1 |
Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. O nyekwara ha ike ịgwọ ọrịa dị iche iche. |
2 |
Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita, Anduru nwanne Saịmọn, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya. |
3 |
Filip, na Batalomi, na Tọmọs, na Matiu onye ọnaụtụ. Jemes nwa Alfiọs, na Tadịọs. |
4 |
Saịmọn onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom, na Judas Iskariọt, nwoke raara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya. |
5 |
Jisọs zipụrụ ha, maara ha ọkwa sị ha, “Unu agala nꞌebe ndị mba ọzọ, ma ọ bụ nꞌebe ndị Sameria nọ. |
6 |
Kama jekwurunụ ụmụ Izirel, ndị bụ atụrụ furu efu nke Chineke. |
7 |
Kwusaara ha na alaeze eluigwe dị nso. |
8 |
Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. O fughị unu ihe ọ bụla ịnata ike ime ihe ndị a. Otu a kwa, meenụ ka ndị ọzọ nata nꞌaka unu nꞌefu. |
9 |
“Mgbe unu na-aga, unu etinyela ego ọ bụla nꞌakpa unu, ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo. Ma ọ bụkwa ụdị ego ọzọ dị iche. |
10 |
Unu ejikwala uwe abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ abụọ, ma ọ bụ mkpa nꞌaka. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ ndị unu na-enyere aka inye unu nri, na ilekọta unu. |
11 |
Mgbe ọ bụla unu ruru obodo ọ bụla, chọọnụ onye na-asọpụrụ Chineke bi nꞌobodo ahụ. Nọdụnụ nꞌụlọ onye ahụ tutuu ruo mgbe unu ga-esi nꞌobodo ahụ pụọ. |
12 |
Mgbe unu na-arịọ ịnọdụ nꞌụlọ onye ọ bụla gosinụ na unu ji obi ọcha bịa, na unu bụ ndị udo. |
13 |
Ọ bụrụ na ndị nọ nꞌụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka ngọzi unu dịkwasị ụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, deberenụ onwe unu ngọzi unu. |
14 |
Obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke jụrụ ịnabata unu, ma ọ bụ ịnụ okwu unu, kụpụsịanụ aja nke obodo ahụ nꞌụkwụ unu mgbe unu na-ahapụ ya. |
15 |
Nꞌeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nꞌụbọchị ikpe karịa obodo ọjọọ nke Sodọm na Gomora. |
16 |
“Ana m ezipụ unu dị ka a ga-asị na ọ bụ atụrụ ka m na-ezipụ nꞌetiti agụ. Nweenụ uche dị ka agwọ. |
17 |
Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị mmadụ pụrụ ijide unu kpọrọ unu gaa nꞌụlọ ikpe, ma tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere ha. |
18 |
A ga-ekpe unu ikpe nꞌihu ndị na-achị achị na nꞌihu ndị eze nꞌihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. Ee, nke a ga-enyere unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị ụwa. |
19 |
“Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu. A ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nꞌoge ahụ. |
20 |
Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nꞌonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nꞌigwe ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu. |
21 |
“Nwanne ga-agbagide nwanne ya ama, mee ka ọ nwụọ. Ndị bụ nna ga-ararakwa ụmụ ha nye. Ụmụ ga-ebili imegide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ. |
22 |
Ụmụ mmadụ ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ma ndị nile ga-anọgide nꞌokwukwe ha ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. |
23 |
“Ọ bụrụ na ndị mmadụ esogbuo unu nꞌotu obodo gbaranụ ọsọ gaa nꞌobodo ọzọ. Unu agaghị agazucha obodo ndị a nile tupu m lọghachi. |
24 |
Nwanta akwụkwọ akarịghị onye ziri ya ihe. Ohu akarịkwaghị nna ya ukwu. |
25 |
Ihe ọ bụla dakwasịrị onye nkuzi na-adakwasị nwanta akwụkwọ ya. Otu a kwa ohu na-eketa oke nꞌihe dakwasịrị nna ya ukwu. Ebe ha kpọrọ m ekwensu, ha ga-enyekwa unu aha ọjọọ karịrị nke a. |
