Instagram
English
A A A A A
LUK 14:25-35
25. Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o sitere nꞌụlọ ahụ pụọ. Oke igwe mmadụ sokwaara ya, nꞌoge a. Jisọs tụgharịrị lee ha anya sị ha,
26. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ibu onye na-eso ụzọ m, onye ahụ ga-ahụ m nꞌanya karịa nna ya na nne ya na nwụnye ya na ụmụ ya, na ụmụnne ya nwanyị. Ọ ga-ahụkwa m nꞌanya karịa ndụ nke aka ya.
27. Onye ọ bụla kwa nke na-eburughị obe ya soro m enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m.
28. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ iwu ụlọ, ọ̀ gaghị eburu ụzọ nọdụ ala gukọọ ihe ọ ga-efu ya iwu ụlọ ahụ? Ọ̀ gaghị agụkọkwa ego o nwere nꞌaka ya mata ma ọ ga-ezuru ya iwu ụlọ ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị ezuru ya?
29. Nꞌihi na ọ bụrụ na o cheghị echiche banyere nke a, o nwere ike wuruo nanị na ntọ ala ụlọ ahụ kwụsị, chọpụta na o jizughị ego ga-ezuru ya. Mgbe ahụ ọ bụrụ na ndị mmadụ esi ebe ahụ gafee hụ na o nweghị ike iwucha ụlọ ya, ha ga-ebido ịchị ya ọchị, na-asị,
30. “ ‘Leenụ kemgbe nwoke a bidoro iwu ụlọ a, ma o nwebeghị ime wuchaa ya.’
31. “Ọ bụrụ na otu eze achọọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị eburu ụzọ chọpụta ma o nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye eze nke ọzọ ji iri puku ndị agha abụọ abịa ọgụ?
32. Ọ bụrụ na eze ahụ achọpụta na o nweghị ike iji puku ndị agha iri merie onye ji iri puku ndị agha abụọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị eziga ozi nye eze ahụ rịọ ka e kpee udo mgbe eze ahụ ka nọ ebe dị anya?
33. “Nꞌụzọ dị otu a, onye ọ bụla na-ewezugaghị ihe nile ọ na-eme, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
34. “Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnu etufuo ụtọ ya, ọ̀ dịkwa ụzọ ọzọ e si eme ya ka ọ tọọkwa ụtọ dị ka nnu ọzọ?
35. Ọ dịkwaghị uru ọzọ ọ bara. Ihe a ga-eme bụ itufu ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka okwu m kwuru baara gị uru, jiri ya mee ihe ga-abara gị uru.”