A A A A A

EZRA 9:1-15
1. Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n'etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.
2. N'ihi na ha esiwo n'umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a.
3. Ma mb͕e m'nuru okwu a, adọwaram uwem na uwe-nwudam, ropu kwa ufọdu n'agiri-isi nke isim na aji afu-ọnum, m'we nọdu, ibobo we nwuam n'aru.
4. Ewe chikọta n'ebe m'nọ onye ọ bula nke nāma jijiji n'okwu Chineke Israel, n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ; ma mu onwem nānọdu, ibobo we nwuam n'aru, rue mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.
5. Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n'iweda onwem n'ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m'we ruru ala n'ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;
6. M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.
7. Site n'ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n'ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n'ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n'aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n'agha, na nime nluta-n'agha, na n'ihere iru, dika o si di ta.
8. Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi.
9. N'ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n'ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n'iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.
10. Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n'ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n'iwu,
11. nke I nyere n'iwu site n'aka ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, si, Ala ahu nke unu onwe-unu nābata inweta ya, ala isọ-nsọ ka ọ bu n'isọ-nsọ nke ndi di iche iche nke ala ọzọ, site n'ihe-árú nile ha, nke juputaworo ya site n'otu ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ, n'ọrurú-ha.
12. Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi.
13. Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n'ihi omume ọjọ nile ayi, na n'ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n'ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,
14. àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n'iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?
15. Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n'ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n'iru Gi n'ikpe-ọmuma-ayi; n'ihi na ọ dighi onye iguzo n'iru Gi n'ihi nka.

EZRA 10:1-44
1. Ma mb͕e Ezra nēkpe ekpere, nēkwuputa kwa ekwuputa, nākwa ákwá nātuda kwa onwe-ya n'ala n'iru ulo Chineke, esiri n'Israel chikọta n'ebe ọ nọ nkpọkọta madu di ọtutu nke-uku, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri: n'ihi na ndi Israel kwara ákwá ri nne.
2. Shekania nwa Jehiel, nke sitere n'umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.
3. Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.
4. Bilie; n'ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.
5. Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.
6. Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
7. Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;
8. ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.
9. Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n'ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n'amá ulo Chineke, nāma jijiji n'ihi okwu a, na site n'oké miri-ozuzo nile.
10. Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n'ikpe-ọmuma Israel.
11. Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ.
12. Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n'ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.
13. Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n'èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n'ihi na ayi ejehiewo ri nne n'okwu a.
14. Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n'obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n'aru ayi laghachi.
15. Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.
16. Umu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n'aha-ha kwa; ha we nọdu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.
17. Ha we jubìe ajuju n'okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu.
18. Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.
19. Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha.
20. Na n'etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.
21. Na n'etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.
22. Na n'etiti umu Pashua; Elioenai, na Maaseia, na Ishmael, na Netanel, na Jozabad, na Elasa.
23. Na n'etiti ndi Livai; Jozabad, na Shimai, na Kelaia, (onye ahu bu Kelita), na Petahia, na Juda, na Elieza.
24. Na n'etiti ndi-ọbù-abù; Elaiashib: na n'etiti ndi-ọnu-uzọ-ama; Shalum, na Telem, na Uri.
25. Na n'etiti Israel: n'etiti umu Parosh; Ramia, na Izia, na Malkija, na Mijamin, na Eleeza, na Malkija, na Benaia.
26. Na n'etiti umu Ilam; Matanaia, na Zekaraia, na Jehiel, na Abdi, na Jeremot, na Elaija.
27. Na n'etiti umu Zatu; Elioenai, na Elaiashib, na Matanaia, na Jeremot, na Zabad, na Aziza.
28. Na n'etiti umu Bebai; Jehohanan, na Hananaia, na Zabai, na Atlai.
29. Na n'etiti umu Bani; Meshulam, na Maluk, na Adaia, na Jashub, na Sheal, na Jeremot.
30. Na n'etiti umu Pahat-moab; Adna, na Kelal, na Benaia, na Maaseia, na Matanaia, na Bezalel, na Binui, na Manase.
31. Na n'etiti umu Harim; Elieza, na Ishija, na Malkija, na Shemaia, na Shimeon;
32. Benjamin, na Maluk, na Shemaria;
33. Na n'etiti umu Hashum; Matenai, na Matata, na Zabad, na Elifelet, na Jeremai, na Manase, na Shimai.
34. Na n'etiti umu Bani; Maadai, na Amram, na Uel;
35. na Benaia, na Bedeia, na Keluhi;
36. na Vania, na Meremot, na Elaiashib;
37. na Matanaia, na Matenai, na Jaasu;
38. na Bani, na Binui, na Shimai;
39. na Shelemaia, na Netan, na Adaia;
40. na Maknadebai, na Shashai, na Sharai;
41. na Azarel, na Shelemaia, na Shemaria;
42. na Shalum, na Amaraia, na Josef.
43. N'etiti umu Nebo; Jeiel, na Matitaia, na Zabad, na Zebina, na Ido, na Joel, na Benaia.
44. Ndia nile alutawo ndinyom ala ọzọ na nwunye: ufọdu nime ha nwe-kwa-ra ndinyom ndi ha siri n'aka ha mu umu-ndikom.

