1 |
Mgbe oge ahụ gafesịrị, ọ dịghị anya Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ sitere nꞌubi a kụrụ ọka na-agafe nꞌụbọchị izuike. Ebe ọ bụ na agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha ghọọrọ ụfọdụ ọka taa. |
2 |
Ma ụfọdụ nꞌime ndị Farisịi hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a, gwa Jisọs sị, “Lee ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme! Ha na-emebi iwu! Ha na-aghọ ọka nꞌụbọchị izuike!” |
3 |
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ gwara anyị na eze Devidi na ndị enyi ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? |
4 |
A gwara anyị nꞌakwụkwọ nsọ na Devidi na ndị enyi ya banyere nꞌime ụlọ nsọ Chineke rie beredi dị nsọ e ji chụọra Chineke aja. Beredi nke nanị ndị nchụaja kwesịrị iri. Ma Devidi mebiri iwu site nꞌiri beredi ahụ, ya na ndị so ya. |
5 |
Ọzọ, ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nꞌime akwụkwọ iwu Mosisi na ndị nchụaja na-emebi iwu site nꞌịrụ ọrụ nꞌụbọchị izuike? Ma ọ dịghị onye na-agụ ha dị ka ndị na-emebi iwu. |
6 |
Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọ nsọ ukwu Chineke nọ nꞌebe a. |
7 |
Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Achọrọ m ka unu buru ndị na-eme ebere karịa ndị na-achụ aja’, unu agaghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. |
8 |
Nꞌihi na Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike.” |
9 |
Jisọs sitere nꞌebe ahụ pụọ banye nꞌụlọ ekpere ndị Juu. |
10 |
Nꞌebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nꞌebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “O ziri ezi nꞌiwu ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike?” |
11 |
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nꞌime unu enwee otu atụrụ danyere nꞌime olulu nꞌụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ ga-ahapụ ya nꞌebe ahụ? Ọ gaghị agbalị wepụta ya? |
12 |
Mmadụ ọ̀ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, ọ dị mma ịrụ ọrụ ọma nꞌụbọchị izuike.” |
13 |
Ọ kpọrọ nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Setipụ aka gị!” Nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ. |
14 |
Ma ndị Farisii sitere nꞌebe ahụ pụọ, kpọọ nzukọ ịgba izu otu ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya. |
15 |
Ma Jisọs maara ihe ha na-ezube ime. Nꞌihi ya o sitere nꞌụlọ ekpere ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịrịa ha nile. |
16 |
Ma o nyere ha iwu sị ha agbasala akụkọ ọrụ ebube ọ na-arụ. |
17 |
Nke a mere ka amụma ahụ Aịzaya buru banyere ya mezuo. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, |
18 |
“Onye a bụ ohu m, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nꞌanya. Ọ bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye mmụọ m nꞌime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba nile aka. |
19 |
Ọ gaghị ese okwu, ma ọ bụ lụọ ọgụ. O nweghị onye ga-anụ oke okwu ya nꞌezi. |
20 |
Ọ gaghị emegide ndị na-adịghị ike. Ọ ga-akwali ndị olileanya ha dị nta, tutuu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. |
21 |
Ọ bụkwa site nꞌịkpọ aha ya ka mba nile dị nꞌụwa ga-enwe olileanya.” |
22 |
Emesịa, ha kpọtaara Jisọs otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Jisọs gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ. O mekwara ka o bido ikwu okwu. |
23 |
Ọrụ a Jisọs rụrụ juru igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ anya. Nꞌihi ya, ha kwuru sị, “Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ, Nwa Devidi?” |
24 |
Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ha kwuru, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nꞌihi na ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.” |
25 |
Ma Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Mba ọ bụla ndị bi nꞌime ya na-alụrịta ọgụ enweghị ike ịdịgide ruo oge dị anya. Obodo ọ bụla, ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla e nwere nkewa na ịlụ ọgụ, nke ndị bi nꞌime ya na-egburita ibe ha, agaghị adịgide. |
26 |
Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ. |
27 |
Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nꞌike ekwensu, ọ̀ bụ nꞌike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nꞌihi okwu a unu kwuru. |
28 |
Kama ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Mmụọ Nsọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nꞌetiti unu. |
29 |
Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo nile dị nꞌụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ. Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo nile dị nꞌụlọ nwoke ahụ. |
30 |
Onye na-adịghị adịnyere m na-emegide m. Otu a kwa, onye na-adịghị enyere m aka ikpokọta ekpokọta na-achụsasị achụsasị. |
