1 |
Mgbe Jisọs si nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ na-apụta, ndị na-eso ụzọ ya duruu ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ukwu ahụ. |
2 |
Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu hụrụ ụlọ ukwu a? Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nꞌelu ibe ya.” |
3 |
Mgbe ọ nọdụrụ ala nꞌelu ugwu olivu, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị kwa ga-abụ ihe ga-egosi anyị na oge i ji alọghachi na ọgwụgwụ ụwa eruola?” |
4 |
Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu. |
5 |
Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa ndị ga-asịkwa, ‘Abụ m Onye nzọpụta ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ọzọ. |
6 |
Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nꞌihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha egosighị na oge nlọghachi m eruola. |
7 |
Obodo ga-alụso obodo ibe ya ọgụ, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; ọke ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa nꞌọtụtụ ebe dị iche iche. |
8 |
Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalịte ịta ahụhụ nke ga-abịa. |
9 |
“Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. |
10 |
Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị. |
11 |
Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ nꞌokwukwe ha. |
12 |
Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu. |
13 |
Ma ndị nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. |
14 |
“A ga-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke nꞌebe nile ụwa sọtụrụ, nꞌụzọ onye ọ bụla ga-anụ ya. Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ oge ga-abịa nꞌikpeazụ. |
15 |
“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe unu na-ahụbeghị mbụ, nke e kwuru okwu ya site nꞌọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nꞌebe nsọ, (onye na-agụ tụgharịa uche ghọta ihe ọ pụtara), |
16 |
mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia were ọsọ gbalaga nꞌelu ugwu. |
17 |
Ka ndị nọ nꞌelu ụlọ hapụ ịrịdata ịbanye nꞌime ụlọ ha ịkwapụta ngwongwo ha, tupuu ha amalite ịgbalaga nꞌelu ugwu. |
18 |
Ka ndị nọ nꞌubi hapụ ịlọghachi nꞌụlọ ha ịchịrị uwe ha. |
19 |
“Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụ ara nꞌụbọchị ahụ. |
20 |
Kpeerenụ Chineke ekpere ka unu ghara ịgba ọsọ a nꞌoge oke oyi, ma ọ bụ nꞌụbọchị izuike. |
21 |
Nꞌihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. |
22 |
“Nꞌezie, ọ bụ nanị ma e mere ka ụbọchị ahụ dị mkpụmkpụ, ma ọ bụghị otu a, mmadụ nile ga-ala nꞌiyi. Ma Chineke ga-eme ka ha dịrị mkpụmkpụ nꞌihi ndị ya ọ họpụtara. |
23 |
“Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Ahụrụ m Onye nzọpụta ahụ, ọ nọ nꞌebe a, ma ọ bụ nꞌebe ọzọ’ unu ekwela. |
24 |
Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara. |
25 |
Chetakwanụ na agwala m unu ihe ndị a nile, tupuu ha emezuo. |
26 |
“Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu na Onye nzọpụta abịala, na ọ nọ nꞌime ọzara, ma ọ bụ na ọ dị ebe o zoro onwe ya, unu ekwela. |
27 |
Nꞌihi na mụ, bụ Nwa nke mmadụ, ga-abịa dị ka amụma eluigwe, nke a na-ahụ anya site nꞌọwụwa anyanwụ ruo nꞌọdịda anyanwụ. |
28 |
Chetakwanụ na ebe ọ ụla ozu dị ebe ahụ ka udele na-ezukọta. |
29 |
“Ngwangwa, mgbe mkpagbu nke ụbọchị ahụ nile gabigasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè na mbara eluigwe. Ndị nile nọ nꞌụwa ga-eru uju nꞌụbọchị ahụ, mgbe mba dị iche iche ga-ahụ m, ka m na-abịa nꞌike na ebube, site nꞌime igwe ojii nke eluigwe. |
30 |
*** |
31 |
Aga m ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke eluigwe na ụwa. |
32 |
“Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya jupụtara nꞌahịhịa ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. |