ABÙ ỌMA 88:6-10
6. I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala, N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.
7. Ọnuma-Gi akwagidewom, I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah
8. I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya; I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú: Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.
9. Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala: Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi, Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.
10. Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu? Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah

ILU 21:23-24
23. Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
24. Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.

ỌLU OZI 24:1-27
1. Mb͕e ubọchi ise gasiri onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we ridata, ya na ndi-okenye ufọdu, na otù onye-ọ̀kà-okwu, aha-ya bu Tatọlọs; ndi ahu we kọrọ onye-isi akukọ megide Pọl.
2. Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si, Ebe ayi sitere n'aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n'ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche,
3. ayi nānara ya nke-ọma n'uzọ nile na n'ebe nile, Filiks onye di oké ebube, ayi ji ekele nile.
4. Ma, ka m'ghara ime ka ike gwu gi kari, ariọm i ka i were obi-ọma-gi nuru okwu ole-na-ole n'ọnu-ayi.
5. N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:
6. onye nwa-kwa-ra imeru ulo uku Chineke: onye ayi jide-kwa-ra:
7. Ma onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, biakwasiri ayi, we were aka ike naputa ya n'aka-ayi;
8. onye i gāpu imazu n'ọnu-ya okwu bayere ihe nile ndia, nke ayi onwe-ayi nēbo ya ebubo, mb͕e gi onwe-gi gēkpe ya ikpé.
9. Ndi-Ju we so kwa ya n'ebubo ahu nāsi na ihe ndia di otú a.
10. Mb͕e onye-isi ahu fesiri ya aka ikwu okwu, Pọl we za, si, Ebe m'mara na i bu onye-ikpé nye mba nka ọtutu arọ gara aga, ewerem obi-utọ nāgọpu onwem:
11. ebe i puru imazu na ọ karighi ubọchi iri na abua site na mb͕e m'rigoro ikpọ isi ala nye Chineke na Jerusalem:
12. ha ahughm kwa ka m'nāgwa madu ọ bula okwu ma-ọbu ikpaliri ìgwè madu nime ulo uku Chineke, ma-ọbu nime ulo-nzukọ, ma-ọbu nime obodo.
13. Ha apughi kwa igosi gi ihe ha nēbom ebubo ub͕u a.
14. Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma:
15. n'ihi na enwerem olile-anya n'ebe Chineke nọ, nke ndia onwe-ha nēche kwa, na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume na nke ndi ajọ omume kwa gaje idi.
16. Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.
17. Ma mb͕e ọtutu arọ gasiri abiarurum iluru mba nkem ọlu ebere, na iche onyinye di iche iche n'iru Chineke:
18. mb͕e m'nēme ihe ndia ha hurum n'ulo uku Chineke mb͕e m'mesiri onwem ka m'di ọcha, mu na ìgwè madu ma-ọbu itu-ùzù adigh: ma ndi-Ju ufọdu ndi si n'Esia bia
19. ndi aghaghi inọ n'ebe a n'iru gi, na ibom ebubo, ọ buru na ha nwere ihe ọ bula imegidem.
20. Ma-ọbu ka ndia onwe-ha kwue ajọ omume ọ bula ha huru, mb͕e m'guzoro n'iru nnọkọ-ikpé-ha,
21. ma-ọbughi n'ihi otù nkpu a, nke m'tiri mb͕e m'guzoro n'etiti ha, si, Ọ bu ikpé bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu ka anēkpe mu onwem n'iru unu ta.
22. Ma ebe Filiks matara ihe bayere Uzọ Jisus nke-ọma kari, ọ gwa ha ka ha chere, si, Mb͕e ọ bula onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, gāridata, m'gātule okwu-unu.
23. O we nye ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise iwu ka edebe ya, ka eme kwa ka ihe diri ya nfé; ka aghara kwa ib͕ochi onye ọ bula nime ndi nke aka ya ijere ya ozi.
24. Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Filiks biaruru, ya na Drusila, nwunye nke aka ya, onye bu nwanyi Ju, o we kpọta Pọl, we nu okwu-ya bayere okwukwe nime Kraist Jisus.
25. Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n'oge a; mb͕e m'nwere oge m'gākpọ kwa gi.
26. O nēle kwa anya na Pọl gēnye ya ego: n'ihi ya ọ nākpọta kwa ya ọtutu mb͕e, ya na ya nākparita kwa uka.
27. Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n'ab͕u.