1 |
Ndị a bụ nna nna Jisos onye nzọpụta nwa Devidi na Eberaham. |
2 |
Eberaham mụrụ Aizik, Aịzik mụrụ Jekọb, Jekọb mụrụ Juda na ụmụnna ya. |
3 |
Juda sitere na nwụnye ya Tema mụọ Perez na Zera. Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram. |
4 |
Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn. |
5 |
Salmọn mụrụ Boaz site na nwụnye ya Rehaab, Boaz mụrụ Obed site na Rut nwụnye ya. Obed amụọ Jeesi. |
6 |
Jeesi mụrụ Devidi, Devidi amụọ Solomọn site na Bịasheba, onye bụ rị nwụnye Ụraya tupu Devidi alụọ ya. |
7 |
Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abaija, Abaija mụrụ Esa. |
8 |
Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Uzaya. |
9 |
Uzaya mụrụ Jotam, Jotam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya. |
10 |
Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya. |
11 |
Mgbe e mere ka ha gaa biri nꞌala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. |
12 |
Mgbe ha lọtara Jekonaya mụrụ Shealitiel, Shealitiel amụọ Zerubabel. |
13 |
Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakim, Eliakim amụọ Azoa. |
14 |
Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akim, Akim amụọ Aliud. |
15 |
Aliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb. |
16 |
Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisos onye nzọpụta. |
17 |
Ya mere, site nꞌEberaham ruo na Devidi e nwere ụgbọ iri na anọ. Ma site nꞌoge Devidi ruo mgbe e mere ka ha gaa biri nꞌala Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nꞌoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Jisọs bụkwa ọgbọ iri na anọ. |
18 |
Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya. |
19 |
Ma nwoke a na-achọ ịlụ Meri bụ ezi mmadụ. Nꞌihi ya, mgbe ọ chọpụtara na Meri dị ime, o zubere ịhapụ ya na nzuzo, nꞌihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ihe bụ ọnọdụ Meri. |
20 |
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devidi, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye gị, nꞌihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ. |
21 |
Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nꞌihi na ọ ga-azọpụta ndị ya site na mmehie ha. |
22 |
Ọmụmụ nwa a ga-emezu ihe ahụ Chineke kwuru site nꞌọnụ onye amụma ya sị, |
23 |
‘Lee, nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. A ga-akpọ aha ya Ịmanụelụ, nke bụ ma asụgharịa ya, Chineke nọnyeere anyị.’ ” |
24 |
Mgbe Josef si nꞌụra teta, o mere dị ka mmụọ ozi ahụ nyere ya nꞌiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye ya. |
25 |
Ma ha abụọ edinakọkwaghị tutuu ruo mgbe Meri mụsịrị nwa ahụ, onye Josef kpọrọ aha ya Jisọs.
|
Standard Bible |
Public Domain |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 1:1 |
MATIU 1:2 |
MATIU 1:3 |
MATIU 1:4 |
MATIU 1:5 |
MATIU 1:6 |
MATIU 1:7 |
MATIU 1:8 |
MATIU 1:9 |
MATIU 1:10 |
MATIU 1:11 |
MATIU 1:12 |
MATIU 1:13 |
MATIU 1:14 |
MATIU 1:15 |
MATIU 1:16 |
MATIU 1:17 |
MATIU 1:18 |
MATIU 1:19 |
MATIU 1:20 |
MATIU 1:21 |
MATIU 1:22 |
MATIU 1:23 |
MATIU 1:24 |
MATIU 1:25 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / Matt 1 |
MATIU 2 / Matt 2 |
MATIU 3 / Matt 3 |
MATIU 4 / Matt 4 |
MATIU 5 / Matt 5 |
MATIU 6 / Matt 6 |
MATIU 7 / Matt 7 |
MATIU 8 / Matt 8 |
MATIU 9 / Matt 9 |
MATIU 10 / Matt 10 |
MATIU 11 / Matt 11 |
MATIU 12 / Matt 12 |
MATIU 13 / Matt 13 |
MATIU 14 / Matt 14 |
MATIU 15 / Matt 15 |
MATIU 16 / Matt 16 |
MATIU 17 / Matt 17 |
MATIU 18 / Matt 18 |
MATIU 19 / Matt 19 |
MATIU 20 / Matt 20 |
MATIU 21 / Matt 21 |
MATIU 22 / Matt 22 |
MATIU 23 / Matt 23 |
MATIU 24 / Matt 24 |
MATIU 25 / Matt 25 |
MATIU 26 / Matt 26 |
MATIU 27 / Matt 27 |
MATIU 28 / Matt 28 |