MATIU 14:22-35 |
22. Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbụ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. |
23. Mgbe ndị a lara, Jisọs rigooro nꞌugwu ikpe ekpere, nanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, Jisọs nọkwa nꞌugwu ahụ na-ekpe ekpere, nanị ya. |
24. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ruru nꞌetiti osimiri, ebili mmiri dị egwu malitere ịmali elu, na-ebugharị ụgbọ mmiri ahụ, nꞌihi na ifufe na-efesi ike. |
25. Ma ihe dị ka site nꞌelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, ma ọ bụkwa nꞌelu osimiri ahụ ka ọ na-aga ije. |
26. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-abịa, oke egwu jidere ha. Ha tiri mkpu sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha chere na Jisọs bụ mmụọ. |
27. Ma Jisọs sịrị ha, “Unu atụla egwu! Ọ bụ m.” |
28. Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Jisọs nꞌezie, Pita pụtaziri gwa Jisọs okwu sị ya, “Onyenwe anyị, ebe ọ bụ gị nꞌezie, biko, nyenụ iwu nke ga-eme ka m bịakwute gị.” |
29. Onyenwe anyị sịrị Pita, “Bịaa!” Pita sitere nꞌụgbọ pụta bido ịga ije nꞌelu mmiri ijekwuru Jisọs. |
30. Ma mgbe Pita hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị, ụjọ tụrụ ya. O bidokwara imikpu nꞌime mmiri ahụ. Nꞌihi nke a o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!” |
31. Na-atụfụghị oge, Jisọs setipụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ gwara Pita okwu sị ya, “Lee ka okwukwe gị siri dị nta! Gịnị mere i ji nwee obi abụọ?” |
32. Ha abụọ banyere nꞌụgbọ mmiri ahụ. Ma mgbe ha banyere nꞌụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. |
33. Ndị ahụ ya na ha so nọdụ nꞌụgbọ ahụ kpọrọ isi ala nye ya sị, “Nꞌezie, ị bụ Ọkpara Chineke!” |
34. Ha gafere osimiri ahụ jeruo Genesaret. |
35. Ngwangwa akụkọ ọbịbịa ha gbasara ebe nile nꞌobodo ahụ. Ndị mmadụ bidoro ịgbagharị na-agwa ibe ha ka ha dute ndị ọrịa ha ka Jisọs gwọọ ha Ọtụtụ mmadụ kpọtara ndị ahụ na-esighị ike. |