MAK 8:1-21 |
1. Nꞌoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ sịrị, |
2. “Enwere m ọmiko nꞌebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a ọ dịkwaghị ihe fọdụrụ ha ga-eri. |
3. Ọ bụrụ na m sị ha laa, ụfọdụ nꞌime ha ga-ada nꞌụzọ nꞌihi agụụ. Nꞌihi na ụfọdụ ha si nꞌebe dị anya bịa.” |
4. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ọ̀ pụrụ ime bụ ịchọta nri ga-ezuru ha nꞌọzara a?” |
5. Jisọs zara sị ha, “Ogbe beredi ole ka unu nwere?” Ha zara sị ya, “Asaa.” |
6. Jisọs nyere iwu ka igwe mmadụ ahụ nọdụ ala. O weere ogbe beredi ahụ kpee ekpere nye Chineke ekele. Ọ nyawara beredi ahụ ntakịrị ntakịrị, nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ nile. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara ya. |
7. Ha nwekwara azụ ntakịrị. Jisọs weere ya kpee ekpere, nyekwa Chineke ekele. Emesịa ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ya. |
8. Igwe mmadụ ahụ riri ihe tutuu ha erijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara ibiribe beredi dafuru nꞌebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa. |
9. Ndị riri nri a dị puku mmadụ anọ. Emesịa, Jisọs zipụrụ ha ka ha laa. |
10. Emesịakwa, Jisọs banyere nꞌụgbọ mmiri ya na ndị na-eso ụzọ ya, gaa nꞌakụkụ obodo Dalmanuta. |
11. Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.” |
12. Mgbe Jisọs nụrụ ihe ha chọrọ ka o mee, ọ sụrụ ude nke ukwuu nꞌime onwe ya sị ha, “Gịnị mere ndị ọgbọ a ji na-arịọ m ka m gosi ha ihe ịrịba ama tupu ha ekwere na m? Ka m gwa unu eziokwu, ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-egosi unu.” |
13. Ọ hapụrụ ha nꞌebe ahụ banyekwa nꞌụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ. |
14. Mgbe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-aga, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha chefuru iwere beredi. Ọ bụ nanị otu ogbe beredi fọdụụrụ ha. |
15. Mgbe ha nọ na-eche ihe banyere ya, Jisọs sịrị ha, “Ka m dọọ unu aka na ntị, kpacharanụ anya. Unu ekwela ka e jiri ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke ndị otu Herọd duhie unu.” |
16. Ndị na-eso ụzọ ya leritara onwe ha anya jụrịtaa onwe ha, “Gịnị ka ọ na-ekwu? Ọ̀ na-ekwu okwu a nꞌihi na anyị ewetaghị nri ga-ezuru anyị?” |
17. Mgbe Jisọs ghọtara na okwu ha na nke ya adakọtaghị, ọ gwara ha okwu sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu banyere ejighị beredi? Ọ̀ pụtara na unu adịghị aghọta? Ọ̀ pụtara na obi unu siri ike ịnabata okwu m? |
18. Ùnu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Ùnu nwere ntị nke na-ajụ ịnụ ihe? Ọ̀ ga-abụ na unu echefuola ngwangwa otu a? |
19. “Mgbe m ji beredi ise zụọ puku mmadụ ise ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.” |
20. Jisọs jụkwara ajụjụ ọzọ sị ha, “Mgbe m ji ogbe beredi asaa zụọ puku mmadụ anọ, ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.” |
21. Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụrụ na o si otu a dị, ùnu na-eche na nsogbu m bụ nꞌihi na unu chefuru iweta nri?” |