
56 |
Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo.” Nꞌoge ihe ndị a nile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya nile hapụrụ ya gbalaga. |
57 |
Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nꞌụlọ Kaifas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nꞌebe ahụ. |
58 |
Pita sogidere Jisọs nꞌazụ site nꞌebe dị anya. O rutere nꞌobi onyeisi nchụaja, baa nꞌime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwee ike ịhụ ihe ha ga-eme Jisọs. |
59 |
Ndị isi nchụaja, ndị okenye na ndị ụlọ ikpe ndị Juu gbalịsiri ike ịchọpụta ebubo ụgha dị iche iche ha ga-ebo Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. |
60 |
Ma ha achọtaghị ihe ọ bụla. Ọ bụ ezie na ha chọtara ọtụtụ mmadụ ndị gbalịrị ibo ya ebubo ụgha. Nꞌikpeazụ nanị mmadụ abụọ nọgidesịrị ike kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọ nsọ ukwu Chineke, wughachikwa ya nꞌụbọchị atọ.’ ” |
61 |
*** |
62 |
Onyeisi nchụaja biliri ọtọ jụọ Jisọs sị, “I nweghị ihe ọ bụla ị ga-ekwu banyere ebubo ndị a ha na-ebo gị?” |
63 |
Ma Jisọs ekwụghị ihe ọ bụla. Onyeisi nchụaja jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị, “Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, gwa anyị, ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke?” |
64 |
Jisọs zara ya sị, “Ee, abụ m ya. Nꞌezie asị m unu, na mgbe na-adịghị anya, unu ga-ahụ m, bụ Onye nzọpụta ahụ, ka m na-anọdụ nꞌaka nri Chineke. Unu ga-ahụkwa m mgbe m ga-abịa nꞌigwe ojii nke eluigwe.” |
65 |
Mgbe o kwusịrị okwu a, onyeisi nchụaja dọwara uwe o yi nꞌahụ nꞌiwe, kwụo sị, “O kwuluola Chineke! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara ajọ okwu sị ya nꞌọnụ pụta? |
66 |
Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “Ikpe mara ya, o kwesịrị ka ọ nwụọ!” |
67 |
Mgbe ahụ ha malitere ịbụ ya ọnụ mmiri nꞌihu, na iti ya oke ihe otiti. Ndị ji ọbụaka ha tie ya ihe jụrụ ya sị, |
68 |
“Ị bụrụ onye amụma nꞌezie, bụrụkwa Onye nzọpụta ahụ, kpọọ aha onye tiri gị ihe.” |
69 |
Mgbe ihe ndị a na-eme, Pita nọ nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ. Otu nꞌime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịakwutere ya sị ya, “Ị bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.” |
70 |
Ma Pita gọrọ nꞌihu ha nile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” O biliri ọtọ si nꞌebe ahụ pụọ. |
71 |
Mgbe ọ pụrụ nꞌezi, nwagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nwoke nọ nꞌebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret anọkọkwaala.” |
72 |
Ọzọ kwa Pita weere ịṅụ iyi gọọ sị, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.” |
73 |
Mgbe oge nta gasịrị, ndị nwoke guzo nꞌebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nꞌezie, ị bụ otu nꞌime ha. Anyị esitela nꞌasụsụ ị na-asụ ghọta na ị bụ onye Galili.” |
74 |
Pita malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a ma ọlị.” |
75 |
Mgbe ahụ kwa oke ọkụkọ kwara akwa. Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O siri nꞌebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 26:1 |
MATIU 26:2 |
MATIU 26:3 |
MATIU 26:4 |
MATIU 26:5 |
MATIU 26:6 |
MATIU 26:7 |
MATIU 26:8 |
MATIU 26:9 |
MATIU 26:10 |
MATIU 26:11 |
MATIU 26:12 |
MATIU 26:13 |
MATIU 26:14 |
MATIU 26:15 |
MATIU 26:16 |
MATIU 26:17 |
MATIU 26:18 |
MATIU 26:19 |
MATIU 26:20 |
MATIU 26:21 |
MATIU 26:22 |
MATIU 26:23 |
MATIU 26:24 |
MATIU 26:25 |
MATIU 26:26 |
MATIU 26:27 |
MATIU 26:28 |
MATIU 26:29 |
MATIU 26:30 |
MATIU 26:31 |
MATIU 26:32 |
MATIU 26:33 |
MATIU 26:34 |
MATIU 26:35 |
MATIU 26:36 |
MATIU 26:37 |
MATIU 26:38 |
MATIU 26:39 |
MATIU 26:40 |
MATIU 26:41 |
MATIU 26:42 |
MATIU 26:43 |
MATIU 26:44 |
MATIU 26:45 |
MATIU 26:46 |
MATIU 26:47 |
MATIU 26:48 |
MATIU 26:49 |
MATIU 26:50 |
MATIU 26:51 |
MATIU 26:52 |
MATIU 26:53 |
MATIU 26:54 |
MATIU 26:55 |
MATIU 26:56 |
MATIU 26:57 |
MATIU 26:58 |
MATIU 26:59 |
MATIU 26:60 |
MATIU 26:61 |
MATIU 26:62 |
MATIU 26:63 |
MATIU 26:64 |
MATIU 26:65 |
MATIU 26:66 |
MATIU 26:67 |
MATIU 26:68 |
MATIU 26:69 |
MATIU 26:70 |
MATIU 26:71 |
MATIU 26:72 |
MATIU 26:73 |
MATIU 26:74 |
MATIU 26:75 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / MAT 1 |
MATIU 2 / MAT 2 |
MATIU 3 / MAT 3 |
MATIU 4 / MAT 4 |
MATIU 5 / MAT 5 |
MATIU 6 / MAT 6 |
MATIU 7 / MAT 7 |
MATIU 8 / MAT 8 |
MATIU 9 / MAT 9 |
MATIU 10 / MAT 10 |
MATIU 11 / MAT 11 |
MATIU 12 / MAT 12 |
MATIU 13 / MAT 13 |
MATIU 14 / MAT 14 |
MATIU 15 / MAT 15 |
MATIU 16 / MAT 16 |
MATIU 17 / MAT 17 |
MATIU 18 / MAT 18 |
MATIU 19 / MAT 19 |
MATIU 20 / MAT 20 |
MATIU 21 / MAT 21 |
MATIU 22 / MAT 22 |
MATIU 23 / MAT 23 |
MATIU 24 / MAT 24 |
MATIU 25 / MAT 25 |
MATIU 26 / MAT 26 |
MATIU 27 / MAT 27 |
MATIU 28 / MAT 28 |