A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

MATIU 25



1
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere iheọkụ ha pụta izute onye na-alụ nwụnye ọhụrụ.
2
Ise nꞌime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.
3
Ise ndị nzuzu ahụ weere iheọkụ ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ ga-ezuru ha.
4
Ise ndị maara ihe wụjuru mmanụ nꞌiheọkụ ha, ma tinyekwara onwe ha karama mmanụ ọkụ ọzọ.
5
“Mgbe onye na-alụ nwụnye ọhụrụ ahụ nọrọ tee anya nꞌọbịbịa ya, ụmụ agbọghọ nile ahụ dinara ala rahụ ụra.
6
Nꞌetiti abalị e tiri mkpu nꞌoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwụnye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’
7
“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ nile biliri mụnye ọkụ ha.
8
Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nꞌime mmanụ ọkụ unu, lee na iheọkụ anyị na-anyụ anyụ.’
9
“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Ọ̀ dịghị! Mmanụ ọkụ anyị nwere adịghị ukwuu, ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ nꞌebe a na-ere mmanụ ọkụ zụrụ nke ga-ezuru unu.’
10
“Ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ gara. Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwụnye ọhụrụ bịarutere. Ụmụ agbọghọ ndị jikeere ejike gara zute ya, sorokwa nꞌoriri ọlụlụ nwụnye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
11
“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri guzo nꞌezi kụọ aka nꞌụzọ, kpọọkwa oku sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ!’
12
“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Amaghị m ndị unu bụ.’
13
“Ya mere, na-anọgidenụ na che, nꞌihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge ahụ m ga-alọghachi.
14
“A ga-ewerekwa alaeze eluigwe tụnyere akụkọ otu nwoke chọrọ ịga obodo ọzọ. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya nile nye ha ego nꞌotu nꞌotu, ka ha jiri ya malite ịzụ ahịa tutuu ruo mgbe ọ ga-alọta.
15
“O nyere ohu ya nke mbụ narị naịra ise. Ohu nke abụọ ka o nyere narị naịra abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu narị naịra. O nyere ha nꞌotu nꞌotu dị ka ike ha ha. Mgbe o mesịrị otu a, ọ hapụrụ ha gaa ije ya.
16
Ohu ahụ natara narị naịra ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o ritere narị naịra ise ọzọ nꞌuru.
17
Otu a kwa, onye nke e nyere narị naịra abụọ zụpụtakwara narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.
18
“Ma ohu ahụ natara otu narị naịra gara gwuo ala lie ya, nꞌihi ichezi ya nke oma.
19
“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ha ukwu lọtara site nꞌije ya. Ọ kpọkọtara ha nile ka ha gụzie ego ya.
20
Nwoke ahụ o nyere narị naịra ise batara wetakwa narị naịra ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘I nyere m narị naịra ise, ma ugbu a azụpụtala m narị naịra ise ọzọ.’
21
“Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’
22
“Onye nke e nyere narị naịra abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m narị naịra abụọ. Lee nꞌebe a, azụpụtala narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.’
23
“Nna ya ukwu sịrị, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’
24
“Onye e nyere otu narị naịra batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nꞌebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nꞌebe ị na-agbasaghị.
25
Atụrụ m egwu gị, nꞌihi na amaara m onye ị bụ. Ya mere eweere m ego gị liere gị nꞌala. Lee ya nꞌebe a!’
26
“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ! Ị maara na m na-ewe ihe ubi nꞌebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nꞌebe m na-agbasaghị.
27
Ị gaara etinye ego m nꞌaka ndị na-eche ego, ndị gaara akwụghachi ya na ụma ya.
28
Napụtanụ ya narị naịra ahụ o ji, ma were ya nye nwoke ahụ ji narị naịra ise!
29
Nꞌihi na nwoke ahụ na-ejizi ihe e nyere ya ka a ga-enye ihe ọzọ. Ọ ga-enwebigakwa ihe oke. Ma site nꞌaka nwoke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka a ga-anapụ, ọ bụladị ihe nta ahụ e nyere ya.
30
Chụpụnụ ohu ọjọọ a na-abaghị uru nꞌọchịchịrị ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze ya.’
31
“Mgbe mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube m, mụ na ndị mmụọ ozi nile dị nsọ, mgbe ahụ ka m ga-anọ nꞌelu ocheeze ebube m.
32
Mba nile nke ụwa ga-ezukọtakwa nꞌihu m. M ga-ekewapụta ha, otu obodo site nꞌibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta ụmụ atụrụ site nꞌụmụ ewu.
33
M ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nꞌakụkụ aka nri m, ma ụmụ ewu ga-anọ nꞌaka ekpe m.
34
“Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
35
Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.
36
***
37
“Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?
38
Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe?
39
Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’
40
“Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.
41
“Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.
42
Nꞌihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọ bụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.
43
Mgbe m nọ dị ka ọbịa unu akpọbataghi m nꞌulo unu, mgbe m na-agba ọtọ unu enyeghị m uwe ka m kpuchie ọtọ m. Mgbe ahụ na-esighị m ike unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.
44
“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ oge ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ oge ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ oge ị nọ nꞌọrịa, ma ọ bụ ị nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’
45
“M ga-aza ha sị, eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nꞌime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ inyere aka.
46
“Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”











MATIU 25:1
MATIU 25:2
MATIU 25:3
MATIU 25:4
MATIU 25:5
MATIU 25:6
MATIU 25:7
MATIU 25:8
MATIU 25:9
MATIU 25:10
MATIU 25:11
MATIU 25:12
MATIU 25:13
MATIU 25:14
MATIU 25:15
MATIU 25:16
MATIU 25:17
MATIU 25:18
MATIU 25:19
MATIU 25:20
MATIU 25:21
MATIU 25:22
MATIU 25:23
MATIU 25:24
MATIU 25:25
MATIU 25:26
MATIU 25:27
MATIU 25:28
MATIU 25:29
MATIU 25:30
MATIU 25:31
MATIU 25:32
MATIU 25:33
MATIU 25:34
MATIU 25:35
MATIU 25:36
MATIU 25:37
MATIU 25:38
MATIU 25:39
MATIU 25:40
MATIU 25:41
MATIU 25:42
MATIU 25:43
MATIU 25:44
MATIU 25:45
MATIU 25:46






MATIU 1 / MAT 1
MATIU 2 / MAT 2
MATIU 3 / MAT 3
MATIU 4 / MAT 4
MATIU 5 / MAT 5
MATIU 6 / MAT 6
MATIU 7 / MAT 7
MATIU 8 / MAT 8
MATIU 9 / MAT 9
MATIU 10 / MAT 10
MATIU 11 / MAT 11
MATIU 12 / MAT 12
MATIU 13 / MAT 13
MATIU 14 / MAT 14
MATIU 15 / MAT 15
MATIU 16 / MAT 16
MATIU 17 / MAT 17
MATIU 18 / MAT 18
MATIU 19 / MAT 19
MATIU 20 / MAT 20
MATIU 21 / MAT 21
MATIU 22 / MAT 22
MATIU 23 / MAT 23
MATIU 24 / MAT 24
MATIU 25 / MAT 25
MATIU 26 / MAT 26
MATIU 27 / MAT 27
MATIU 28 / MAT 28