33 |
Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile ka ha na-eme marakwanụ na anọ m nso, na ọbịbịa m dị nnọọ nso. |
34 |
Ihe ndị a nile aghaghị imezu tupuu ọgbọ a agabiga. |
35 |
“Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m nile ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. |
36 |
“Ma o nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi amaghị ya. Ọkpara Chineke amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna ya maara. |
37 |
“Ọbịbịa m ga-adị ka ihe mere nꞌoge Noa. |
38 |
Nꞌoge ahụ ndị bi nꞌụwa ga na-ebi ndụ ha. Ha ga na-akpọkwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ụfọdụ ga na-alụ di na nwụnye ha dị ka ọ dị nꞌoge Noa. Ma na mberede, oke mmiri ahụ bịakwasịrị ha, ma Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ya. |
39 |
Ndị mmadụ ekwenyeghị na ọ dị ihe ga-eme tutuu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha nile. Otu ahụ ka ọbịbịa m ga-adị. |
40 |
“Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nꞌubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ. |
41 |
Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka ha nꞌụlọ igwe na-akwọ ọka, a ga-ewepụ otu, ma hapụ nke ọzọ. |
42 |
Nꞌihi nke a, na-echenụ nche, nꞌihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. |
43 |
“Dị ka nna nwe ụlọ pụrụ isi gbochie ndị ohi ka ha ghara igbuka ụlọ ya site nꞌịnọ na nche abalị nile, |
44 |
otu a ka unu onwe unu pụrụ isi gbanarị nsogbu site nꞌịnọgide na nche oge nile, nꞌihi na unu amaghị oge m ga-abịa. |
45 |
“Ị̀ bụ ohu ahụ maara ihe, nke kwesịkwara ntụkwasị obi, onye e mere onyeisi ezinụlọ m, ka ị na-enye ụmụntakịrị m nri nꞌoge ha chọrọ ya? |
46 |
Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, ma ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ gị nꞌeziokwu mgbe m ga-alọghachi. |
47 |
Nꞌezie, aga m eme gị onyeisi ihe nile m nwere. |
48 |
“Ma ị bụrụ ohu nke na-asị nꞌobi ya, ‘Onyenwe m ga-anọ tee anya tupuu ọ lọta’, |
49 |
ị malite na-eti ndị ohu ibe gị ihe, sorokwa ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-eri, na-aṅụkwa, |
50 |
Onyenwe gị ga-alọta nꞌụbọchị ị na-atụghị anya ya. |
51 |
Ọ ga-etikwa gị oke ihe otiti, zipụ gị ka e kpee gị ikpe dị ka onye ihu abụọ. Nꞌebe ahụ ka ị ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze.”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 24:1 |
MATIU 24:2 |
MATIU 24:3 |
MATIU 24:4 |
MATIU 24:5 |
MATIU 24:6 |
MATIU 24:7 |
MATIU 24:8 |
MATIU 24:9 |
MATIU 24:10 |
MATIU 24:11 |
MATIU 24:12 |
MATIU 24:13 |
MATIU 24:14 |
MATIU 24:15 |
MATIU 24:16 |
MATIU 24:17 |
MATIU 24:18 |
MATIU 24:19 |
MATIU 24:20 |
MATIU 24:21 |
MATIU 24:22 |
MATIU 24:23 |
MATIU 24:24 |
MATIU 24:25 |
MATIU 24:26 |
MATIU 24:27 |
MATIU 24:28 |
MATIU 24:29 |
MATIU 24:30 |
MATIU 24:31 |
MATIU 24:32 |
MATIU 24:33 |
MATIU 24:34 |
MATIU 24:35 |
MATIU 24:36 |
MATIU 24:37 |
MATIU 24:38 |
MATIU 24:39 |
MATIU 24:40 |
MATIU 24:41 |
MATIU 24:42 |
MATIU 24:43 |
MATIU 24:44 |
MATIU 24:45 |
MATIU 24:46 |
MATIU 24:47 |
MATIU 24:48 |
MATIU 24:49 |
MATIU 24:50 |
MATIU 24:51 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / MAT 1 |
MATIU 2 / MAT 2 |
MATIU 3 / MAT 3 |
MATIU 4 / MAT 4 |
MATIU 5 / MAT 5 |
MATIU 6 / MAT 6 |
MATIU 7 / MAT 7 |
MATIU 8 / MAT 8 |
MATIU 9 / MAT 9 |
MATIU 10 / MAT 10 |
MATIU 11 / MAT 11 |
MATIU 12 / MAT 12 |
MATIU 13 / MAT 13 |
MATIU 14 / MAT 14 |
MATIU 15 / MAT 15 |
MATIU 16 / MAT 16 |
MATIU 17 / MAT 17 |
MATIU 18 / MAT 18 |
MATIU 19 / MAT 19 |
MATIU 20 / MAT 20 |
MATIU 21 / MAT 21 |
MATIU 22 / MAT 22 |
MATIU 23 / MAT 23 |
MATIU 24 / MAT 24 |
MATIU 25 / MAT 25 |
MATIU 26 / MAT 26 |
MATIU 27 / MAT 27 |
MATIU 28 / MAT 28 |