31 |
“Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara. |
32 |
Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa. |
33 |
“Osisi ọma na-amị mkpụrụ ọma. Osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọjọọ. A na-amata osisi ọ bụla site na mkpụrụ ọ na-amịpụta. |
34 |
Ụmụ ajụala, olee otu ndị dị njọ dị ka unu ga-esi kwuo okwu ọma? Nꞌihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nꞌobi pụta. |
35 |
Ezi mmadụ na-ekwupụta ezi ihe dị ya nꞌime obi. Ajọ mmadụ na-esitekwa nꞌajọ okwu ya kpughee ajọ ihe dị ya nꞌobi. |
36 |
Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru. |
37 |
Nꞌihi na okwu unu kwuru ka a ga-eji kpee unu ikpe nꞌụbọchị ahụ, igosi unu dị ka ndị ikpe mara, ma ọ bụ dị ka ndị ikpe na-amaghị.” |
38 |
Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs okwu sị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ọrụ ebube ọzọ.” |
39 |
Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị ajọ mba nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịba ama ọzọ. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona onye amụma. |
40 |
Nꞌihi na dị ka Jona siri nọọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, nꞌime afọ azụ, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nꞌime ala. |
41 |
Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ndị Ninive ga-ebili kpee unu ikpe. Ha ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na mgbe Jona gwara ha okwu Chineke, ha chegharịrị, tụgharịa, bịakwute Chineke, ma ugbu a onye karịrị Jona ukwuu nọ nꞌebe a ma unu achọghị ya. |
42 |
Nꞌụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị Sheba ga-ebili boo unu ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na o si nꞌebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nꞌebe a, ma unu jụrụ ikwere na ya. |
43 |
“Mba ọjọọ nke a! Unu yiri nwoke mmụọ ọjọọ na-achị! Nꞌihi na mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime nwoke ahụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-aga nꞌọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe ọ ga-ezuru ike mgbe ọ na-achọtaghị ebe izuike, |
44 |
ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alọghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ na-alọghachikwa jekwuru nwoke ahụ. Mgbe o ruru nꞌebe nwoke ahụ nọ, ọ ga-ahụ na e meela ka obi nwoke ahụ dị ọcha, ma ọ tọgbọrọ nꞌefu, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ e tinyere nꞌime ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụọ na mbụ. |
45 |
Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ na o si otu a dịrị, ọ na-apụ gaa chọtakwa mmụọ ọjọọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha nile na-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị unu ndị bi nꞌọgbọ a jọrọ njọ.” |
46 |
Mgbe Jisọs nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzo nꞌezi na-eche ka ha gwa ya okwu. |
47 |
Otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ gwara Jisọs okwu sị ya, “Lee nne gị na ụmụnne gị na-achọ ịhụ gị nꞌezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” |
48 |
Ma Jisọs zara ya sị, “Onye bụ nne m? Òlee ndị bụ ụmụnne m?” |
49 |
Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m. |
50 |
Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme ihe Nna m bi nꞌeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 12:1 |
MATIU 12:2 |
MATIU 12:3 |
MATIU 12:4 |
MATIU 12:5 |
MATIU 12:6 |
MATIU 12:7 |
MATIU 12:8 |
MATIU 12:9 |
MATIU 12:10 |
MATIU 12:11 |
MATIU 12:12 |
MATIU 12:13 |
MATIU 12:14 |
MATIU 12:15 |
MATIU 12:16 |
MATIU 12:17 |
MATIU 12:18 |
MATIU 12:19 |
MATIU 12:20 |
MATIU 12:21 |
MATIU 12:22 |
MATIU 12:23 |
MATIU 12:24 |
MATIU 12:25 |
MATIU 12:26 |
MATIU 12:27 |
MATIU 12:28 |
MATIU 12:29 |
MATIU 12:30 |
MATIU 12:31 |
MATIU 12:32 |
MATIU 12:33 |
MATIU 12:34 |
MATIU 12:35 |
MATIU 12:36 |
MATIU 12:37 |
MATIU 12:38 |
MATIU 12:39 |
MATIU 12:40 |
MATIU 12:41 |
MATIU 12:42 |
MATIU 12:43 |
MATIU 12:44 |
MATIU 12:45 |
MATIU 12:46 |
MATIU 12:47 |
MATIU 12:48 |
MATIU 12:49 |
MATIU 12:50 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / MAT 1 |
MATIU 2 / MAT 2 |
MATIU 3 / MAT 3 |
MATIU 4 / MAT 4 |
MATIU 5 / MAT 5 |
MATIU 6 / MAT 6 |
MATIU 7 / MAT 7 |
MATIU 8 / MAT 8 |
MATIU 9 / MAT 9 |
MATIU 10 / MAT 10 |
MATIU 11 / MAT 11 |
MATIU 12 / MAT 12 |
MATIU 13 / MAT 13 |
MATIU 14 / MAT 14 |
MATIU 15 / MAT 15 |
MATIU 16 / MAT 16 |
MATIU 17 / MAT 17 |
MATIU 18 / MAT 18 |
MATIU 19 / MAT 19 |
MATIU 20 / MAT 20 |
MATIU 21 / MAT 21 |
MATIU 22 / MAT 22 |
MATIU 23 / MAT 23 |
MATIU 24 / MAT 24 |
MATIU 25 / MAT 25 |
MATIU 26 / MAT 26 |
MATIU 27 / MAT 27 |
MATIU 28 / MAT 28 |