26 |
“Unu atụla egwu ndị na-emenye unu ụjọ. Oge na-abịa mgbe a ga-ekpughe eziokwu nile. A ga-emekwa ka izuzu obi nile zoro ezo pụta ìhè. |
27 |
“Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nꞌelu ụlọ tisasịa ya. |
28 |
“Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ. |
29 |
Ọ bụ otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ, ma otu nꞌime ha agaghị ada nꞌala ma ọ bụrụ na nna unu bi nꞌeluigwe amaghị. |
30 |
Ọ bụladị agịrị isi dị nꞌisi unu ka a maara ọnụ ọgụgụ ha. |
31 |
Ya mere, unu echegbula onwe unu. Unu dị oke ọnụ ahịa nꞌanya Chineke karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ. |
32 |
“Onye ọ bụla nabatara m nꞌihu mmadụ nile dị ka enyi ya, ka mụ onwe m ga-anabatakwa dị ka enyi m nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe. |
33 |
Ma onye ọ bụla jụrụ m nꞌihu mmadụ nile, mụ onwe m ga-ajụkwa ya nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe. |
34 |
“Unu echekwala na m bịara iweta udo nꞌụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha. |
35 |
Abịara m ime ka nwanta nwoke megide nna ya, ka nwanta nwanyị megide nne ya, ka nwụnye nwa megide nne di ya. |
36 |
Site ugbu a gaa nꞌihu, onye iro mmadụ nke kachasị njọ, ga-anọ nꞌime ezinụlọ onye ahụ. |
37 |
Ọ bụrụ na ị hụrụ nna gị na nne gị nꞌanya karịa m, ị kwesịghị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, ma ọ bụ nwa gị nwanyị nꞌanya karịa m, ị kwesịghị ịbụ onye nke m. |
38 |
Ọ bụrụ na ị jụ iburu obe gị soro m, ị bụghị onye nke m. |
39 |
“Ndụ gị ga-efunarị gị ma ọ bụrụ na ị hụ ya nꞌanya karịa m. Kama ọ bụrụ na ị tufuo ya nꞌihi m, ị ga-achọta ya. |
40 |
Ndị nile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Chineke onye zitere m ka ha na-anabata. |
41 |
Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nꞌihi na ọ bụ onye ozi Chineke, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata ndị ezi omume nꞌihi ezi omume ha, unu ga-esorokwa ha nata ụgwọ ọrụ nke ndị ezi omume. |
42 |
Chetakwanụ nke a! Onye ọ bụla kunyere otu nꞌime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nꞌihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, ga-anata ụgwọ ọrụ ya.”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 10:1 |
MATIU 10:2 |
MATIU 10:3 |
MATIU 10:4 |
MATIU 10:5 |
MATIU 10:6 |
MATIU 10:7 |
MATIU 10:8 |
MATIU 10:9 |
MATIU 10:10 |
MATIU 10:11 |
MATIU 10:12 |
MATIU 10:13 |
MATIU 10:14 |
MATIU 10:15 |
MATIU 10:16 |
MATIU 10:17 |
MATIU 10:18 |
MATIU 10:19 |
MATIU 10:20 |
MATIU 10:21 |
MATIU 10:22 |
MATIU 10:23 |
MATIU 10:24 |
MATIU 10:25 |
MATIU 10:26 |
MATIU 10:27 |
MATIU 10:28 |
MATIU 10:29 |
MATIU 10:30 |
MATIU 10:31 |
MATIU 10:32 |
MATIU 10:33 |
MATIU 10:34 |
MATIU 10:35 |
MATIU 10:36 |
MATIU 10:37 |
MATIU 10:38 |
MATIU 10:39 |
MATIU 10:40 |
MATIU 10:41 |
MATIU 10:42 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / MAT 1 |
MATIU 2 / MAT 2 |
MATIU 3 / MAT 3 |
MATIU 4 / MAT 4 |
MATIU 5 / MAT 5 |
MATIU 6 / MAT 6 |
MATIU 7 / MAT 7 |
MATIU 8 / MAT 8 |
MATIU 9 / MAT 9 |
MATIU 10 / MAT 10 |
MATIU 11 / MAT 11 |
MATIU 12 / MAT 12 |
MATIU 13 / MAT 13 |
MATIU 14 / MAT 14 |
MATIU 15 / MAT 15 |
MATIU 16 / MAT 16 |
MATIU 17 / MAT 17 |
MATIU 18 / MAT 18 |
MATIU 19 / MAT 19 |
MATIU 20 / MAT 20 |
MATIU 21 / MAT 21 |
MATIU 22 / MAT 22 |
MATIU 23 / MAT 23 |
MATIU 24 / MAT 24 |
MATIU 25 / MAT 25 |
MATIU 26 / MAT 26 |
MATIU 27 / MAT 27 |
MATIU 28 / MAT 28 |